BBC Africa Eye: Etu ndị na-elekọta ndị okenye n’ụlọ PCEA Thogoto si e ji ụtalị apịaka ha ahụ
Ọtụtụ ndị okenye bi n’ụlọ ebe a na-eleta ha anya n’akụkụ Nairobi, Kenya anatala mmekpa ahụ nakwa nlelianya dịka nnyocha BBC Africa Eye siri kpuhie.
Ihe onyonyo e setere na nzuzo ebe ahụ gosiri na ndị ọrụ na-arụ n’ụlọ nlekọta a, tiri ụfọdụ ndị okenya a ihe, mmekpaa ụfọdụ ahụ ebe ha tọgbọọrọ ndị ọzọ nri n’elu tebulu nkiti ma ghara itinyere ha nri n’efere.
A hụkwara na ndị na-arụ ebe ahụ leghaara ndị ọkenye nọ n’ọrịa anya ma ghara inye ha ọgwụ maka ọgwụgwọ.
Onyonyo BBC setere hụrụ ebe otu onye na-arụ ebe ahụ gwara ogbo ya ji osisi n’aka “Pịa ya ihe n’ike. Tie ya ihe”. Ihe a bụ ihe na-eme n’ime ụlọ nleta nke ụlọụka Presbyterian nwee – Ya bụ Presbyterian Church of East Africa (PCEA) nke Thogoto dị na mpaghara ji 20km nọrọ n’akụkụ ọdịda anyanwụ Nairobi.
BBC hụrụ ọtụtụ mmekpa ahụ ndị ọzọ na-atụ n’anya.
Kirie ihe akụkụ so nnyocha a n’uju ebe a.

Ebe foto si, BBC Africa Eye






