Fada Patrick Edet bụbu ụkọchụkwụ Katolic agbala akwụkwọ

Fada Edet onye nke gbara alukwaghịm n'ụka Katolik ọnwa itoolu gara aga, agbala akwụkwọ n' Uyo dị n'Akwa-Ibom steeti.

Fada Edet pụrụ n' ụka Katolik n'ọnwa Ọgọstu, afọ 2017 ma ga mepe ụlọụka nke ya nke ọ kpọrọ, Grace Family Assembly.

Fada Edet, onye na-agbasa oziọma n' igwe okwu radio lụrụ Inyene Sampson Akpan, onye gụrụ akwụkwọ na mahadum Uyo a kpọrọ, University of Uyo na bekee.

Ọnwa ole na ole gara aga, Fada Edet kwuru na ihe nkiri ọ wepụtara nke gbasara na ịntanet na "O were m ọtụtụ afọ na ọnwa ịchọ, tupu m nwe mkpebi ịhapụ ihe gara aga, ma ga n'ihu na nnwereonwe iji imejupụta ihe a kpọrọ m".

Mgbe BBC kpọrọ ya na-ekwenti, ọ zaghị mana akụkọ gbasara agbamakwụkwọ ya n'Uyo buliere ndọrịtaụka na igwe okwu Sochal midia na-etiti ndị Katọlik na ndị ụka ọzọ maka iwu ụka Katolịc mabidoro ụkọchụkwụ ịlụ nwaanyị.

Ebe ụfọdụ na-ekwu na ọdịghị mma, ụfọdụ na-ekwu na ọ kara ya mma ịpụ na Katọlik ga lụọ nwaanyị karịa ịbi ndụ njọ ịmetọ onwe ya.

Adesola Aderele sịrị: "Ịhapụ ịlụ nwaanyị n'ihi alaeze, dịka esi ekwu ya, nwere ọtụtụ ihe na-eme ka ọsịere onye ahụ zuru oke ike ma nwoke ma nwaanyị. Ọkara mma ịlụ nwaanyị karịa na ahụ na-anọ gị ọkụ."

Chiagozie Chukwuka jụrụ: " Ọ bụ na ọdighị mma na ọ gbara alụkwaghị kama ịnọ na-eme ihe nzuzo ekwesịghị?"

Ebe Justin Uzodimma kwuru: "Ihe nke a dị egwu."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: