Africa Eye: Etu m si ebuso mmegbu ụmụnwaanyị agha na mba Somalia - Maryama
Somalia so na mba Afrịka ebe iwu enyeghi ụmụnwaayị ohere ịkpụpu onye ọbụla wakporo ha ụlọikpe.
N’akụkọ Africa Eye nke BBC Africa otu nwaagbọghọbịa aha ya bụ Maryama kọwara etu o si malite ịrụrụ otu gọvanọ ọrụ dịka onye na-emepụta ihe onyooyo.
O kwuru na ndị mmadụ anaghi akwado ka ụmụnwaanyị rụọ ọrụ na mba ha n’ihi ha chere na nwaanyị kwesịrị ịnọ n’ụlọ lekọta ezinụlọ ebe nwoke kwesịrị ịrụ ọrụ.
Ihe onyoonyo a gosiri etu nwaada si agba mbọ n’ọrụ ma na-akwara ụmụ nwaanyị ibe ya ụzọ n’agbanyeghi nkatọ ọ na-enwete kwa ụbọchị.
N’ọtụtụ mba ụwa, ọkachasị na mba Afrịka a na-akpachapụ ụmụnwaanyị n’akụkụ ma abịa n’ihe ọbụla gbasara agụmakwụkwọ, ọrụ oyibo, ọrụ aka n’ihe ndị ọzọ nke mere na agwaa na-emetụta ọganihu nakwa akụnụba ọtụtụ mba.
Ihe onyoonye Africa Eye gbara ama na-egosi etu nwaanyị si nwee ike ịbụ ihe ọbụla o tinye uchu nakwa uche ya ime.
Kịrịe ihe onyoonye ka ịhụ etu nwaada a si enweta mgbanwe n’obodo ya.