Russia bidoro ntụliaka taa iji chọpụta onyeisiala ọhụrụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ebe a na-ebinye aka emeghela na Mba Russia ebe ndị mba ahụ jisike na-apụta ị binye aka maka onye ga-achị ha n'ọdịnihu.

Onyeisi ala nọ n'ọkwa ọchịchị bụ Vladimir Putin nọ na-atụ anya na ya ga achị Russia na agba nke anọ.

Ntuliaka ahụ malitere ebe ọ kụrụ elekere asatọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Russia ma bido kwa ebe elekere itoolu gachara na Moscow bụ isi obodo Russia.

A na atụ anya ihe ntuliaka a pụtara ga-apụta na mgbede taa bụ ụbọchị ụka iji mara onye meriri.

Vladimir Putin, dị afọ 65, malitere ị chị mba Russia n'afọ 1999.

Ndị na-azọ ọchịchị na Russia

Ha ruru mmadụ asaa n'agụnyeghị Onyeisiala Putin na-azọ ọkwa ọchịchị na Russia. Lee ha na otu ha dị ịcheịche ebe a:

Pavel Grudinin:

Ya bụ onye na kwudoro ndị Pati Komunist.

Vladimir Zhirinovsky:

Bụ onyeisi otu ndị LDPR.

Grigory Yavlinsky:

Yavlinsky bụ onye bidoro otu Yabloko Liberal nke ndị Russia.

Ksenia Sobchak:

Ya bụ sọsọ nwaanyị na-azọ ọchichị otu ya bụ Liberal Party Civic Initiative.

Boris Titov:

Titov kwunyere ndị Party Ọganiru (Growth).

Sergey Baburin:

Bụ onye isi Pati Ogbakọ ndị Russia niile (Russian All-People's Union party).

Maxim Suraykin:

Bụ onye ọzọ na-anọchite anya ndị Pati Komunist.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: