Peter Odili: Kedụ ihe ị ma maka nwoke a 'zụrụ' Wike na Amaechi na ndọrọndọrọ ọchịchị?

Kemgbe ụbọchị Monde, abalị 15 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2022, ụmụ Naijiria kpụ aka chịburu steeti Rivas bụ Peter Odili n'ọnụ dịka ọ gbara afọ 74.

Odịlị bụ dọkịta ahụike ma bụrụkwa Odogwu kara aka n'okwu ndọrọndọọ ọchịchị dịka ọ 'zụrụ' ọtụtụ ndị Rịvas a na-anụ aha ha n'okwu ndọrọndọọ ọchịchị naijiria na nka ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ndị ahụ gụnyere Aka na-achị Rịvas steeti ugbua bụ Nyesome Wike; Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Rotimi Amechi, Magnus Abe nakwa ndị ọzọ.

Mana gịnị ka ị ma maka nwoke kpọbatara ha ma zụọ ha n'ụzọ ndọrọndọrọ?

Peter Odili bụ otu onye a ma ama n'ihe ndọrọndọrọ na Naịjirịa ọ kachasị na mpaghara etiti ndịda Naịjirịa ebe o si.

Mgbe amalitere ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 1999, ọ bụ yaka ahọpụtara dịka Gọvanọ steeti ahụ nke atọ kemgbe ekepụtara ya.

Mana tupu nhọpụta ahụ, o sobuola chịa steeti ahụ dịka osote Gọvanọ site n'afọ 1992 rue afọ 1993.

Ugbua, ọ nọzi na otu PDP ebe ọ bụ otu isi a hụrụ kwaba okpu n'otu ndọrọndọrọ ahụ.

Ọ dịzi afọ iri asaa na anọ dịka a mụrụ ya n'ụbọchị 15 nke ọnwa Ọgọst afọ 1948.

Ihe ndị ị kwesiri ịma maka Odili

E wezụga ihe gbasara ndọrondọrọ ọchịchị, ihe ọzọ aha Odili ji ada ụda na Naịjirịa bụ nwunye ya.

Aha ya bụ Mary Ukaego Odili, onye ọkaikpe ụkwụ na Naịjirịa a mụrụ n'afọ 1952.

Mary Odili bụ onye Mbaise n'Imo steeti lara ezumike nka n'ọkwa ya n'afọ 2022.

Na nsonos a aha Jọstịs Ọdili kpọtụụ n'akwụkwọ akụkọ dịka ndị ọrụ nchekwa wakporo ụlọ Jọstịs Odili bụ ọkaikpe n'Ụlọikpe kachasị (Supreme Court Judge), dị n'Abuja.

Ihe ndị ọzọ ị kwesiri ịma maka Peter Odili

Peter Odili bụ onye Ogba/Egbema/Ndoni dị na Rivas steeti.

Ọ gara akwụkwọ na Mahadum Nigeria dị na Nsukka.

O mechara gụtọpụ akwụkwọ ya na Mahadum Liverpool dị na mba Briten.

Ọ lụrụ Mary Ukaego Odili n'afọ 1979.

Ha mụrụ ụmụ anọ bụ Adaeze Odili, Njideka Odili, Chinelo Odili na Peter Odili nke ọbere.

A họpụtara na ndị so nochi anya Rivas steeti n'ọgbakọ akpọrọ Constituents Assembly n'afọ 1988/89.

O kwuru na ọ ga-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru otu PDP n'afọ 2007 mana ọ mechara ritue ka Umaru Musa Yar'Adua were ọkwa ahụ.