Lee ụmụ Naịjirịa na-aga 'World Cup' n'afọ a

Asọmpi iko mba ụwa nke afọ 2022 ga-amalite n'ụbọchị 20 nke ọnwa Nọvemba afọ 2022 na mba Qatar.

Otu bọọlụ Naịjirịa bụ 'Super Eagles' etozughị iso n'asọmpi a mana ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa ga-eso gbaara mba ha dị icheiche.

Lee ụfọdụ n'ime ha:

Bukayo (Ayoyinka) Saka

Bukayo Saka, dị afọ 21, na-agbara otu bọọlụ Arsenal nke mba Briten.

Nne na nna ya bụ Adenike na Yomi Saka bụ ndị Naịjirịa, mana ha mụrụ Bukayo n'obodo Ealing, na mpaghara 'Greater London'.

Saka nwetara nturuugo dịka nwa afọ mba England kacha gbaa bọọlụ nke ọma n'afọ 2021.

A na-atụ anya na Saka ga-achake ka kpakpando n'asọmpi Iko Mba ụwa nke a.

Saka agaghị abụ nwa afọ Naịjirịa mbụ na-agbara mba England bọọlụ, ndị ọzọ gụnyere Fikayo Tomori (AC Milan), Tammy Abaraham (AS Roma), wdg.

Noah (Arinzechukwu) Okafor

Noah Okafor na-agbara mba Switzerland nakwa otu egwu bọọlụ Red Bull Salzburg nke mba Austria.

Ọ dị afọ 22. Ọ gbakwaarala oggogo U15, U17, na U19 nke mba Switzerland.

Nna ya bụ onye Igbo ebe nne ya bụ onye Switzerland.

Okafor agbaarala mba Switzerland bọọlụ ugboro asatọ ma nye otu goolu.

Manuel (Obafemi) Akanji

Akanji na-agbara mba Switzerland, bụ ebe a mụrụ ya n'afọ 1995.

Nwa okorobịa a dị afọ 27 ugbua na-agbara otu bọọlụ Manchester City nke mba England.

Nna ya bụ onye Naịjirịa ebe nne ya bụ onye mba Switzerland.

Ọ gbaara mba Switzerland bọọlụ ugboro 42 ma nye otu goolu dịka ọ bụ onye na-agba azụ.

Otu ihe ọzọ pụrụ iche na ndụ Akanji bụ na isi ya na-aghọ nkọ na mgbakọ na mwepụ, maọbụ 'arithmetic' na bekee.

Ike (Dominique) Ugbo

Nne na nna Ike Ugbo bụ ndị Naịjirịa, a mụrụ ya na mba England, mana ọ na-gabara mba Canada bọọlụ, bụ ebe ọ nọrọ too.

Ike Ugbo gbaara mba England n'ogoogo nke U17 na U20, tupu ọ họrọ mba Canada.

Ọ gbaarala otu bọọlụ Chelsea (England); Genk (Belgium); na Troyes (France) bụ ebe ọ nọ ugbua.

N'ọnwa Septemba afọ 2021, Ike Ugbo kwuru na ya ahọrọla ịgbara Naịjirịa bọọlụ, mana ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya mgbe ọ tụgharịrị ma kwuo na ọ bụ Canada ka ọ ga-agbara bọọlụ.

Karim-David Adeyemi

Nna Karim Adeyemi bụ onye Naịjiria, nne ya bụ onye mba Romania, mana a mụrụ ya n'obodo Munich nke mba Germany.

Adeyemi na-agbara mba Germany bọọlụ, n'agbanyeghị na o nwere ikiki ịgbara Naịjirịa maọbụ Romania ma ọ bụrụ na ọ chọrọ.

Ka ọ dị ugbua, Adeyemi na-agbara otu Red Bull Salzburg dị na mba Austria.

Ọ dị afọ 20.

Sam (Ayomide) Adekugbe

Ọ bụ ezie na nne na nna Samuel Adekugbe mụrụ ya na mba England, ọ bụ mba Canada ka ọ họọrọ ịgbara bọọlụ.

Adekugbe na-agbara otu bọọlụ Hatayspor nke mba Turkey; ọ na-agba azụ.

Ọ gbaarala mba Canada n'ogoogo U-18 na U-20.