Ibute ego n’ụlọụka maka inwete vootu agaghị enwe isi na ntuliaka 2023 – Archbishọp Chukwuma

Aha onyonyo, Archbishop Chukwuma: ibute ego n’ụlọụka maka inwete vootu agaghị enwe isi na ntuliaka 2023
Ibute ego n’ụlọụka maka inwete vootu agaghị enwe isi na ntuliaka 2023 – Archbishọp Chukwuma

Onyeisi ụlọụka Agịlịkan nke Enugwu Dayọsis bụ Achbishọp Emmanuel Chukwuma akatọọla omume ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ibute ego n’ụlọụka ka e nwee ike tụọrọ ha vootu.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, ọ sị na ụfọdụ ndị ụkọchukwu na-anabata ụdịrị onyinye a bụ ndị sị ha na-ahụ ọhụ (vision).

N’okwu ya “Ndị na-eme ụdịrị ihe a bụ ndị na-ahụ ọhụ, ọ bụ ha ka ọ ka njọ, anaghị m ahụ ọhụ.”

“Ọ bụrụ na m hụ na ịgaghị aga, aga m agwa gị ya hoohaa ka i buru ego gị gawa”.

“ibute ego n’ụlọụka sị na ọ bụ ‘financial inducement’ ọ gaghị adị ire”.

Bishọp Chukwuma sị na ọ bụrụ na onye ahụ sị na ọ chọrọ itinye aka n’ọrụ ụlọụka na-arụ na e nwere ike ịnabata ya ma ọ bụrụ ego dị ọcha.

“ọ bụrụ na iwete ego n’ụlọụka ebe ndị ị na-achị na-ta ahụhụ, aga m asị gị gaa buụzọ mezie ndị ahụ.”

Ọ sị na ihe ga-eme na ntuliaka nke ugbua bụ na ndị mmadụ ga-anara onye ahụ ego, rie ya ma ghara ịtụrụ ya vootu ọbụla.

Bishọp ụka Agịlịkan nke Dayọsis Enugwu

Bishọp Chukwuma gakwara n’ihu tinye ọnụ maka atụmatụ ndị alakụba ịzọ ọkwa onyeisiala na osote ya nke APC na-agbaso.

Ọ sị na nke ahụ agaghị adị ire maka na Chineke agaghị ekwe ka o mee.

O kwuru na atụmatụ ahụ mara afọ n’ala n’oge nke Abiola na Kingide maka na ha dara na ntuliaka ahụ.

Ọ gakwara n’ihu dụọ ndị katọrọ ya na soshal midia ndụmọdụ maka okwu o kwuru na “Enugu adịghị obidient.”

sị ka ndị dị etu a kwụsị iji soshal midia akparị mmadụ.

Ọ sị ka ha jiri nwayọọ mee ka uche Chineke mee n’ihe gbasara ntuliaka na Naịjirịa.

“Ọchịchị dị n’aka Chineke, ọ bụghị ihe a na-eji ịkparị mmadụ maọbụ gidigidigidi enweta.

Kirie ihe o kwuru n’uju