Africa Eye: 'Ndị tọrọ nwa m nwaanyị ma gbuo ya sị ka anyị kwụọ 800 million naira'

Aha onyonyo, Africa Eye: 'Etu e si tọrọ ụmụaka abụọ m n'otu ụbọchi na Naịjirịa'

Nne na nna ụmụakwụkwọ atọrọ nso nso a n'ụfọdụ akụkụ Naịjirịa tụmadị na mpaghara ugwu ekwuola etu ihe ọdachị a si metụta ha na ezinụlọ ha.

Ha kọwakwara etu ihe si kwụrụ ugbua dịka ọtụtụ nne na nna ụmụ ha nwụrụ n'aka ndị ntọ na-ekwu na ha enwetebeghị ikpe kwụ ọtọ.

Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị ntọ toghapụrụla kwuru na ụjọ ka ji ha.

Kirie ihe ha kwuru n'uju ebe a.