Chelsea egosila Man Utd nkarị ma bulie iko FA

Chelsea emeriela Manchester United iji bulie iko FA bụ naanị iko ha nwetara n'afọ a.

Eden Hazard bụ onye egwu ndị Chelsea gbakpuru penariti o nwetara, nke mechara bụrụ naanị goolu e nyere na ngwụcha asọmpi FA nke afọ a.

A gufuru goolu Alexis Sanchez bụ onye egwu Arsenal nyere maka na ọ pụrụ 'offside'.

Ogbu opi bụ Michaeel Oliver ji VAR mee nyocha mere e ji gufuo goolu a.

Onye egwu ndị Manchesyer United bụ Paul Pogba, tafuru isi ọ tara n'ihu poostu, nke kara ime ka ndị otu ya sata goolu Hazard.

O buru aka n'isi ka ọ hụrụ na ihe o mere enyereghị ha aka.

N'agbanyeghị na Chelsea meriri ndị otu ya, Jose Mourinho bụ onye nchịkọta Man Utd makọrọ Antonio Conte na-achịkọta Chelsea, ebe Mourinho rụburu ugboro abụọ.