AFCON 2021 Tournament: Etu Naịjirịa si kwụrụ n'AFCON a kamgbe ọ malitere

Ihe mba Afrịka ọbụla kpụụ n'ọnụ ugbua bụ asọmpi Iko Mba Afrịka nke ga-ebiri ọkụ n'ụbọchị itoolu nke Jenụwarị, 2022.

Nke afọ a bụ nke ugboro iri atọ na atọ, ga-akpọtụ na mba Kameroon bụ ndị ga-ele mba iri abụọ na atọ ndị ọzọ ọbịa.

E kwesiburu ịgba ya n'ọnwa Juun afọ 2021 mana a kagburu ya n'ihi nsogbu ọrịa coronavirus metụtara egwu bọọlụ n'ụwa.

Dịka ị na-anụ mkpọtụ maka asọmpi a e ji AFCON maara, ọ ga-adịkwa mma ka ị mata ihe ọbụ n'uju nakwa etu Naịjirịa si kwụrụ.

Gịnị bụ AFCON?

AFCON pụtara African Cup of Nations bụ Iko Mba Afrịka nke egwuregwu bọọlụ ụmụnwoke.

Ndị na-ahazi ya bụ otu jikọtara egwuregwu bọọlụ n'Afrịka bụ Confederation of African Football (CAF) na Bekee.

AFCON bụ otu ụzọ gbara ọkpụrụkpụ e ji ewulite ịdị n'otu mba Afrịka niile, nke a bụ uru ọ baara.

A na-agbakaarị ya n'ọnwa Juun/Julaị n'ime afọ abụọ ọbụla. Ọ na-efu otu ọnwa iji gbaa ya.

Lee tebụlụ AFCON 2021

Kedụ mgbe AFCON malitere?

A tụmatụ ịmalite AFCON pụtara ihe n'afọ 1956, mgbe mba anọ dịka Ijipt, Sudan, Etiopịa na Saụt Afrịka hiwere CAF n'ọgbakọ FIFA e mere na Lisbon, Pọrtugalụ.

Mana asọmpị AFCON malitere kpọmkwen n'ọnwa Febụwarị afọ 1957 na Khartoun bụ isiobodo Sudan.

Naanị mba Ijipt, Etiopịa na Sudan sọnyere n'asọmpi ahụ. A gụpụrụ Saụt Afrịka maka iwu gọọmentị na-achị mgbe ahụ tinyere na ọ bụ naanị ndị ọgba bọọlụ isiọcha ga-aga asọmpi ahụ.

Kedụ mba ole na-agba AFCON?

Mgbe asọmpi AFCON malitere n'afọ 1957, naanị mba anọ na-eso agba ya, n'afọ 1961 ha ruru mba itoolu sonyere mana a gbara asọmpi itozuoke nke mbụ ya.

Ọ bụ n'afọ 1963 ka mba ndị dịka Naịjirịa na Tunisia malitere ịgba asọmpi ahụ.

N'afọ 1998 mba ndị na-agba asọmpi AFCON gbagoro iri na ise mana n'afọ 2017 mba iri abụọ na anọ malitere ịgba ya.

Kedụ ihe a na-erite n'asọmpi AFCON.

Mba ọbụla gbara ndị mbụ n'asọmpi Iko Mba Afrịka (AFCON) ga-amaburu iko e ji ọlaedo mee nke a rụrụ na mba Ịtali.

Otu CAF ga-enye mba ahụ ego dị nde dọla ise ($5,000,000) ma nye ndị ọgba bọọlụ ha mgbanolu ọlaedo (Gold medal) dị iri atọ.

Ndị gbara ndị nke abụọ ga-enwete nde dọla abụọ na puku narị asaa na puku iri ise ($2,750,000) na mgbanolu ọlaọcha (Silver medal) dị iri atọ.

N'otu aka ahụ, ndị atọ ga-erite nde dọla abụọ na puku narị abụọ ($2,200,000) na ọlanchara (Bronze medal) iri atọ.

Ebe ndị nke anọ na-erite otu nde dọla na otu puku narị na puku iri asaa na ise ($1,175,000) nakwa ihe itiaka n'obi a kpọrọ 'Diplomas'.

Ebe Naịjirịa kwụ n'AFCON kamgbe ọ malitere

Ndị Super Eagles nke Naịjirịa malitere ịgba asọmpi Iko Mba Afrịka (AFCON) n'afọ 1963 bụ ebe e nyere ha ọkpụ goolu iri ma gbapụ ha n'ogogo mbụ.

Asọmpi AFCON nke afọ a ga-eme ya ugboro iri na itoolu ha ga-agba.

Kamgbe ahụ ha ebutela iko a ugboro atọ; n'afọ 1980, 1994 na 2013, gbaa ndị abụọ ugboro atọ.

Ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịma maka AFCON

Mba Ijipt kachasị buo Iko Mba Afrịka, ha ebuola ya ugboro asaa.

Lekwa ndị niile meriri African Cup of Nations (Afcon) kamgbe ọ malitere n'afọ 1957: