Uefa: A ga-ama mbe ndị bụ oke n'asọmpi Uefa na Europa

A ga-agba ngụcha asọmpi Uefa n'obodo Kyiv dịna mba Ukraine

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A ga-agba ngụcha asọmpi Uefa n'obodo Kyiv dịna mba Ukraine

Ndị na-ahazi asọmpi Uefa Champịọns ahọpụtala otu egwuregwu dị icheiche ga-ezute ibe ya n'agba kwọta faịnalụ nke asọmpi ahụ.

Iko Uefa Champịọns bụ ọkaibe nke na-esota iko mba ụwa n'iko niile gbasara asọmpi egwuregwu bọọlụ.

Otu egwuregwu ndị ga-ezute ibe ha n'asọmpi Uefa Champịọns
Nkọwa foto, Otu egwuregwu ndị ga-ezute ibe ha n'asọmpi Uefa Champịọns

Anya otu egwuregwu niile a dị n'ebe iko Uefa Champịọns ahụ nọọ.

Na nhọpụta ahụ emere taa, FC Barcelona ga-ezute AS Roma, Sevilla FC na FC Bayern Munich ga-achịpụya.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ

Juventus na Real Madrid ga-amaaka, ebe Liverpool na Manchester City ga-agba.

Asọmpi ndị ga-abụ n'abalị atọ na anọ nke ọnwa Epurelu.

Arsenal ga-ezute ndị CSKA Moscow n'asọmpi Europa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Arsenal ga-ezute ndị CSKA Moscow n'asọmpi Europa

N'aka nke ọzọ ahọpụtakwara otu ga-ezute ibe ha n'asọmpi Europa.

Arsenal ga-ezute CSKA Moscow, RB Leipzig na Marseille, Athletico Madrid na Sporting Liabon ga-achịpụ ya, dịka Lazio ga-anabata Red Bull Salzburg.