Africa Eye: Ndị nkuzi ji ụtalị apịagbu ụmụakwụkwọ ha
Nnyocha nzuzo nke BBC mere na mba Kenya egosila etu ụfọdụ ndị nkuzi si enye ụmụakwụkwọ ha ntaramahụhụ dị oke njọ site n'ịpịa ha ụtali, n'agbanyeghị na gọọmentị mba ahụ machiri ụdị ntaramahụhụ a maka ụmụ akwụkwọ.
Onye ntaakụkọ mere akụkọ a kọwara na ya onwe ya gabigakwara ụdị mmekpa ahụ dị etu ahụ n'aka ndị nkuzi ya oge ya na-agụ akwụkwọ praịmarị na sekọndịrị na mba Ghana.
Mana taa, n'agbanyeghị na o ruola afọ 20 gọọmentị mba Kenya tinyere iwu iji kwụsị ndị nkusi ịpịa ụmụakwụkwọ ha ụtalị, ụdị ntaramahụhụ a ka na-akawanye njọ.

Otu nwata akwụkwọ, Caleb Mwangi, kọọrọ BBC etu onye nkuzi ya si pịa ya ihe nke ukwuu n'afọ 2022, nke na ọ fọdụrụ obere ihe ka ọ nwụọ.
Mwangi, dị afọ 15, nọrọ ụbọchị 11 na 'coma' n'ụlọọgwụ ebe a na-azọ ndụ ya n'ihi ụtalị onye nkuzi ya pịara ya maka na ọ tara achịcha karịa ole o kwesịrị n'ụlọakwụkwọ ha.
Otu nwaanyị ọzọ, Martha Samuels, kọkwara etu nwa ya nwaanyị, Ebbie, si nwụọ dịka onye nkuzi ya tichara ya ihe, mana ụlọ akwụkwọ ahụ gọrọ agọ ma kwuo na nwata ahụ si n'elu akwa ya dapụ kụọ isi n'ala.
N'ime afọ ise gara aga, akụkọ maka ụmụakwụkwọ nwụrụ n'ihi ihe ndị nkuzi ha tiri ha, eruola 20, dịka onye ntaakụkọ BBC si kwuo.
"Ebe m na-adị ndụ, aga m eme ihe niile m nwereike ime iji hụ na nwa m nwaanyị nwetara ikpe ziri ezi. Onye nkuzi ahụ tigburu nwa m ga-ezute ikpe ziri ezi," Martha Samuels kwuru.








