You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Ndị Boko Haram egbuola ndị ọkụ azụ 5 na Lake Chad
Akụkọ na pụta site ụwụwa anyanwụ ugwu Naịjirịa na ekwu na ndị omokome a na-eche na ha bu ndị Boko Haram egbuola mmadụ ise bụ ndị na-akụ azụ na Lake Chad.
Ihe a mere na ime obodo dị na Lake Chad.
Onyendu ndị na-akọ azu na Borno Steeti bụ Abubakar Gamandi siri na egburu ndị a maka ha na enyere ndị agha Naịjiria aka n'ịchọ ụmụakwụkwọ a nwụchịrị na Dapchi na ọnwa gara aga.
Mwakpo a ejiri gbuo ndị a mere na ala miri gara okirikiri a na-akpọ Tudun Umbrella n'ime Lake Chad, bụ ebe Naịjirịa, Chad na Cameroon nwere ụsọ.
Onyesisala Naịjirịa bụ Muhammadụ Buhari sị na ya na-agba oke mbọ ka a hụ na ụmụakwụkwọ a ndị Boko Haram tọọrọ laghachitere.