E tinyela ozu Peter Rufai bụbu oche goolu ndị Super Eagles n'ala

Olili ozu Peter Rufai bụbu oche goolu ndị Super Eagles
Nkọwa foto, Olili ozu Peter Rufai
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ezinaụlọ na ndị enyi Peter Rufai bụbu oche goolu ndị Super Eagles etinyela ozu ya n'ala taa bụ Faịde, Ọgọst 22, 2025.

Ha riri ozu ya n'ebe a na-eri ozu n'Ikoyi Legos steeti.

Peter Rufai bụ onye e jikwa 'Dodo Mayana' nwere mara nwụrụ n'ụbọchị Tọzde, abalị atọ nke ọnwa Julaị mgbe ọ dị naanị afọ iri isii na otu.

Olili ozu Peter Rufai bụbu oche goolu ndị Super Eagles
Nkọwa foto, Olili ozu Peter Rufai

Rufaị yara ahụ ihe karịrị izu ụka tupuu ọ nwụọ n'ụlọọgwụ dị na Legos steeti.

Ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles toro mbọ niile Rufaị gbara mgbe ọ dị ndụ dịka onye na-echere ha goolu.

Peter Rufai anwụọla dịka ọ gbara afọ 62

Akụkọ kwuru na ochie dike ahụ a maara nke ọma dịka Dodo Mayana rịara ọrịa ọtụtụ afọ tupu ọ nwụọ n'ụtụtụ Tọzde 3 Julaị, 2025.

Ebe foto si, Getty Images

Onye bụbụ ochee goolu otu egwu bọọlụ Super Eagles Naịjirịa bụ Peter Rufai anwụọla.

Otu egwu bọọlụ Super Eagles kwupụtara maka ọnwụ onye ahụ bụbu kaptịn ha.

Dịka ha siri kwuo, Peter Rufai nwụrụ ka ọ gbachara afọ iri isii na abụọ (62)

Akụkọ kwuru na ochie dike ahụ a maara nke ọma dịka Dodo Mayana rịara ọrịa ọtụtụ afọ tupu ọ nwụọ n'ụtụtụ Tọzde 3 Julaị, 2025.

Akwụkwọ ozi Super Eagles wepụtara kwuru na ha ga-echeta ochee goolu ahụ 'mgbe niile'.

Odeakwụkwọ otu NFF bụ Mohammed Sanusi kwuru na ọnwụ Rufai dị ezi mwute ma kwuo nay a amaghị na Rufai nọ n'ọrị kemgbe.

Onye bụ Peter Rufai?

Aha onyonyo, Etu oche goolu Naịjirịa Peter Rufai si bie ndụ ya

A mụrụ ya na Legọs steeti n'afọ 1963.

Ọ malitere njem ya dịka ọgbaabọọlụ n'otu egwu bọọlụ Stationery Stores FC nakwa Femo Scorpions.

N'afọ 1986, ọ gara mba Bene ma sonyere otu egwu bọọlụ AS Dragons FC de l'Ouémé.

Oge mbụ ọ gbara otu egwu bọọlụ Green Eagles bọọlụ bụ na Disemba 198. O nyere Naịjirịa aka rita ọlaọcha n'asọmpi AFCON 1984 nakwa 1988.

Peter Rufai nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi iko mbaụwa abụọ nakwa ọtụtụ asọmpi iko mba Afrịka

N'afọ 1994, o so n'otu egwu bọọlụ Super Eagles turu ugo n'asọmpi AFCON nke afọ ahụ.

Oge a ọ lara ezumike nka, Rufai gara n'ihu na-achọpụta ma na-ekuziri ndị ntorobịa bọọlụ.

Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nkụzi out egwu bọọlụ U23 Naịjirịa n'oge gara aga.

Rufai gbara bọọlụ na Beljọm, Nedalands, Pọtụgal nakwa Spen.

Otu egwu bọọlụ ọ gbaara bọọlụ gụnyere Lokeren, Hércules CF na Deportivo de La Coruña.

Ọ malitere njem ya dịka ọgbaabọọlụ n'otu egwu bọọlụ Stationery Stores FC nakwa Femo Scorpions.

Ebe foto si, Getty Images