José Peseiro Profile: Ihe ị kwesịrị ịma maka onye nkuzi ọhụrụ Super Eagles

José Peseiro

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, José Peseiro ga-eso otu Naịjiria aga asọmpi Afcon 2021, mana ọ ga-aga dịka onye nlere anya, dịka Augustine Eguavoen ga-eduga Super Eagles ya bụ asọmpi

N'abalị 29 nke ọnwa Disemba 2021, ka ụlọọrụ Nigeria Football Federation (NFF) kpọpụtara José Peseiro dịka onye nkuzi ọhụrụ otu Super Eagles nke Naịjiria.

NFF bụ otu na-ahụ maka nlekọta na nhazị egwu bọọlụ na Naịjirịa.

Ozi a ha zipụtara na-abịa ka ọ fọrọ naanị otu izu na ụma tupu asọmpi Iko mba Afrịka (Afcon) amalite na mba Kamerun.

Okwu onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua a bụ "Onye bụ José Peseiro a bụ onye na-anọchi Gernot Rohr kuziri Super Eagles afọ ise (2016 - 2021)?"

Lee ihe ị kwesịrị ịma maka José Peseiro:

  • A mụrụ José Peseiro n'ụbọchị anọ nke ọnwa Epreelu, afọ 1960; ọ dị afọ 61
  • Ọ gbaburu bọọlụ tupu ọ banye na nchịkọta na nkuzi egwuregwu bọọlụ
  • Ọ rụburu dịka onye enyemaka/osote Jose Mourinho bụ onye nkuzi bọọlụ a ma ama maka ikuziri Chelsea, Manchester United, Porto, Real Madrid wdgz
  • Ọ rụkwara dịka onye enyemaka Carloz Queiroz oge ọ bụ onye nkuzi bọọlụ otu Real Madrid
  • Ọ rụọla dịka onye nkuzi otu C.D Nacional (ndị o nyerela aka kpọgote na Primeira Liga), Sporting CP (bụ ndị ọ kpọruru agba ngwụcha asọmpi Iko Uefa nke afọ 2005) nakwa Porto, dịcha na mba Pọtụgal, Panathinaikos FC dị na mba Gris, Al-Ahly SC dị na mba Ijipt na Al-Wahda dị n'Abu Dhabi
  • Ọ chịkọburu otu egwuregwu mba Saụdi Arebia site n'afọ 2009 ruo 2011, nakwa mba Venezuela site n'ọnwa Febrụwarị afọ 2020 ruo Ọgọstụ 2021.
  • O bulibeghi iko ọbụla kemgbe ọ rụwara ọrụ dịka onye nkuzi

Mara na NFF kwuru n'ezie na ha kpọkuru Mourinho nakwa Arsene Wenger chịkọburu Arsenal, ka o nye ha ntuziaka tupu ha e mechaa wee Peseiro n'ọrụ.

Peseiro na-anọchi Rohr kpọruru Naịjiria asọmpi Iko mbaụwa 2018 nakwa agba ngwụcha nke atọ n'asọmpi Iko mba Afrịka nke afọ 2019.

Gịnị mere NFF ji wepụ Gernot Rohr dịka onye nkuzi Super Eagles?

Otu na-ahazị egwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF n'ịchafụ ekwughi kpọm kwem ihe mere ha ji kpebie ịwepụ Gernot Rohr dịka onye nkuzi otu bọọlụ Super Eagles.

Ozi ha zipụtara dere:

"Anyị jị teknuzu mee ọgbakọ n'Sọnde, mkpebi anyị bụ iwepụ Gernot Rohr ma tinye Augustine Eguavoen ka ọ nọchite ya nwa mgbe nta..."

Dịka etinyere Augustine Eguavoen ka ọ nọchite anya Rohr ma kpọrọ otu Super Eagles gaa asọmpị Afcon 2021, lee ihe ndị mmadụ na-eche mere e ji wepụ Gernot Rohr.

Gernot Rohr nọ n'oche ọkwa onye nkuzi Super Eagles ruo afọ ise

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gernot Rohr nọ n'oche ọkwa onye nkuzi Super Eagles ruo afọ ise

Ihere ndị mmadụ na-eche maka mwepụ Rohr

Ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na ihe mere e ji wepụ Rohr bụ maka etu ọtụtụ ndị nkwado egwu bọọlụ Naịjirịa si tie mkpu nye NFF ka ewepụ nwaamadị a n'oge gara aga. ,

Ọkachasị mgbe emenyere otu bọọlụ Super Eagles ihere oge ha nọ na-akwado maka iko mbaụwa nke 2022.

