Akụkọ Dị Mkpa 6 Ọgọst, 2025
Akụkọ Dị Mkpa 6 Ọgọst, 2025
Lee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Onye nnọchiteanya Onyeisiala mba Amerịka bụ Steve Witkoff ezutela onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin na Kremlin dịka oge Donald Trump nyere Mosko iji kwenye na nkwụsị agha Yukren na-abịa nso.
- Cheta na Onyeisiala Trump kwuru na Amerịka nwereike machibido Rọshịa maọbụ ndị niile na-azụ ha ahịa ọ bụrụ na o meghị ihe ọbụla iji kwụsị "agha jọgburu onwe ya" na Yukren.
- Gọọmenti Enugwu steeti akpụpụla Obi Levi Obieze a maara dịka Ozo Ezeani, bụ onye a na-enyo enyo na ọ bụ onye ọgwụ ego n'Ụlọikpe Majie dị n'Enugu North n'ụbọchị Wenezde 6 Ọgọst, 2025.
- Akụkọ kwuru na a nwụchiri nwaamadị ahụ n'ihi ebubo igbu ma lie ọtụtụ mmadụ n'ụlọ ya dị n'obodo Umuojo, Isiagu Ụmụba nke okpuru ọchịchị Ezeagu n'Enugwu steeti.
Gaa naWhatsapp Chanelụanyị ka ị gụọ akụkọ niile na-eme n'ụwa.





