You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee foto ndụ Pope Francis
Pope Francis anwụọla dịka ọ gbara afọ 88. Ọ bụ onyeisi Ụka Katọlik ruo ihe karịrị afọ iri.
Oge ikpeazụ ọhanaeze hụrụ ya bụ ụbọchị Sọnde 20 Eprel, 2025 na balkọni St Peter's Basilica dị na Vatịkan oge emume Easter Sọnde. Ọ gwara ọtụtụ ndị mmadụ gbakọr ebe ahụ "Easter ọma nụ".
Pope Francis nọ n'igwe oche ya, feere ọtụtụ ndị mmadụ na-eti mkpu ọnụ na St Peter's Square aka na foto a dị n'ala.
Oge a họpụtara Kardịnal Jorge Mario Bergoglio dịka onye ga-anọchi Benedict XVI dịka Pope n'afọ 2013, ọ bụ dịka onye si esi.
Nhọpụta ya bụ ihe ịtụnanya - Popu Francis bụ Popu mbụ si mpaghara Latin Amerịka ma bụrụ onye Jesuit mbụ bụrụ onyeisi Ụka Katọlik.
Lee anya ka anyị gosi gị foto ufọdụ pụtara ihe na ndụ ya.
A mụrụ Jorge Mario Bergoglio 17 Disemba 1936, na Buenos Aires, mba Argentina, o mesiri bụrụ onyendu ụka kachasị na mbaụwa.
Ọ bụ dị ọkpara ma nwee ụmụnne anọ. Ndụ mbụ ya bụ nke kwụrụ ọtọ maka nkwenye okwukwe ya dịka ọ na-eto dịka n'ezinaụlọ si agbụrụ mba Itali.
Ka e chiri ya ụkọchukwu n'afọ 1969, Bergoglio malitere ịgbago n'ọkwa dịka onye Jesuit, ma bụrụ onye isi Jesuit mba Argentina n'afọ 1973.
N'afọ 1998, e chiri Bergoglio Archibishọpụ Buenos Aires.
O bu ụkọchukwu a mara nwere obi umeala, ma na-elekọta ndị ogbenye. Ọ chọghị ibi na nnukwu ụlọ. Ọ bụ ụgbọala ọha ka o ji eme njem. Ya na ndị obodo na-enwe mmekọ, ọ bụghị onye na-eme mpako.
Popu John Paul II họpụtara dịka dịka Kadịnal n'afọ 2001 ma nye ya ọkwa na Curia ngalaba ọrụ nke Ụka Katọlik.
Na Maachị 13, 2013, Popu Francis pụtara ihe na balkọni St Peter's Square..
O yi uwe ọcha ma na-aza aha ọhụrụ iji kwanyere St Francis nke Assisi ugwu onye a mara dịka onye na-echekwa gburugburu, anụmanụ, nakwa nnụnụ. Ọ malitere ntọala inwe obi ebere, obi umeala nakwa ikpe ziri ezi.
Kemgbe Gregory III si mba Syria nwụrụ na 741, enwebeghị Bishọpụ ọzọ na-abụghị onye Yurop na Rome.
A tụrụ anya na ọzụzụ Popu ọhụrụ a ga-enweta mgbanwe ma wulite ọnọdụ Vatịkan nakwa ọrụ mishọn ha.
Na mmalite, Popu Francis mere ka o doo anya na ọchịchị ya ga-agbado ụkwụ na ndụ umeala na ọrụ. "A chọrọ m ụka ga-anabata ndị ogbenye," bụ okwu e ji mara ya.
Dịka Popu, ọ gbara mbọ inweta enyemaka na na udo n'esemokwu dị n'etiti ụka ọtọdọks na ụka Katọlik
Francis na ndị ụka Anglịkan, Lutherans na Methodist rụrụ ọrụ ebe ọ rịọrọ ndị isiala Izrel na Palestinia ka ha sonyere ya n'ekpere maka udo.
Ọchịchị ya dịka onyeisi ụka katọlik nwere ihe cheere ya aka mgba.
Ụfọdụ ndị kwenyere na ntọala na omenala Ụka Katọlik katọrọ ya maka atụmatụ ya ụfọdụ ma bo ya ebubo na ọ chọrọ ịgbanwe omenala na nkwenye Ụka Katọlik.
Oge a jụrụ maka nwoke na-edina nwoke maọbụ nwaanyị na-edina nwaanyị, o kwuru na "Ọ dịghị ya n'aka ịma mmadụ ọbụla ikpe".
Nsogbu kachasị ọchịchị nwere bụ maka ebubo e boro nke kwuru na ọ chọghị imegide mmetọ ahụ ụmụaka.
Popu mapụtara mmemme Special Jubilee Year of Mercy nke malitere na Disemba 82015.
Oge a bụ oge e ji emepe ọnụụzọ Basilica dị na Rome nakwa nke St Peter's.
Popu Francis bụ onyeisi Ụka Katọlik mbụ sonyere n'ọgbako G7 Summit e mere n'afọ2024.
Nke a bụ ọgbakọ ndị isiala mbaụwa akụnaụba ha kachasị.
N'okwu ya n'ọgbakọ ahụ, o kwuru maka nsogbu na-echere ọhanaeze aka mgba ọkachị agha Yukren na Gaza.
Na akwụkwọ o dere maka ndụ ya: "My Story Through History", Popu Francis kwuru na ya anaghị atụ egwu ịgba arụkwaghịm dịka onyeisi Ụka Katolik dịka akụkọ malitere ifegharị banyere ọnọdụ ahụike ya.
Na 14 Febụwarị 2025, a nabatara ya n'ụlọọgwụ dịka nnyocha kwuru na o nwere ọrịa bronchitis.
Ọ nọtere aka n'ụlọọgwụ ahụ maka nleta zuru ezu maka ajọ ọnọdụ ahụika ya.
Popu Francis duru ndị Ụka Katọlik na mbaụwa ruru otu ijeri na nde abụọ (1.2 billion) ma nwee ebumnobi inweta udo, obi umeala, ebere na ikpe ziri ezi, nke gosiri na n'agbanyeghị ọkwa dị elu mmadụ nọ na ya, o nwereike ibi ndụ umeala ma nwee ezi mmetụta na ndụ ọhanaeze