Ka ndị mmadụ si depụta na soshal midia ha nakwa ebe ndị ọzọ, ihe kacha wee ha iwe bụ na ọ bụ mba Central African Republic menyere ha ihere na Naịjirịa dịka agbara ya bụ asọmpị n'ama egwuregwu, Teslim Balogun Stadium dị na Legọs.

Ndị nwere agba na Naịjirịa so tie mkpu ka ewepụ Rohr gụnyere aka chịbụrụ Abia steeti bụ Orji Uzor Kalu, ozi ya kwuru:

"Kamgbe afọ ise Gernot Rohr nọ n'oche dịka onye nkuzi Super Eagles, otu bọọlụ a achitabeghi aja ọbụla... Kedụ ihe mere awepụbeghi ya n'ọkwa oche a?"

Dịka Naịjirịa zutere mba Cape Verde n'asọmpị ọzọ, ha gbanyere onwe ha otu goolu, otu goolu, nke mere mkpu ndị mmadụ ji mụbawanye dịka mba Cape Verde ekwesighi ịtụnyere Super Eagles ka ndị mmadụ si kwuo.

Ndị ọzọ tiri mkpu akwa ka ewepụ nwoke a bụkwa ndị bụbu ndị isi otu "Sports Writers Association of Nigeria (SWAN)" nke bụ otu ndị na-ede akwụkwọ nakwa na-agbasa ozi banyere egwuregwu.

Ha gwara otu NFF ka ewepụ Gernot ma tinye onye ọzọ aka siri ike ka ọnọchịte ya.

Marakwa na Rohr bụ onye nkuzi otu a kacha nọtee aka n'ọkwa ọchịchị dịka o kusiri otu Super Eagles ruo afọ ise.

Sunday Oliseh one kusiri ma lekọta otu bọọlụ Super Eagles n'oge gara aga

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Sunday Oliseh one kusiri ma lekọta otu bọọlụ Super Eagles n'oge gara aga

Kedụ ndị ọzọ nọbụrụla n'ọkwa ọche onye nkuzi otu bọọlụ Super Eagles?

NFF ahazịrịala ọkwa onye nkuzi otu Super Eagles kwa mgbe kwa mgbe.

Lee ndị nọrọla n'ọkwa oche a bido n'afọ 1999 ruo ugbua:

  • Netherlands: Thijs Libregts (1999)
  • Netherlands: Jo Bonfrere (1999-2001)
  • Naịjirịa: Shaibu Amodu (2001-2002)
  • Naịjirịa: Festus Onigbinde (2002)
  • Naịjirịa: Christian Chukwu (2002-2005)
  • Naịjirịa: Augustine Eguavoen (2005-2007)
  • Germany: Berti Vogts (2007-2008)
  • Naịjirịa: James Peters (2008)
  • Naịjirịa: Shaibu Amodu (2008-2010)
  • Sweden: Lars Lagerbäck (2010)
  • Naịjirịa: Augustine Eguavoen (2010)
  • Naịjirịa: Samson Siasia (2010-2011)
  • Naịjirịa: Stephen Keshi (2011-2014)
  • Naịjirịa: Shaibu Amodu (2014)
  • Naịjirịa: Stephen Keshi (2014)
  • Naịjirịa: Daniel Amokachi (2014-2015)
  • Naịjirịa: Stephen Keshi (2015)
  • Naịjirịa: Sunday Oliseh (2015-2016)
  • Germany: Gernot Rohr (2016-2021)
  • Portugal: José Peseiro (2021 - ruo ugbua)

** Augustine Eguavoen (Onye nnọchịte anya Gernot Rohr ruo nwa mgbe nta)

Marakwa n'otu bọọlụ Naịjirịa bụ Super Eagle amaliteghi n'afọ 1999, kama mba Briten hibere otu a mgbe ha na-achị Naijịrịa n'afọ 1949.

Super Eagles gbara asọmpị Afcon nke mbụ ha n'afọ 1996 dịka Naijiria nwetechara nwereonwe n'afọ 1960.