Na Kanọ, nwa Dangote agbala akwụkwọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Fatima, nwa Aliko Dangote nke a mara dịka onye kachasị nwee ego n'Afrika gbara akwụkwọ ụnyaahụ.

Jamil Abubakar bụ nwa otu onyeisi ndị uweojii oge gara aga kwụrụ ọkara nde naira dịka ego isi o jiri lụọ ya.

Ọtụtụ ndị Najiria ọnụ na-eru n'okwu gara agbamakwụkwọ ahụ nke onyeisiala bụ Muhammadu Buhari nyefere nwa agbọghọ ahụ n'aka di ya.

Emechara, Emir nke Kano bụ Malam Muhammad Sanusi II goziri di na nwunye ọhụrụ ahụ n'obi ya.

Onyeisi ụlọ ọmewu Sineti bụ Bukola Saraki sọrọ ga mmemme ahụ.

Ndị ọzọ gara agbamakwụkwọ ahụ gunyere Asiwaju Bola Tinubu, ndị Gọvanọ: nke Oyo steeti, Abiola Ajumobi; nke Kaduna, Nasir El-Rufai; nke Sokoto, Aminu Tambuwal;nke Kwara, Abdulfatah Ahmed;nke Kano,Umar Ganduje; nke Katsina, Bello Masari; nke Sokoto, Aminu Tambuwal; nke Kaduna, Malam Nasir El-Rufai wgz.

Lee ihe ụfọdụ na-ekwu maka alụmdinanwunye ahụ na Twitter:

Akụkọ ga amasị gị: