Cameroon ahọpụtala Seedorf na Kluivert onye nkuzi otu egwu bọọlụ ha

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Clarence Seedorf abụrụla onye nkuzi ọhụrụ otu egwu bọọlụ mba Kameruun ebe nkata Kameruun na Sven-Goran Eriksson na-akpa amịtaghị mkpụrụ.

Seedorf bụ onye na-agbaburu AC Milan nakwa mba Holand bọọlụ na Patrick Kluivert ga-arụ ọrụ ahụ.

Kluivert, bụ onye ha na Seedorf gbakọrọ bọọlụ na otu egwuregwu nke ndị Holand, ga-abụ osote ya.

E mechaa n'ọnwa a, a ga-ekwupụta afọ ole ọrụ Seedorf na osote ya ga-anọ n'ọrụ ahụ.

Seedorf dị afọ 42 abụbuola onye nkuzi ndị AC Milan, otu egwu bọọlụ ndị Shenzen nke China na Deportrivo La Coruna.

Ọ nọrọ naanị ọnwa isii n'ọkwa atọ ahụ.

Seedorf na-anọchị Hugo Broos bụbụ onye nkuzi egwu bọọlụ Indomitable Lions, ọ ga-enwe ihe ruru otu afọ iji kwado otu ahụ maka asọmpi Iko mpaghara Afịrịka nke a ga-agba n'ala ha.

Ndị mba Kameruun agala na twitter na-ekwu etu ha si hụta ya bụ nhọpụta.

Saddick Adams kwuru na ya bụ nhọpụta bụ ihe na-atụ n'anya.

Nije Enow na-ekwu na ọ dịka ọ bụ iwu si n'elu maka na mịnịsịta na-ahụ maka egwuregwu na mba ahụ bụ Bidoung Mpkatt kwuru na ozi iwe ha n'ọrụ si n'elu bịa.

Usher Komugisha kwuru na ha na-atụ anya ka Seedorf na osote ya jikwa iko Afịrịka nke dị na mba ahụ ugbua n'afọ na-abịa.

Akụkọ ga-amasị gị: