Serena na Venus Williams ga-asọmpi n'Indian Wells

Ebe foto si, EPA
Onye a ma ama n'asọmpi tenis na mbaụwa bụ Serena Williams na nwanne ya nwaanyị Venus ga-apịa n'agba nke atọ na Indian Wells.
Nke a bụ dịka Serena laghachitara kamgbe ọnwa iri na anọ ọ pụrụ ịga mụọ nwa ya nwaanyị.
Serena agbaghị tenis n'ọnwa 14 ndị ahụ, mana o meriri Kiki Bertens bụ onye Nedaland 7-6 (7-5) 7-5 n'agba nke abụọ ha.
"Ihe niile bụ nrite," Serena kwuru ka o nwere mmeri n'ime otu elekere na nkeji 52.
Nwanne abụọ a zutere n'ikpeazu n'afọ 2017 mgbe ha gbara na mgbacha Australian Open bụ mgbe Serena ritere iko Grand Slam nke iri abụọ na atọ ya.
Mgbe o meriri Venus na Melbourne, Serena di ime ada ya bụ Alexis Olympia nke ọ mụrụ n'ụbọchị mbụ nke Septemba 2017.
Asọmpi a ga-abụ nke ugboro 29 ụmụnne a ga-ezụkọ n'asọmpi nrite. Serena meriri ugbo 17 n'ime ugbo 28 ha gbabugoro.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:







