You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Francis: Popu si Latin Amerịka onye gbanwere Ụka Katọlik
Popu Francis bụ onye mere ọtụtụ ihe mbụ ma webata mgbanwe na Ụka Katọlik, o wuru ewu n'etiti ndị omenala.
Ọ bụ Popu mbụ si Amerịka maọbụ ndịda nke ụwa. E nwebeghị Popu abụghị onye Yurop kemgbe Gregory III a mụrụ na Syria nwụrụ na 741.
Ọ bụkwa onye otu Jesuit mbụ e tinyere n'ọkwa na St Peter - dịka Ndị Rom na-enyo ndị Jesuit enyo maka akụkọ ihe mere eme.
Popu bu ya ụzọ, Benedict XVI, bụ Popu mbụ lara ezumike nka n'ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 600 na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri, ogige Vatịkan nabatara popu abụọ.
Dịka Kadịnal Bergoglio nke Argentina, ọ karịrị afọ iri asaa mgbe ọ burụ Popu n'afọ 2013.
Ọtụtụ ndị Ụka Katọlik chere na Popu ọhụrụ ga-abụ nwata nwoke.
Bergoglio ewepụtala onwe ya dịka onye na-arịọ ndị na-achọghị mgbanwe nwere echiche ọdịnala banyere mmekọahụ mgbe ọ na-adọta ndị na-eme mgbanwe na nguzo ya na-emesapụ aka n'ikpe ziri ezi nke ọha.
E nwere olile anya na nzụlite ya ga-enyere aka mee ka Vatịkan dịghachi ndụ ma kwalite ozi ya dị nsọ.
Mana n'ime ọchịchị Vatịkan ụfọdụ, mbọ Francis gbara ewete mgbanwe zutere nguzogide na onye bu ya ụzọ, bụ onye nwụrụ na 2022, bụrụ onye na-ewu ewu n'etiti ndị omenala.
O kpebisiri ike ịdị iche
Site n'oge ntuliaka ya, Francis gosiri na ọ ga-eme ihe dị iche. Ọ natara ndị Kadịnal ya n'ụzọ nkịtị na guzoro - kama ịnọdụ n'ocheeze popu.
Na 13 Maachị 2013, Popu Francis pụtara n'elu mbara ihu na-elele ogige St Peter.
Yiri uwe na-acha ọcha, o nwere aha ọhụrụ nke na-asọpụrụ St Francis nke Assisi, onye kwusara ozi ọma narị afọ nke iri na atọ na onye hụrụ anụmanụ n'anya.
O kpebisiri ike ịna-adị umeala n'obi karịa ịdị ebube.
Ọ jụrụ limousine popu ma sie ọnwụ na ya na ndị Kadịnal ndị ọzọ ga na-eso na bọs ala n'ụlọ.
Popu ọhụrụ ahụ gosiri igwe atụrụ ya ruru ijeri 1.2 ezi omume.
O kwuru na ụka daara ogbenye na ndị ogbenye na-amasị ya.
A mụrụ Jorge Mario Bergoglio na Buenos Aires, Argentina, na 17 Disemba 1936 - ọkpara n'ime ụmụaka ise. Nne na nna ya gbapụrụ obodo ha n'Ịtali ka ha gbanarị ihe ọjọọ nke fasizim.
Ọ na-enwe mmasị ịgba egwu tango wee bụrụ onye na-akwado otu egwu bọọlụ obodo ya, San Lorenzo.
O ji ndụ ya gbanarị mgbe ọ nwesịrị nnukwu ọrịa oyi ịbaa, dịka a na-arụ ọrụ iji wepụ akụkụ nke ngụgụ ya. Nke nwereike ime ka o bute ọrịa n'oge ndụ ya niile.
Dịka agadi nwoke ọ na-enwekwa mgbu n'ikpere aka nri ya, nke ọ kọwara dịka "mmechuihu nke anụ ahụ"
Mgbe Bergoglio na-eto eto, ọ rụrụ ọrụ n'ụlọ oriri na nkwari na ihicha ala, tupu ọ gụchaa akwụkwọ dịka onye kemist.
N'otu ụlọọrụ mmepụta ihe, ya na Esther Ballestrino rụkọrọ ọrụ, bụ́ onye busoro ọchịchị aka ike nke Argentina agha. A tara ya ahụhụ ma ahụghị ozu ya anya.
Ọ bụrụ onye Jesuit, mụọ nkà ihe ọmụma ma ọ kụziere ihe gbasara akwụkwọ na akparamaagwa 'literature na psychology'. E chiri ya ụkọchukwu mgbe ọ gafere afọ iri, o nwetere nkwalite ngwa ngwa, ghọọ onyeisi obodo maka Argentina na 1973.
Accusations
Ụfọdụ chere na o meghị nke ọma imegide ndị ọchịagha nke ọchịchị obi ọjọọ nke Argentina.
E boro ya ebubo na o tinyere aka mgbe ndịagha tọọrọ ndị ụkọchukwu abụọ n'oge Agha Unyi nke Argentina, bụ́ oge a tara ọtụtụ puku mmadụ ahụhụ maọbụ gbuo, maọbụ tọọrọ ha site na 1976 ruo 1983.
A tara ndị ụkọchukwu abụọ ahụ ahụhụ mana e mechara hụ ha na ndụ - e nyere ha ọgwụ mere ha amaghị onwe ha ma ọ fọrọ ntakịrị ka ha gbara ọtọ.
E boro Bergoglio ebubo na ọ gwaghị ndị ọchịchị na Chọọchị kwadoro ọrụ ha na ógbè ndị dara ogbenye.
E kwuru na ọ bụ eziokwu na-agbahapụla ha ka ha wụọ n'aka ndịagha. Ọ bụ ebubo ọ gọrọ n'ezoghị ọnụ, na-ekwusi ike na ọ rụrụ ọrụ n'azụ iji tọhapụ ha.
Mgbe a jụrụ ya ihe mere o jeghị kwupụta ya, ọ kwuru na o siri ike nke ukwu.
N'eziokwu - n'afọ 36 - ọ hụtara onwe ya n'ọgbaaghara nke gaara anwale onye ndu kachasị mara ihe. O nyere ọtụtụ ndị gbara mbọ ịgbapụ ná mba ahụ aka.
Ya na ndị Jesuit ibe ya nwekwara esemokwu, bụ ndị kwenyere na Bergoglio enweghị mmasị na nkà mmụta okpukpe nnwere onwe - njikọ nke echiche Ndị Kraịst na sociology Marxist nke chọrọ ịkwatu ikpe na-ezighị ezi.
Ya, n'ụzọ dị iche, họọrọ iji nwayọ kwado ndị ọrụ ụka.
Mgbe ụfọdụ, njikọ ahụ na-adabere na nkewa. Mgbe ọ chọrọ ka ọ bụrụ Popu na 2005 ụfọdụ ndị Jesuit kuru ume.
Nwoke enwghị oke ọchụchọ
A họpụtara ya dịka Auxiliary Bishọp nke Buenos Aires na 1992 tupu ọ bụrụ Archbishop.
Popu John Paul II mere ya kadịnal na 2001 ma o weghaara ọkwa n'ọrụ ụka na Curia.
Ọ zụlitere aha ya dịka onye oke ọchụchọ adịghị amasị, na-ezere ọtụtụ ọnyà nke nnukwu onye ụkọchukwu.
Ọ na-anọ karị ebe ndị obenye na-anọ n'ụgbọelu ma ọ họrọ iyi uwe ojii nke onye ụkọchukwu - karịa nke uhie na odo odo nke ọnọdụ ọhụrụ ya.
N'ozi ọma ya, ọ na-akpọ oku maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma katọọ gọọmentị ndị na-egeghị ntị na ndị kasị daa ogbenye n'obodo.
"Anyị bi n'akụkụ ụwa ebe mmadụ a ahaghị ịha," ka o kwuru.
Dịka popu, ọ gbara mbọ idozi esemokwu nke ọtụtụ puku afọ dị n'etiti Chọọchị Ọtọdọks nke ebe Ọwụwa Anyanwụ.
Na nke mbụ, kemgbe Great Schism nke 1054, Patriarch nke Constantinople gara echichi nke Bishọp ọhụrụ nke Rom.
Francis na ndị Anglịkan, Lutherans na Methodist rụkọrọ ọrụ ma mee ka ndị isi ala Izrel na ndị Palestine soro ya kpee ekpere maka udo.
