Nigeria vs Tunisia live: Ugo Tunisia atụkpọọla nke Nigeria otu anya

Naịjiria na Tunisia

Ebe foto si, Caf

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Ndị 'Super Eagles' nke Naijirịa nọ n'ụzọ ụla ugbua dịka 'Carthage Eagles' nke mba Tunisia ji otu goolu merie ha n'agba nke 16 nke Africa Cup of Nations (Afcon).

Na nkeji 47 e ji malite ọkara nke abụọ, Youssef Msakni nke Tunisia ji goolu dọkaa neetị, nke tinyere ndị Naịjiria na gbagharịa.

N'egwuregwu ha malitere ebe elekere asatọ nke abalị Sọnde a bụ Jenụwarị 23, 2022, otu abụọ a nwara ike ha mana goolu jụrụ ịba n'ọkara nke mbụ.

N'agbanyeghi na Naịjiria nwetara 'corner kick' anọ n'ọkara nke mbụ, enweghi nke rutere nso ịbanye na poostu.

Ka ọ kwụ ugbua, ndị Naịjiria kwụ n'akụkụ, chịrị obi n'aka iche ihe ekwe ga-akụtara ha mgbe a ga-egbuchi bọọlụ.

Super Eagles nọ n'elu tebulu Otu D ka ha merichara Egypt otu goolu asataghị ihe ọbụla, merie Sudan nakwa Guinea Bissau.

Ha bụ otu egwu bọọlụ natara pọịntị itoolu n'agba ndị otu n'Afcon nke afọ a.

Otu egwu bọọlụ Tunisia gbara atọ n'otu F ma ruo ogo 16 dịka ndị na-achịtagh iihe ọbụla n'otu ahụ. Naanị otu egwu ka ha meririla n'Afcon 2021 tupu ha agbapụ Naijirịa..

Ndị egwu bọọlụ Naịjirịa na Tunisia

Ebe foto si, Geety images

Naịjirịa maọbụ Tunisia merie egwu a, Gịnị ga-eme?

Dịka o siri dị ugbu a, Tunisia abanyela n'agba anọ nke ikpeazụ (quarter-final) ebe onye achịtaghị aja ga-akwara ngwongwo ya lawa.

Ugboro ole Naịjirịa na Tunisia zuterela n'asọmpi bọọlụ

Ndị otu Egwu 'Super Eagles nke Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị otu Egwu 'Super Eagles nke Naịjirịa

Nke a ga-abụ ugboro iri abụọ n'otu Naịjirịa na Tunisia na-ezute onwe ha n'asọmpi bọọlụ.

N'ime asọmpi iri abụọ ha gbarala, Naịjirịa emeriela Tunisia ugboro ise, ebe Tunisia merikwara ugboro ise.

Ugboro iri ka ha gbarala onwe ha onye lawa onye lawa.

Tunisia

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tunisia ji ọnyụpa malite asọmpi Afcon nke afọ a

Asọmpi nke afọ a ga-abụkwa nke ugboro asatọ Naịjirịa na Tunisia na-ezute onwe ha n'asọmpi Afcon.

N'ime asọmpi ndị a, Naịjirịa meriri ugboro anọ, Tunisia merie naanị otu ugboro, ebe ha gbara nhatanha ugboro abụọ.

Oge ikpeazụ Naịjirịa na Tunisia zutere bụ n'asọmpi bọọlụ enyi na enyi ha bgara n'afọ 2020 ebe ha nyere onwe ha otu goolu otu goolu

Etu agba nke mbụ nke asọmpi Afcon 2021 siri gaa

Naịjirịa merichara asọmpi atọ ha n'agba nke mbụ n'iko Afcon afọ a

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Naịjirịa merichara asọmpi atọ ha n'agba nke mbụ n'iko Afcon afọ a

Ndị otu Super Eagles nke Naịjirịa gbara nnọọ nke ọma n'agba nke mbụ nke asọmpi Afcon 2021.

Ha meriri asọmpi atọ niile ha gbara n'agba nke mbụ nke asọmpi a.

Naịjirịa meriri Ijipt 1-0, merie Sudan 3-1, bịakwa merie Guinea-Bisau 3-0.

Etu Tunisia

Ebe foto si, Screen Grab

Nkọwa foto, Tunisia meriri naanị otu asọmpi n'ime aọ̀ọmpi atọ ha gbara n'agba nke mbụ nke Afcon afọ a

N'aka nke ọzọ, ndị Tunisia meriri naanị otu asọmpi n'ime asọmpi atọ ha gbara n'agba nke mbụ nke Afcon afọ a

Mali meriri ha 1-0, ha emerie Mauritania 4-0, mana Gambia merikwara ha 1-0.

Nke a pụtara na ọ bụ ọnyụpa ka Tunisia ji malite asọmpi Afcon nke afọ a.

Mana ndị ma ihe ekwe na-akụ n'egwuregwu na-ekwu na-asọmpi Naịjirịa na Tunisia na-atakarị akpụ oge niile.

