You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akwamozu Popu Francis: Ntuziaka dị na foto na usoro olili ya
- Onye dere ya, By Laura Gozzi and the Visual Journalism team
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Akwamozu Popu Francis ga-adị mfe karịa nke ndị Popu gara aga n'ihi ntụziaka ndị ya onwe ya nyere.
Mana dịka Onyeisi obodo na onyendu ihe karịrị otu ijeri ndị ụka Katọlik mbaụwa niile, ọ ghaghị ịbụ mmemme na ọdịnaala mmadụ niile ga-akpụ n'ọnụ.
Ọnwụ ya adọtala ọtụtụ ndị a ma ama, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na puku kwuru puku ndị na-eso ụzọ ya na Vatịkan iji kwanyere ya ugwu ikpeazụ.
Kedụ oge akwamozu ahụ ga-amalite?
Ndị Archbishọpụ na ndị Bishọpụ ga-amalite izukọ mgbe ọ ga-eji ọkara gaa elekere asatọ nke ụtụtụ na mpaghara Constantine Wing, nke bụ ụzọ mbata dị na ncherịtaihu St Peter's Basilica.
N'otu oge ahụ, ndị Ụkọchukwu ụka Katọlik ga-ezukọ na St Peter's Square.
Ọkara elekere gaa, ya bụ mgbe ọ ga-akụ elekere itoolu nke ụtụtụ, ndị nna ụka Ọtọdọs na ndị Kadịnal ga-ezukọ n'ụlọekpere Saint Sebastian Chapel dị n'ime basilica, ebe a tọgbọrọ ozu Popu John Paul II.
Ha ga-azọrọ njem akwamozu dubata akpati ozu Popu, bụ nke dọọrọ abalị anọ n'etiti St Peter's Basilica.
Akwamozu ahụ ga-amalite n'elekere iri nke ụtụtụ, mgbe a ga-adọba akpati ozu ahụ n'oghere dị n'ihu St Peter's Basilica. Onye ga-anọ n'isi ụka ahụ ga-abụ onyeisi Kọleji ndị Kadịnal bụ Giovanni Battista Re.
Ndị ọbịa na ndị a na-akwanyere ugwu ga-anọ ọdụ n'akụkụ basilica na akpati ozu ebe puku kwuru puku ndị Ụkọchukwu ọzọ na ọhanaeze ga-anọ gburugburu St Peter's Square, dịka e siri mee ya n'oge akwamozu Popu Benedict XVI e gosiri n'okpuru.
A ga-apịachi ụka site n'ikpere Popu Francis ekpere na ịranye ya n'aka Chineke.
Nke a ga-abụ mmalite iru uju ụbọchị itoolu a kpọrọ "Novemdiales" ya na missa a ga-ahazi kwa ụbọchị na ncheta ya.
Olee ndị ga-aga ya?
Ndị isi na-atụ anya opekatampe ọha mmadụ ruru narị puku abụọ na iri ise (250,000) ịga akwamozu ahụ tinyere ndị isi obodo maọbụ ndị isiala ruru otu narị na iri asaa (170).
Prince William ga-anọchiteanya Eze Charles III, etu Prince Wales siri nọchiteanya Ezenwaanyị Elizabeth II n'oge akwamozu Popu John Paul II n'afọ 2005.
Ndị isi obodo ndị ọzọ na ndị Eze kwuru na ha ga-aga gụnyere Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump, Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron, Eze ndị Spen bụ Felipe VI na Lọọlọ Letizia nakwa Onyeisiala Brazịl bụ Luiz Inácio Lula da Silva
Kedụ ka ị ga-esi mata onye bụ Bishọpụ maọbụ Kadịnal
A ga-enwekwa ọtụtụ ndị Ụkọchukwu, dịka ndị ọbụla n'ime ha ga-enwe uwe njirimara ha maka ụka akwamozu ahụ.
Maka ndị Bishọpụ na Archbishọpụ, uwe njirimara ha maka akwamozu ahụ gụnyere alb, uwe mwụda ọcha e ji eriri ọdịnaala a kpọrọ cinture kee, amice, akwa mkpirisi e ji ekpuchi olu, na uwe mwụda na-acha ọbara ọbara iji kwanyere Popu ugwu. N'ikpeazụ, ha na-ekpu okpu ọcha n'isi.
Ndị Kadịnal na-eyikwa ụdị akwa ahụ mana ihe e ji a mata ha bụ okpu damask ha nke na-acha ka mmiri ara.
Ndụ Ụkọchukwu na-eyi uwe mwụda dị mfe ma were akwa na-acha ọbara ọbara toro ogologo a kpọrọ "red stole" kpuchie uwe mwụda ha.
Ndị ndu maọbụ ndị nna ụka Ọtọdọs ga-eyikwa ụdịrị uwe mwụda nke ha dabere n'ọdịnaala ha.
Kedụ ka Popu Francis siri gbanwee ọdịnaala?
A hazichaa ụka, a ga-eburu ozu Popu e tinyere n'uwe mwụda na-acha ọbara ọbara nakwa damask na okpu na-acha ka ọlaedo gawa basilica nke Santa Maria Maggiore dị na Rome maka olili. Ọ ga-abụ Popu mbụ a na-agaghị eli na Vatịkan ewezuga Leo XIII onye nwụrụ n'afọ 1903.
Dabere n'ọdịnaala, e kwesịrị itinye ozu Popu n'ime akpati dị ogogo atọ nke e ji cypress, lead na oak rụọ n'ime otu mkpụrụ ụbọchi tupu e lie ya.
Akpati cypress na-egosi mweda onwe n'ala na ọnwụ, nke oak na-egosi nsọpụrụ na ike ebe akpati nke lead bụ iji chekwaa ozu ka a ghara iji ya gwuo egwu.
Ka o sinadị, ọ bụ n'afọ gara aga ka Popu Francis rịọrọ ka e jiri igbe osisi dị mfe e jiri gbamgbam kụọ ime ya lie ya.
Nke a bụ igbe a ga-ahụ n'akwamozu ahụ.