Mgbe ndịagha Alakụba wakposịrị, o kwuru na ọ bụghị ihe ziri ezi iji mata Islam na ime ihe ike. "Ọ bụrụ na m na-ekwu maka ime ihe ike ndị Alakụba, m ga-ekwukwa banyere ime ihe ike ndị ụka Katọlik," ka o kwuru.
Na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ jikọtara onwe ya na nkwupụta gọọmentị Argentine na Falklands, na-agwa otu ọrụ: "Anyị na-abịa ikpe ekpere maka ndị dara ada, ụmụ aka obodo ndị na-agbalịsi ike ichebe nne ha, ala nna, iji nweta obodo nke ha."
Dịka onye Latin Amerịka na-asụ Spanish, o nyere ọrụ dị oke mkpa dịka onye ogbugbo mgbe gọọmentị Amerịka gbadoro ụkwụ n'akụkọ ihe mere eme na mmekota ha na Cuba.
O siri ike iche na Popu si na Yurop ga-arụ ọrụ nhazị mmekọta mba dị egwu dị otú ahụ.
Onye omenala
Na nkụzi ụka ya niile, Popu Francis bụ onye omenala.
Ọ bụ "onye na-adịghị agbanwe agbanwe dịka Popu John Paul II ... na igbu onye orịa agaghị agwọta agwọta, ntaramahụhụ ọnwụ, ite ime, ikike nke ndụ, ikike mmadụ na alụghị di nke ndị ụkọchukwu", ka Monsignor Osvaldo Musto, onye ya na ya nọ na seminarị siri kwuo.
O kwuru na Ụka kwesịrị ịna-anabata ndị mmadụ n'agbanyeghị ụdị agụụ mmekọahụ ha na-enwe, mana ọ siri ọnwụ na mmekọ nwoke na nwaanyị bụ ụdị ịkpa oke megide ụmụaka.
E nwere okwu na-akwado ụfọdụ ụdị mmekọ nwoke na nwaanyị maka ndị mmekọ nwoke na nwaanyị, mana Francis akwadoghị ịkpọ ya alụmdi na nwunye. Nke a, ka o kwuru, ga-abụ "mgbalị ibibi atụmatụ Chineke".
N'oge na-adịghị anya mgbe ọ ghọrọ Popu na 2013, o sonyere ngagharị e mere mgbochi ite ime na Rom - na-akpọ maka ikike nke nwa e bu n'afọ "site n'oge a tụrụ ime".
Ọ kpọkuru ndị ọkachamara n'ọrịa ụmụ nwaanyị ka ha kpọkuo akọ na uche ha ma ziga ozi na Ireland - ka ọ na-eme ntuliaka na isiokwu a - na-arịọ ndị mmadụ ebe ahụ ka ha chebe ndị na-adịghị ike.
Ọ guzogidere echichi ụmụ nwaanyị, ma kwupụta na Popu John Paul nke Abụọ ewepụla ya n'ihe a na-eme.
Ọ bụ ezie na ọ dịka na mbụ o kwere ka ejiri ọgwụ mgbochi ime iji gbochie ọrịa, o toro nkuzi Paul nke Isii banyere isiokwu a - nke dọrọ aka ná ntị na ọ nwere ike ibelata ụmụ nwaanyị ka ha bụrụ ngwá ọrụ afọ ojuju nwoke.
N'afọ 2015, Popu Francis gwara ndị na-ege ntị na Philippines na mgbochi afọ ime gụnyere "mbibi ezinụlọ site na enweghị ụmụaka". Ọ bụghị ụmụaka na-anọghị ka ọ hụrụ na ọ na-emebi ihe, kama ọ bụ mkpebi siri ike iji zere ha.
Ibu agha maka mmetọ ụmụaka
Otu ihe ịma aka kasịnụ e nwere n'ebe ọ nọ n'ọkwa ya sitere n'akụkụ abụọ: site n'aka ndị boro ya ebubo na ọ akwụsịghị imetọ ụmụaka nakwa site n'aka ndị nkatọ na-achọghị mgbanwe bụ́ ndị chere na ọ na-emebi okwukwe. Karịsịa, ha bu n'uche ọ ga-ekwe ka ndị Katọlik gbara alụkwaghịm na ndị lụgharịrị di na nwunye nara olili nsọ.
Ụfọdọ ndị jikwa okwu gbasara mmetọ ụmụaka dị a ngwa ọgụ n'ime mgbasa ozi ogologo oge ha na-agba.
N'Ọgọst 2018, Achịbishọp Carlo Maria Viganò, onye bụbu Apostolic Nuncio n'Amerịka, bipụtara akwụkwọ nkwupụta agha. O wepụtara akwụkwọ ozi na-akọwa usoro ịdọ aka ná ntị e nyere Vatịkan banyere omume nke onye bụbu Kadịnal, Thomas McCarrick.
E boro ebubo na McCarrick bụbu onye na-emegbu ndị okenye na ndị na-eto eto. Popu, Archbishọp Viganò kwuru, mere ya ka ọ bụrụ "onye kansụl a tụkwasịrị obi" n'agbanyeghị na ọ matara na ọ bụ onye nrụrụ aka. O kwuru na Popu Francis kwesịrị ịgba arụkwaghịm.
Archbishọp ahụ kwuru, "njikọ ndị a na-edina ụdị onwe, na-eme ihe n'okpuru nzuzo ma na-ekwu okwu asị... na-anyagbu Ụka dum."
E mechara wepụ McCarrick na February 2019, ka Vatịkan nyochachara ya.
N'oge ọrịa Covid, Francis kagburu mpụta ya mgbe niile n'ogige St Peter Square iji ịkwụsị mgbasa nje ahụ. O kwupụtara na ịgba ọgwụ mgbochi bụ ụlọ dịrị ụwa niile.
N'afọ 2022, ọ bụrụ popu nke mbụ Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ ili onye bụ ya ụzọ mgbe Popu Benedict nwụrụ oge ọ dị afọ 95.
N'agbanyeghị ihe nsogbu ahụike ya nke mere ọ jị ga n'ụlọọgwụ dị iche iche, Popu Francis kwụsịrị ike na-ịkwalite udo zuru ụwa ọnụ site na mkparịtaụka dị n'etiti okpukperechi ndị ọzọ, ya mere na afọ 2023 o mere njem ụka na Saụt Sudan, na-arịọ ndị isi mba ahụ ka ha kwụsị esemokwu.
Ọ gara n'ihu ikatọ ọgụ na esemokwu nọ n'etiti mba Yukren na Rọshịa ma na-arọ ka ha kwụsị ọgụ ha na alụ.
Mgbe nke a mechara ma otu afọ gasịrị, ọ malitere ogologo njem na mba anọ n'ime kontinent abụọ ma kwụsị na Indonisia, Papua New Guinea na Singapọ.
Jorge Mario Bergoglio batara n'ocheeze nke St. Peter ma nwee nkpebisiri ike ịgbanwe ya.
E nwere ụfọdụ ndị chọrọ onye ndu na-emesapụ aka, ndị nkatọ ga-arụtụ aka n'adịghị ike ya maka ibuso agha banyere mmetọ mmekọahụ nke ndị ụkọchukwu. Mana ọ gbanwere ya.
Popu Jorge nwụrụ anwụ họpụtara ihe karịrị ndị kadinal 140 si na mba ndị na-abụghị ndị Yurop. O nyere onye ga-anọchi ya otu Nzukọ-nsọ nke zuru ụwa ọnụ karịa nke o ketara.
Site na ụdị ndụ obiri nke otutu mmadu si na ojuputara na obi umeala, Bergoglio bụ Popu nke jụrụ na ogaghi ebi n'obi Vatịkan Apostolic Palace - nke zuru ezu na Sistine Chapel - kama o biri n'ụlọ ọhụrụ dị n'akụkụ nke Popu John Paul II rụrụ ndị ọbịa.
O kwenyere na ihe ọchọchọ ụka na ụba nke ụwa bi ihe efu, ya mere o ji nye ilu si "ileanya na anumanu ana-akpo peacook, ọ mara oke mma ma ile ya anya n'ihu, mana ile ya anya na azu i ga ahụ nke bụ eziokwu."
O nwekwara olile anya na ya nwere ike ịkwalite Nzukọ-nsọ site n'iwepụ esemokwu n'ime ya, ilekwasị anya na ndị ogbenye na iweghachite Nzukọ-nsọ nye ndị mmadụ.
"Anyị kwesịrị izere ọrịa ime mmụọ nke Ụka nke a kpuchiri n'ụwa nke ya," ka o kwuru obere oge ka e mesịrị ntuliaka ya.