Kedụ etu e si ahọpụta Popu ọhụrụ?

    • Onye dere ya, Jeremy Howell
    • Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Onye nwereike ịbụ Popu, kedụ ndị ga-ahọpụta ya?

A na-ahọpụta Popu ọhụrụ mgbe ọbụla onye nọ n'ọkwa ahụ nwụrụ maọbụ mgbe ọ rịturu n'ọkwa sị na ya arụkwaghị ọzọ (Dịka Popu Benedict XVI siri kwuo na ya arụkwaghị n'afọ 2013).

Onye nọchiri anya ya a bụrụzie onyeisi ụka Katọlik ma nwekwa ọkwa kachasị n'ụka ahụ nke a kpọrọ "Supreme Pontiff" n'olu bekee.

Nwoke ọbụla e mere baptizim nwereike ịbụ Popu ma a tụnyere ya.

Mana ndị Kadịnal na-ahọpụtakarị ndị na-anọ n'ọkwa ahụ.

Ọ bụkwa ha na-eji ntulịaka ahọpụta Popu ọhụrụ.

Kemgbe Febuwarị 19, 2025 ka e nwere ndị Kadịnal ruru mmadụ 252 n'ụwa niile mana ha niile bụkwa ndị bishọpụ. Ka o sinadị, ọ bụ naanị ndị na-erubeghị afọ 80 bụ ndị nwereike ịtụ vootu ma họpụta Popu ọhụrụ.

A na-emekarị ka ndị kadịnal ga-atụ vootu a ga-eji họpụta Popu dịrị naanị 120, mana ugbua e nwere ndị kadịnal ọnụọgụgụ ha dị 135 bụ ndị tozuru ịbụ Popu. (Popu Francis wepụtara Kadịnal 21 ọhụrụ gbakwụnye ya na nke e nwere n'oge ahụ na Desemba 2024).

Kedụ ka ndị Kadịnal si ahọpụta Popu Ohụrụ

N'oge a chọrọ ịhọpụta Popu ọhụrụ, a na-akpọ ndị Kadịnal niile oku ka ha bịa na Vatican dị na Rome ime ihe a na-akpọ "papal conclave". Nke a bụ usoro ntuliaka dị adị kemgbe afọ 800 garaaga.

N'ụbọchị nke mbụ na conclave ka a ga-aka ụka n'ime Peter's Basilica. E mechaa, ha agbakọọ na ụlọekpere Vatikan Sistine. Ọ bụ mgbe ahụ ka mmadụ niile ga-esi ebe ahụ pụọ hapụ naanị ndị Kadịnal n'ime ya.

Bido n'oge ahụ, ndị Kadịna ga-anọ na vatịkan ruo oge ha họpụtara Popu ọhụrụ. (Mara na "Conclave" pụtara "key" n'asụsụ Bekee maọbụ "igodo" n'asụsụ Igbo

N'ụbọchị nke mbụ ndị kadịnal ga-anọ na 'conclave' ka ha ga-atụ vootu mbụ n'ụlọekpere Sistine.

Bido n'ụbọchị nke abụọ gawa, ha ga-eme ntuliaka ugboro abụọ n'ụtụtụ, ugboro abụọ n'ehihe ruo oge ndị na-azọ ya pụchara, ọ fọdụ naanị otu onye bụ onye a ga-ahọpụta dịka Popu.

N'akwụkwọ ịtụ vootu, ndị kadịnal ga-ede aha onye ha chọrọ ka ọ bụrụ Popu. Ha ga-ede ya n'uzo zoro ezo ma mee ka onye ọzọ hara ị mara onye ha tụnyeere. A na-enye ha ndụmọdụ ka ha ghara ide aha onye ha chọrọ ịhọpụta etu a ga-esi chọpụta onye dere ya.

Ọ bụrụ ma ha nọọ abalị abụọ na conlave na-enweghị onye a họpụtara, ha ga-ejiri abalị nke atọ mee ekpere. Ntuliaka ga-ebido n'abalị nke anọ.

Ọnụọgụ vootu e ji ahọpụta Popu ọhụrụ ga-abụ ọkara abụọ n'ime atọ ndị kadịnal tụrụ vootu ahụ.

Usoro ịhọpụta Popu ọhụrụ nwereike iwere ọtụtụ ụbọchị, maọbụ ọtụtụ izuụka.

Gịnị na-eme n'ime 'papal Conclave'?

A na-eme Conclave (igodo) n'ụzọ a na-akpachara anya. Ndị kadịnal agaghị apụ na Vatịkan maọbụ gee redịọ, kirie onyonyoo, gụọ akụkọ akwụkwọ, zaa oku ekwentị maọbụ ha na mmadụ ọzọ enwee mkparịtaụka.

Enweghị onye a na-ekwe banye n'ime conclave na-abụghị ndị dọkịta, ndị na-ehicha ụlọ na ndị ọzọ ṅụrụ iyi nzuzo.

Mgbe a na-eme ntuliaka, ndị kadịnal na-atụ vootu na ndị kadịnal na-enweghị ikike ịtụ vootu na-akpa nkata banyere mkpa ọ dị na a họputara otu onye maọbụ onye nke ọzọ mana ha enweghị ikike ịchụ nta vootu maọbụ gwa ọhanaeze onye ha chọrọ.

Vatịkan na-ekwu na ọ bụ mmụọ nsọ na-edu ndị kadịnal n'agbenyeghị na ụzọ e si achọta nkwado nye onye na-azọ ọkwa Popu bụ nnukwu usoro ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ugboro abụọ ahụ a na-atụ vootu n'igodo (Conclave) ka a na-agba akwụkwọ ntuliaka ọkụ nke ndị nọ na Vatịkan na-ahụ anwụrụ ya si na mpio anwụrụ (chimney) dị n'ụlọekpere Sistine apụta.

A na-etinye agba ojii maọbụ nke ọcha nke na-eme ka anwụrụ ahụ chaa etu o si acha. Anwụrụ ojii bụ na e wepụtabeghị Popu ọhụrụ ebe anwụrụ ọcha na-egosi na a họpụtala Popu ọhụrụ.

Gịnị ga-eme mgbe a họpụtara Popu ọhụrụ?

Ọ bụrụ na a họpụta Popu ọhụrụ, a na-aju ya "ị nabatara nhọpụta gị dịka onyeisi kachasị n'ụka?"

Oge ahụ ka ọ ga-ekwu aha a ga-akpọ ya dịka Popu ma bụrụkwa mgbe a ga-enye ya mkpara ọrụ ya.

Ndị kadịnal niile ga-ekwe ya nkwa nrubeisi.

Ha ga-anọ n'ihu ụlọ St Pịta Basilika gwa igwe mmadụ na "anyị enweela Popu".

Ọ bụ oge ahụ ka Popu ọhụrụ ahụ ga-apụta gwa ha okwu ma nye ngozi dịka ọdịnaala ụka Katọlik si dị.

E mechaa, egosi Popu ọhụrụ etu e si tụọ vootu bido n'ụbọchị nke mbụ ruo mgbe a họpụtara ya. Mgbe ahụ ka a ga-amachi ya ma tinye ndekọ ahụ n'ọba akwụkwọ dị na Vatịkan. Enweghị onye ga-ahụ akwụkwọ ahụ ọzọ ewezuga mgbe Poopu nyere ikike ka e wepụta ya.