A kwụsịla Fada ọrụ maka agbamakwụkwọ nzuzo n'ụlọụka Pastor Jerry Eze

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dayosis ụka Katọlik na Warri, Delta steeti akwụsịla Rev. Fr Daniel Okanatotor Oghenerukevwe ọrụ n'ihi ebubo ịlụ nwaanyị na mba Amerịka.

E kpughere nke a n'ozi ụlọụka ahụ jiri kwụsị ya ọrụ bụ nke ha bipụtara n'ụbọchị Tọzde 16 Jenụwarị 2025.

Ndị jikọrọ aka tinye aka n'ozi ahụ gụnyere Rt. Rev. Anthony Ovayero Ewherido bụ Bishọpụ ụka Katọlik na Warri nakwa Very Rev. Fr. Clement Abobo bụ Chancellor/Notary.

Dayọsis ahụ boro ebubo na Fada Oghenerukevwe na nwunye ya bụ Dora Chichah gbara akwụkwọ n'ụlọụka Streams of Joy Church dị na Dallas mba Amerịka n'abalị 29 Disemba 2024.

Dịka ya bụ Dayọsis siri kpughee, Fada Oghenerukevwe nọọrọ n'abalị 30 Nọvemba 2024 rịọ ka e wepụ ya n'ọrụ niile dịịrị ndị e chiri Fada.

N'ihi ya, Dayọsis ahụ gwara ya weta akwụkwọ niile kwesịrị ekwesị iji malite usoro iwepụ aha ya, mana nwaamadị ahụ gara n'ihu gbaa akwụkwọ na-emezughị ihe a chọrọ.

Ka o sinadị, Dayọsis ahụ kwuru na Fada Oghenerukevwe nwere ikike itinye akwụkwọ ka a kagbuo maọbụ lebara mkpebi ahụ anya naanị ma ọ bụrụ na ọ dị njikere ịgbanwe.