Fifa World Cup Qatar 2022: Ihe ndị a na-atụ anya ya n'asompi 'World Cup' malitere taa

Taa bụ ụka, abalị 20 nke ọnwa Novemba, afọ 2022, ka a na-amalite asọmpi iko mba ụwa (2022 Fifa World Cup ) na mba Qatar.
Asọmpi 2022 Fifa World Cup bụ asọmpi egwu bọọlụ ụmụnwoke nke mba otu egwu bọọlụ ụmụnwoke ha nọ n'otu Fifa.
Ya bụ asọmpi a ga-eme otu ọnwa ga-akwụsị n'abalị 18 nke ọnwa Desemba afọ 2022.
A ga-eme asọmpi ahụ n'ama egwuregwu asatọ n'obodo ise.
Ụnyahụ bụ Satode ka ndị na-akwado egwu bọọlus si mpaghara ụwa dị iche mere emume ha.

Ebe foto si, Getty Images
Asọmpi mbụ ga-abụ n'etiti Qatar na Ecuador n'amaegwuregwu 'Al Bayt Stadium' dị n' Al Khor.
Asọmpi nke ikpeazụ ga-abụ n'abalị 18 nke ọnwa Disemba nke ndị ga- asọmpi ndị ga-asọkọ nke ụbọchị ikpeazụ ga-abụ ndị meriri ibe ha rue agba nke ọkara ikpeazụ.
A na-atụ anya na otu egwu bọọlụ mba 32 ga-esonye n'asọmpi ahụ nke bụ mbụ a na-ehiwe asọmpi ahụ n'mba Arab.
Nhibe e hibere asompi Fifa nke afọ 2022, ebutela ọtụtụ nsogbu na nghọtahie.
A na-ebo mba Qatar ebubo mpụ dị iche iche nke mere ụfọdụ mba ji ekwu na ha agaghị abịa ya bụ asọmpi.
N'ọnwa Febụwarị afọ 2021, ụlọntaakụkọ Guardian nke London kwuru na ndị ọrụ mbịarambịara si Pakistan,India,Bagladesh na Sri Lanka dị puku isii,narị ise(6500)nwụrụ na Qatar kemgbe hamba ahụ nwetara ikike ị bụ ebe a ga-anọ so mpi iko mbaụwa.
Quatar meriri mba Japan, Ọstrelia, Saụt Korea na Amerịka were nweta ikike a.

Ebe foto si, Getty Images
Ebubo ndị a gụnyere imekpa ndị ọrụ mbịarambịara ahụ, imegbu ndị nwoke maọbụ nwaanyị na-edina ibe ha,imegide ikike dịrị onye nakwa ebubo na ha nyere ngarị iji nweta ikike ịbụ ndị a ga-asọ mpi ahụ na be ha.
Sep Blatter bụ onye bụ onyeisi Fifa oge Qatar nwetara ikike ịbụ ebe a ga-asọ mpi ahụ afọ iri gara aga ekwuola na ọ bụ "ndahie"' inye Qatar ikike ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Qatar abụghị mba e ji ịgba bọọlụ mara , mba ahụ bụkwa mba na-enwe oke ekpomokụ ya mere ọtụtụ e jighị ghọta ihe mere Fifa ji nye ha ụdị ohere a, ebe ụfọdụ na-arụ aka ma na-ebo Fifa ebubo nrụrụaka n'etu nhọpụta ahụ siri gaa.
Na'izu ole na ole gara aga, e nwere ebubo na mba Qatar kwụrụ ụfọdụ ụmụamala ha ndị egwu bọọlụ na-amasị ego ịbụ ndị enyi ha si mba ndị ọzọ, mana ndị na-ahazi asọmpi ahụ gọrọ na akụkọ abụ aụgha.Gọọmentị Qatar kwuru na ọ bụ ịkpa oke agbụrụ kpalitere nkatọọ.
Mana onyeisi otu Fifa ugbua bụ Fifa Gianni Infantino katọrọ mba ndị dị n'Ọdịda Anyanwụ Yurop sị na nkatọ ha na-akatọ Qatar bụ "meremere n'ihu, gwọmpụta n'azụ."
E tere ogiri, e tere ụgba, agha akara aka, anaghị eri ngwọrọ.
Ụbọchị akara aka eruola.












