Africa Eye: Ndị ụkọchụkwụ adịgboroja, ndị amụma amakaekwu na ndị ogbu ọchụ
Nde kwuru nde ụmụ Afrịka jiri okpukperechi Kraịst hiwe isi.
Mana ndị pastọ adịgboroja ejirila ọtụtụ ndị mmadụ mee pọọpịị n'ụdị mere ka okwukwe ha rịe mperi ma meekwa ka ndị ofufe ha nyọwe ụka enyọ n'Afrịka.
Onye ntaakụkọ BBC Afrịka Eye bụ Peter Macjob gara mba Uganda, gakwuru otu ụka ọgbara ọhụrụ na-akatọ ụka otu Kristi.
Nne na nna Macjob mụnyere ya n'ụka Katọlik, mana ọ sị na ọ dị ya mwute etu ndị ụkọchukwu na ndị Pastọ adigboroja si emechu okpukperechi Kraịst ihu.
Iji nyochaa ọtụtụ akụkọ ọjọọ a banyere ndị ụka adigboroja, Macjob tinyere isi na mba Afrịka dị icheiche iji mata etu ha si arụ ọrụ.
Kanungu, Uganda, 2000

Ebe mbụ Macjob gbara ụkwụ bụ n'obodo Kanungo nke mba Uganda, ebe otu pastọ adigboroja kpara arụ na-enweghị atụ afọ iri abụọ na abụọ (22) gara aga.
Ụkọchukwu a kpọchiri ndị ụka ya karịrị narị ise (500) n'ọnụọgụgụ n'ime ụlọụka ha, ma mụnye ha ọkụ.
Ndị ụka a kwenyere na ụwa ga-emebi n'afọ 2000, na mmalite 'millenium' ọhụrụ.
Mana oge nke a na-emeghị, ha malitere ịrụ ụkọchukwu ha ụka.
Nke a mere o ji gwa ha na ha nwere ọgbakọ, ha ncha niile gbajuo n'ime ụlọụka, ụkọchukwu a kpọchido ha ụzọ, tinye ụlọụka ahụ ọkụ.
Ụlọụka 'Faith of Unity'

N'obodo Kagadi dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Uganda, e nwere ụlọụka a na-akpọ Faith of Unity nke onye malitere ya bụ nwoke aha ya bụ Omukama Bisaka.
Ụlọụka a bụ 'Faith of Unity' nwere agba nke ọma na Uganda; Onyeisiala Yoweri Museveni so na ndị nkwado ha.
Nwoke a bụ Omukama Bisaka lara mmụọ n'afọ 2020, mana ndị ụka ya, bụ ndị na-ahụta ya ka Chukwu, kwenyere na ọ ga-alọghachi ndụ ọzọ.
Nke a mere ka ha zukọọ n'emume wuru ewu na Uganda niile iji were anya ha hụrụ mgbe onyeisi ha ga-ebili n'ọnwụ.
Mana oge ha mechara emume ha, Bisaka ekulighi n'ọnwụ.
Okpukperechi so n'otu ihe na-eme ka ndị mmadụ nwee olileanya na nkasị obi,
Mana dịka ndị ụka adigboroja na-ejuputazi ebe niile ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ amalitela ịgbakụta okpukperechi azụ.





