You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
World Cup Draw: Lee mba ndị ga-ezute onwe ha n’asọmpị iko mbaụwa 2022
Otu nchịkọta egwu bọọlụ na mba ụwa bụ Fifa n'ịchafụ ewepụta mba ndị ga-ezute onwe ha n'asọmpị iko mbaụwa nke 2022 a ga-agba na mba Qatar.
Mba Briten ga-ezute mba Amerịka ebe mba Mexico ga ezute mba Argentina dịka akwụkwọ ozi Fifa siri depụta.
France bụ mba nwetere mmeri n'asọmpị a n'afọ 2018 ga-ezute Denmark ebe Portugal bụ mba Cristiano Ronaldo ga-ezute Uruguay.
Mba Qatar bụ mba a ga-anọ gbaa asọmpị a ga-ezute mba Netherland na oke nke 'Group A' ebe mba Brazil ga-ezute Switzerland, mba Belgium ga-ezute Croatia ebe Spain na Germany ga-achịpụ ya. Group a nke Spain na Germany nọ bụ nke mmapụ obi dịka ọtụtụ mba ndị nọ na ya bụ mba nd ọkaibe n'egwu bọọlụ.
Lee mba ndị ozọ ga-ezute onwe ha ebe a:
- Group A: Qatar, Ecuador, Senegal, Netherlands
- Group B: England, Iran, USA, Wales/Scotland/Ukraine
- Group C: Argentina, Saudi Arabia, Mexico, Poland
- Group D: France, UAE/Australia/Peru, Denmark, Tunisia
- Group E: Spain, Costa Rica/New Zealand, Germany, Japan
- Group F: Belgium, Canada, Morocco, Croatia
- Group G: Brazil, Serbia, Switzerland, Cameroon
- Group H: Portugal, Ghana, Uruguay, South Korea
Kedụ mgbe a ga-agba asọmpị Iko mbaụwa 2022?
Asọmpi a ga-amalite n'ụbọchị Mọnde, bụ ụbọchị 21 n'ọnwa Nọvemba dịka egwuregwu mmepe asọmpị ga-abụ nke mba Qatar na mba Ecuador n'ama egwuregwu Al Bayt dị na Qatar.
A ga-agba nzugbu nzugbu asọmpị ruo ụbọchị Fraịde bụ ụbọchị abụọ n'ọnwa Disemba tupu egwuregwu mgbapụ nke mbụ amalite n'ụbọchị atọ nke ọnwa Disemba 2022.
A ga-agba asọmpị ikpeazụ nke iko mbaụwa nke afọ 2022 n'ama egwuregwu Lusail n'ụbọchị 18 nke ọnwa Disemba 18.
Kedụ maka usoro nchekwa n'aka ọria Covid-19?
Otu ahụike mba ụwa bụ WHO n'ịchafụ, ọtụ egwuegwu Fifa na mba Qatar enwela nkweọrịta n'ihibe usoro nchekwa ahụike ndị mmadụ n'asọmpị iko mbaụịwa nke 2022 a ga-eme na Qatar
Ha atọ kwuru na emume a ga-eso usoro nchekwa maka ọrịa covid nye ndị niile ga-abịa ya bụ asọmpị Qatar 2022.