You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Amaghị m ihe a na-akpọ 'arrangee miracle' emetụbeghi m ya mbụ - Ebuka Obi
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara & Kelechi Anozia
- Ndị mere akụkọ a, Reporter & Video Journalist
Onye ozi ọma a ma ama bụ Chukwuebuka Anozie Obi ekwuola na ọ naghị eme ihe ịrịbaama a kpọrọ “Arrangee” kama na Chineke ji ya arụ ọrụ.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwara na ọ bụ oziọma ọ na-agbasa mere aha ya ji ewu ewu na soshal midia nakwa mbaụwa.
N’ihe gbasara nkewa Di na nwunye, ọ gbarụrụ ihu kwuo na ọ bụghị ihe Chukwu kwadoro.
Ebuka Obi gara n’ihu kwuo “ana m agba ọgwụ ndị dibia gwọrọ ọkụ, n’ihi na onye ọbụla chọrọ ịbụ nwa Zion ga-ebute ọgwụ ọbụla o nwere n’ụlọ ka m gbaa ya ọkụ tupu ọ zaa nwa Zion n’ezie”
“Ekwusiri m okwu ya ike na onye ọbụla na-abia Zion ga-akwụsị ndụ akwamiko, ịnapụ mmadụ ihe n’ike, ịgwọ ọgwụ na ihe ọjọọ ndị ọzọ.
E nwere onye Ebuka Obi tụrụ mkpọrọ?
Onye oziọma a ma ama bụ Chukwuebuka Anozie Obi ekwuola okwu banyere otu nwoke akụkọ kwuru na ọ tụrụ mkpọrọ maka ikwutọ ya.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọ kọwara ihe niile banyere nwoke ahụ boro ya ebubo ma kwuo na ọ bụ onye amụma ụgha.
Ọ kọwara na ọ bụ eziokwu na ngalaba ụlọụka ya na-ahụ maka ikpe degaara ndị uweojii akwụkwọ mkpesa banyere nwoke ahụ boro ya ebubo, mana a tọhapụla nwoke ahụ kemgbe maka na o mezuru iwu niile dị na ntọhapụ beelu ndị uweojii nyere ya.
Ọ gara n'ihu mee ka o doo anya na ụlọụka ya bụ Zion Prayer Movement Outreach enweghị onye ọbụla ọ tụrụ mkpọrọ ugbua.
Ihe ị kwesịrị ịma maka onye oziọma Ebuka Obi
Onye ozioma Ebuka Obi bụ onye Uburu ihejioffor dị n'Okpuruọchịchị Oru West nke Imo steeti.
O kwuru na ya dị afọ asatọ wee malite ịnụ olu mmụọ nsọ ka ọ na-agwa ya okwu.
Ọ bụzị oge ọgbara afọ iri na abụọ ka o jidere aka n’ebe ntụaja ma kwee nkwa atọ nke mbụ bụ na ya agaghị edina nwaanyị ruo mgbe ọ ga-alụ nwunye, nke abụọ - na ya agaghị elekwasị ego anya, nke atọ - na ọ gaghị apụ n'ụka Katọlik.
Nkwa ndị a ka o kwuru na o dobere ya rue ugbo a nke mere ndị na-eso ya jiri dị nde kwụrụ nde na Naijiria nakwa mbaụwa ndị ọzọ.
Ọ malitere Ekpere amụma ya a kpọrọ Zion Ministry n'afọ 2009.
Tupu ọ malite guzobe ekpere ahụ, ọ bụ onye na-azụ ahịa akụrụngwa latrik n'Idumota Lagos.
Dika o siri kọwaa, n’afọ 2009 ka mmụọ nsọ gwara ya kpọchie ụlọahịa ya gazie buru akwụkwọ nsọ ma na-agbasa ozioma.
O kwuru na ọtụtụ amụma ọ na-ebu nke e ji akatọ ya bụ ihe mmụọ nsọ Chukwu gwara ya kwuo.
Ebuka Obi kwuru na ọ gaghị ụlọakwụkwọ ebe a na-amụ akwụkwọ nsọ maọbụ ebu amụma kama na ọ malitere ime ihe amụmụ mgbe ọ dị afọ asatọ.