Nigeria vs Sudan: Etu Ugo Naịjirịa si tugbuo Agụnkwọ ndị Sudan Ugbua

Otu bọọlụ Naijirịa bụ Super Eagles e jirila otu bọọlụ mba Sudan mere ihe egwuregwu.

Moses Simon, nwaafo Naijiria gbanyere goolu nke atọ na neetị mba Sudan oge o ji otu nkeji gafee oge ezumike nke ọkara asọmpị ụbọchị Satọde.

Kelechi Iheanacho gbanyere otu ọkpụ goolu na neetị mba Sudan mana ogbuopi machịị ahụ kagburu ya dịka e kwuru na ya bụ goolu ezighi ezi.

Nke a kara ime ya goolu anọ Naịjirịa gbanyere.

Cheta na ọgba bọọlụ mba Naijiria, Samuel Chukwueze gbanyere otu ọkpụ gọọlụ na nkeji atọ ka asọmpị ahụ malitere.

Naijiria kere nkwụcha, foro ntutu taa ịhụ na Sudan abanyeghi goolu ọbụla na neetị ha.

Agbanyeghi nke a, Sudan gbanyere otu goolu n'elekere iri asaa,

dịka Walieldin Khedr gbanyere mba ahụ otu goolu site n'ụzọ penariti.

Chetakwa na onye bọọlụ Naịjirịa bụ Taiwo Awoniyi ji oge nkeji mgbakwunye nke etinyere tupu oge ezumike nke ọkara egwu taa bụ Satọdee agwụchaa were gbanye goolu nke abụọ.

Asọmpi a a gbara n'ọgbọegwuregwu Roumdé Adjia, Garoua, nke mba Kameruun maliere n'elekere ise nke ehihie Satọde.

Dịka Super Eagles meriri ugbua, nke a pụtara na ha etozuola oke ịbanye n'agba ọzọ nke asọmpi AFCON 2021.

Cheta na Naịjirịa ji ọtụ ọkpụ goolu merie Ijipt n'asọmpi mbụ ebe Sudan na Guinea-Bissau gbara nghatanha.

Ndị kpara ike n'asọmpị n'ụbọchi Satọdee

Samuel Chukwueze

Onye bọọlụ Naijria bụ Samuel Chukwueze dị afọ 22 gosiri ụwa na ọ bụghị mmanwụ a na-akwa aka dịka ọgbanyere Naijiria otu goolu.

Chukweze na-agbara otu bọọlụ Villareel egwu bọọlụ na mba ofesi.

Taiwo Awoniyi

Nwaamadị a dị afọ 24 na-agbara otu bọọlụ Bundesliga nke mba ofesi bọọlụ.

O kpara ike na machịị nke taa bụ Satọde dịka ọ gbanyere Naijịrịa otu ọkpụ gọọlụ.

Moses Simon

Ọgba bọọlụ mba Naijiria bụ Maazị Simon dị afọ 26.

Nwaamadị kpakwara ike n'asọmpị nke a agbara n'etiti Naijiria na Sudan dịka ọgbanyere otu goolu ma kwuru chịm n'ịhụ na Naijiria menyere Sudan ihere.

Walieldin Khedr

Nwaamadị a gbanyere mba Sudan otu goolu.

Khedr dị afọ 26, ọ na-agbara otu bọọlụ Al-Hilal Club (Omdurman) bọọlụ na mba ofesi.

Kelechi Iheanacho bụ nwafọ Naịjirịa gbara mbọ n'asọmpị taa, mana ogbu opi kagburu gọọlụ o gbanyere Naijria.

Cheta na Iheanacho nyere goolu Naịjirịa ji merie Ijipt ma nwete ihe nrite dịka onye kacha agba n'asọmpi ahụ.

Ndị atụrụ anya kwesiri ikpe ike na mba Sudan

Oche goolu ha bụ Ali Aboeshren chere penariti ma bụrụ onye kachasị agba n'asọmpi ha na ndị Guinea-Bissa.

Yasin Hamed nke na-agba bọọlụ n'ofesi bụ onye ọzọ kpụ ọkụ n'ọnụ na mba Sudan dịka ọ ga-edu ha aga agha ahụ.

Ihe ndị nchịkọta kwuru maka asọmpị taa tupu ọ malite.

Onye nchịkọta otu Super Eagles bụ Augustine Eguavoen sị na o cheghi n'asọmpi ahụ ga-abụ ofe nkupu nye ha.

"Anyị maara ihe ọrụ nyere, anyị ga-anwa ike anyị ịhụ na anyị gafere dịka mba Kameruun".

Burhan Tia bụ onye nchịkọta Sudan sị "Anyị ma ike ndị Naịjirịa mana ọ gaghị ekpochi anyị igosi ha ka anyị si kwadoo na nke ikpeazụ a".

"Anyị ma na Naịjirịa na-akpa ajọ ike, ha ga-achọ imeri mana otu ọbụla nwere ihe ha pụrụ ime".

Etu Naịjirịa na Sudan si kwụrụ n'asọmpi AFCON

Naịjirịa na Sudan ezutela onwe ha n'asọmpi Iko Mba Afrịka naanị ugboro abụọ kamgbe 1957 ọ maitere.

Nke mbụ ha zutere n'afọ 1963, Sudan ji ọkpụ goolu anọ a na-asataghị otu merie Naịjirịa (SUDAN 4 - 0 NIGERIA, 1963).

Nke abụọ ha zutere n'afọ 1976, Naịjirịa ji otu ọkpụ goolu merie ha (NIGERIA 1- 0 SUDAN, 1976).