Moses Simon, Kelechi Iheanacho na ụmụ Naịjirịa ndị riterela 'Man of the match' n'Afcon 2021

N'ime asọmpi atọ Naịjirịa gbara n'agba nke mbụ Afcon 2021, ha dị mmadụ atọ chakere ka kpakpando nke ewu na ọkụkọ hụrụ ma kweta.

Mmadụ atọ a ritere nturugo Bekee kpọrọ "Man of the match", n'ihi etu ha si gbaa bọọlụ ọfụma ma nye goolu.

Kelechi Iheanacho

Kelechi Iheanachi

Ebe foto si, Twitter/CAF_Online

Iheanacho bụ onye mbụ ritere nzere 'man of the match' n'asọmpi Naịjirịa na Egypt.

Ọ bụ ya nyere goolu Naịjirịa ji nweta mmeri na asọmpi ahụ.

Nwa amadi a dị afọ iri abụọ na ise, ma bụrụkwa onye otu bọọlụ Leicester City nke mba England.

Iheanacho esoghi gbaa asọmpi Afcon nke afọ 2019, n'ihi na onye nchịkọta nọ oge ahụ bụ Gernot Rohr, echeghị na ụkwụ ruru ya ịgba.

Mana ọ chakere ka kpakpando n'afọ a nke mere onye nkuzi nọ ugbua bụ Augustine Eguaveon ji kpọọ ya.

N'afọ 2013, oge ọ dị afọ iri na asaa, Iheanacho duuru ndị otu bọọlụ Naịjirịa U-17 buo iko mba ụwa nke a gbara na mba United Arab Emnirates.

Ọ bụ Iheanacho kacha nye goolu ma bụrụkwa onye kacha gbaa bọọlụ nke n'asọmpi ahụ.

Moses Simon

Moses Simon

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Moses Simon ritere nzere dịka onye kacha gbaa bọọlụ n'asọmpi Naịjirịa na Sudan.

Nwa amadi a dị afọ iri abụọ na ise na-agbara otu bọọlụ FC Nantes na mba Fransị.

Ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ ya ka ụkwụ kacha aghọ nkọ n'ime ndị 'Super Eagles' kamgbe asọmpi Afcon a malitere.

Moses Simon enyela otu goolu, ma nyekwara mmadụ abụọ ọzọ aka inye goolu.

Ndị o nyeere aka ka ha nye goolu bụ Samuel Chukwueze na William Troost Ekong.

Ọtụtụ ndị nkwado Naịjirịa na-ekwu na Moses Simon na-agba bọọlụ dịka Lionel Messi nke mba Argentina.

William Troost-Ekong

William Troost Ekong

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ekong nyere goolu nke abụọ na mmeri Naịjirịa meriri Guinea Bisau.

Ọ bụ eziokwu na nwa amadi a na-agba azụ maọbụ 'defence' na bekee, o gosila na ọ ma ka e si enye goolu.

Ekong nyere goolu nke abụọ na mmeri Naịjirịa meriri Guinea Bisau.

O ritekwara nturuugo 'man of the match' n'asọmpi ahụ.

William Troost-Ekong so na ndị mere na enyebeghị Naịjirịa ọtụtụ goolu n'asọmpi Afcon afọ a.

Ndị ọzọ atụkwasara obi na ha ga-emenye ndị Tunisia

Ndí 'Super Eagles'

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụ eziokwu na mba ndị si Nọt Afrịka eyiela Naịjirịa egwu ọtụtụ ugboro n'asọmpi Afcon.

Mana ọtụtụ kwenyere na Naịjirịa ga-ememina Tunisia n'ọgbọ a.

Lee ndị enwere olileanya na ha ga-eyi ndị Tunisia egwu ma oge ruo:

Samuel Chimerenka Chukwueze

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Chukwueze so ndị otu bọọlụ Naịjirịa U-17 buo iko mba ụwa n'afọ 2015, na mba Chile.

Ugbua, nwa okorobia a dị afọ 22 na-agbara ndị otu Villareal nke mba Spen.

O so na ndị ụkwụ na-aghọ nkọ ugbua n'otu egwu 'Super Eagles'.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Taiwo Awoniyi

Taiwo Awoniyi na Joe Aribo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Taiwo Awoniyi na Joe Aribo

Awoniyi ọ dị afọ iri abụọ na anọ, bụrụkwa onye otu egwu Union Berlin nke mba Jamịnị.

Nwa amadi a so na ndị otu U-17 butere iko mba ụwa n'afọ 2013.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Awoniyi nyere otu n'ime goolu atọ Naịjirịa ji merie Sudan n'asọmpi Afcon a.

Ndị mmadụ na-ekwu na asọmpi Afcon 2021 bụ ohere Awoniyi nwere iji gosi ihe o nwere ike imenwu na 'Super Eagles'.

Joe Aribo

N'asọmpi atọ Naịjirịa gbarala na Afcon afọ a, Aribo egosila na ọ bụ odogwu n'egwu etiti.

Aribo nọ otu egwu Rangers na mba Scotland, ebe o so ha buo iko bọọlụ mba ahụ n'afọ 2020.

Ọ bụ onye ọtụtụ mmadụ kwenyere na ọ ma ihe ekwe na-akụ n'egwu bọọlụ.