You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
FA Chelsea na Man City ga-achịpụ ya
Otu egwuregwu bọọlụ Chelsea na Manchester City ga-ezute ibe n'ehihie a n'asọmpi Iko FA Community Sheild.
Asọmpi a bụ nke na-adị n'etiti ndị mabutere iko asọmpi premier na ndi mabutere iko FA ndị mba ỊngLand.
Cheta n'oge asọmpi gara aga, ndị Manchester City maburu Iko asọmpi Premier ebe ndị Chelsea maburu nke asọmpi FA.
Asọmpi a ga-amalite ma ọ kụọ elekere abụọ nke uhuru chi taa n'ọgbọ egwuregwu wembley nke Ịngland.
A na-atụ anya na Mahrez nke Man City na Jorginho nke Chelsea ga-amalite asọmpi nke taa.