Ihe Gọvanọ Hope Uzodimma sị bụ ọrụ ndị Ebubeagu n’Imo Steeti

Ebe foto si, Hope Uzodimma/BBC
Gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodimma ekwuola ụfọdụ ọrụ ndị otu nchekwa Ebubeagu nke steetị ya na-arụ.
O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ n’ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV na mgbe ụbọchị Tuzde.
Uzodimma sị na ọrụ ndị Ebubeagu na-arụ bụ ịbanye n’ime obodo dịka ndị nkịtị, sie imi n’ala ma chọpụta ozi dị mkpa banyere nchekwa ma gbaara ndị uweojii ama.
O kwuru na ndị otu a anaghị ebu egbe maọbụ ngwa ọgụ ọbụla n'ọrụ ha na-arụ.
Uzodimma sị na ọtụtụ mwakpo na mpụ ndị a sị Ebubeagu na-eme n’Imo steeti bụ asị ọcha, na ọ bụ aka ọrụ ndị ekperima chọrọ itinyere ndị Ebube Agụ aja na garị.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọrụ ndị Ebubeagụ na-arụ bụ ihe iwu ndị ụlọomeiwu steeti ya kwadoro, na ọ gaghị ekwe ka ndị ha buru ngwa ọgụ.
Mgbe a jụrụ ya banyere ọnọdụ ‘sit-at-home’, Uzodimma kwuru na enweghizi ihe dịka atụmatụ a n’Imo.
O kwuru na ndị mmadụ na-apụta gaa mkpa dịịrị ha n’ụbọchị Mọnde ọbụla, tinykwara na ndị ọrụ nchekwa kwụ chịm igbochi ọgbaghara ọbụla.
Ụfọdụ ebubo e borola ndị Ebubeagu n'Imo steeti

Kamgbe Ebube malitere ọrụ n'Imo steeti , e bola ha ọtụtụ ebubo dị iche iche.
Otu n’ime ebubo ndị a wuru ewu bụ na ha wakporo obodo Awo-Omamma dị n'Oru West na ngwụcha ọnwa Julaị ma gbuo ndị ntoroọbịa asaa si n'emume agbamakwụkwọ na-alọta.
Onyeisi obodo Otulu bụ Nnamdi Agbor, gwara BBC na mmadụ asaa ndị ahụ nwụrụ n’ezie na mwakpo a.
Mana Gọvanọ Hope Uzodinma zịpụtara ozi kwuo na ọ bụ ndị uweojii pụrụiche nke Department of State Services (DSS) bụ ndị rụrụ ọrụ nchekwa n’obodo ahụ ma wakpoo ndị omekome.
Uzodinma kwuru: “Ebe ndị DSS wakporo ndị omekome ahụ bụ n’ogige ha zoro ezo, ọ bụghị n’ebe emume agbamakwụkwọ ọbụla”
Gọọmentị kwusiri ike na ọ bụ ndị ọmekome ka ha wakporo na ọ bụghị ndị nkiti.

Mana ka nke a ahụ gachara, ndị obodo Amaeche dị n'Oguta na steeti ahụ kwukwara na ndị Ebubeagu wakporo obodo ha ma gbagbuo otu onye ntoroọbịa n'ụbọchị ụka bụ Julaị 24, 2022.
Nke a mere ndị ụmụnwaanyị obodo ahụ jiri pụta n’igwe ma mee ngagharịiwe n’obodo ha n’abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Julaị 2022 iji katọọ ihe a a sị ndị Ebubeagu mere. Ha kwuru “Anyị achọghịzi ndị Ebubeagu n’obodo anyị”.
Ihe Gọọmentị Imo steeti na-eme maka nchekwa

Ebe foto si, Imo State New Media/Facebook
Imo steeti so na steeti ebe enweghi ezi nchekwa na-emekpa ahụ n'Ọwụwa Anyanwụ nke Naịjirịa.
Nke a mere gọọmentị steeti ahụ jiri zibata ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa na gburugburu steeti ahụ nke gụnyere ndị uweojii, ndị agha nakwa ndị otu nchekwa Ebubeagu.

Ebe foto si, Imo State New Media/Facebook
Gọvanọ Uzodinma ṅụrụ iyi ịkwado ndị ọrụ nchekwa n'ụzọ ọbụla iji kpochapụ ndị omekaome na steetị ahụ.
N'ụbọchị Tuzde16 nke ọnwa Ọgọstụ, ọ kpọkuru onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Usman Alkali Baba ka ọ bịa nabata ụgbọala pụrụiche 10 nke ndị ọrụ nchekwa na-akpọ 'Amorured Personnel Carriers'.
Ọ sị na gọọmentị ya zụtara ụgbọala ndị a iji hụ na eweghachịtere udo na steeti ahụ.









