A chụrụ osote onyeisi ndị FBI n'Amerịka Andrew McCabe

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

A chụọla McCabe, osote onyeisi otu nyocha mba Amerịka nke a kpọrọ FBI n'aha ịchafụ ka ọ fọrọ abalị ole na ole ka ọ laa ezumike nka.

Onye isi ngalaba na-ahụ maka ikpe na mba Amerịka bụ Jeff Sessions, kwuru na nchọpụta e mere gosiri na o zipuru ozi ma megharịa ndị na-eme nyọcha anya.

McCabe gọrọ agụgọ na ebubo ahụ achịtaghị aja kama ọ sị na a na-elegide ya anya n'ihi na ya sonyere na-ime nyocha na Russia tinyere aka na ntuliaka afọ 2016.

Ihe merenụ bụ: "E chere na ihe mere eji mee m otu a bụ n'ihi ọrụ m rụrụ, ihe m mere, na ihe mere n'anya m ka achụchara James Comey n'ọrụ."

Trump chụrụ Comey n'ọrụ dịka onyeisi FBI n'ọnwa Mee afọ gara aga maka otu ọ sịrị mee nyocha ozi igwe nke a kpọrọ email nke Hillary Clinton mana o mechara gụnye 'ihe gbasara Russia dịka ihe so kpata ọchụchụ ya.

N'onwe ya, Comey na-enyocha ebubo na ndị ọrụ Trump na ndị Russia nwere nkwekọrịta nyere Trump aka imeri na ntuliaka afo 2016. O gwakwara ndị ụlọomeiwu sineti na onyeisiala rịọrọ nkwadọ ya.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na-ebo McCabe ebubo na ọ kwadoro ndị otu pati Demokrats.

O toro Sessions' maka ichụ McCabe n'ọrụ.

N'ọnwa Disemba, Trump mere ka o ji McCabe eme akaje mgbe o kwuru n'igwe okwu Twitter sị: "Elekere osote onyeisi FBI bụ Andrew McCabe na-akụ kwapụkwapụ mgbe ọ ga ala ezumike nka. Abalị ịrị itolu ka ọ fọrọ?!!!"

Ihe ejiri chụọ McCabe

A na enyocha ya bụ McCabe maka etu FBI si lebanye anya na nyocha abụọ nke e mere oge ntuliaka onyeisiala nke e mere n'afọ 2016 na onyinyo a na-enyo na Russia tinyere aka ime ka Trump merie na ntuliaka ọkwa onyeisiala.

Ọ rịturu n'ọkwa ya dịka osote onyeisi FBI iji nye ohere maka nyocha ahụ ma na-eche ịla ezumike nka ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: