You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Popu Francis n'Afrịka: "Oge anyị gere ya ntị e chere m na ọ chọrọ ka e nwee ikpe ziri ezi na DRC"
- Onye dere ya, Beryl Munoko
- Ndị mere akụkọ a, BBC News Africa
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Nwaada Kitsita Ndongo Rachel kọwara ihe mere n'oge Popu Francis bịara njem na mba DR Kongo.
N'okwu Rachel bụ onye ntaakụkọ na Kongo DR. "a nọ m ihe dịka otu nari mịta, mana ezoro m ezo rịbaa gbuo ikpere n'ihu Popu ma rịọ ya ka ọ gozie m"
"Ọ goziri m ma gozie rosary m".
N'afọ 2023 mgbe ọ bịara Kinshasa dị na mba DRC ka Rachael mere ihe ahụ ma kwuo na ihe mere ya jiri mee ihe ahụ bụ nkuzi Popu na-enye.
"Oge anyị gere ya ntị, obi anyị bụ na ọ chọrọ inwetere mba DR Kongo ikpe ziriezi. Ọ maara na ọtụtụ ndị amaala mba DRC anwụọla n'ọgbaaghara"
Ịgbanwe ọkpụkpere ha ma bụrụ onye Katọlik bụ ihe igwe mmadụ na mba ụwa na-eme nke mere ọnụ ọgụgụ ndị Katọlịk jiri eto eto n'ụwa niile.
Ndị Katọlịk ruru nde 272 mana ụmụ Afrịka ruru pasenti iri abụọ n'ime ha dịka ndekọ Vatikan wepụtara n'ikpeazụ si kwuo.
N'afọ 2020, ọkara mmadụ niile bụ ụmụamaala mba Kongo DR bụ ndị na-ekpe ụka Katọlik.
Rodrigue Mumbere bụ otu onye na ndị ahụ. Rodrigue bi n'isi mba ahụ bụ Kinshasa mana ọ bụ onye mpaghara odida ọnwụwa anyanwụ mba ahụ bụ ebe agha na-ada.
"Anyị na-edi agha na-ekweghị akwụsị akwụsị bụ nke mba dị icheiche na Yurop na-akwado. Ọ bụ ihe ịgba ume anyị ịhụ onyeisi ụka Katọlik bụ Popu na-akpọ oku udo na mba anyị"
"E chere m na ndị mba ndị ahụ ọkachasị mba Yurop amaghị ihe na-eme na DR Kongo"
Mumbere na-ekwu maka uru ọbịbịa Popu biara baala mba ha nakwa Afrịka niile.
Ọ bụ ihe karịrị ekpere maka na ụlọụka na-enyere aka na ngaraba dị icheiche gunyere agụmaakwụkwọ, ahụike, na ikpe ziri ezi. Ụlọakwụkwọ ndị Katọlik na-enyere ọtụtụ aka, ebe ndị ọrụ ụka dịka ụkọchukwu na-enyereaka na-eme ka enwe udo n'obodo nakwa n'ọchịchị obodo
Vatican na-ekwu na ndị Afrịka ruru nde asaa abụrụla ndị Katọlik nke mere Afrịka dịka otu n'ime ebe ụka Katọlik kacha etoeto n'ụwa niile.
Naịjirịa na Kenya bụ ndị kacha nwee ndị Katọlik kacha aga-ụka n'ụbọchị ụka n'ụwa niile.E nwekwere ọtụtụ ọnụ ọgụgụ ndị Katọlik na Kongo DR, Kameroon, na Uganda.
Charles Collins bụ onyeisi ndị ntaakụkọ na ụlọọrụ mgbasaozi Crux kọwara na "otu ihe Pope Francis mere bụ ime ka ụwa niile mara na ụka Katọlik kwụrụ chịmchịm n'Afrịka.
Ndị Poopu 10 ikpeazụ nke ụlọụka Katọlik
Ịkwado udo na obodo ịdị n'otu
Popu Francis agaala njem nleta n'Afrịka ugboro anọ na-ekwupụta mkpebi ụka Katọlik dịka ndị na-akwo udo, ịkwụsị ọgbaaghara, na ịnweta ikpe ziri ezi.
Mgbe ndị alakụba Seleka na ndị ụka Antị-Balaka na-anụ ọgụ na Central Afrịkan Repụblịk, Popu Francis gara Bangui bụ isi mba ahụ ma kpọọ oku maka udo.
Fada Stan Chu Ilo bụ onyeisi Pan-African Catholic Theological Network nakwa ọkammụta na World Christianity and African Theology na mahadum DePaul dị na Chicago kwuru na "Popu adịghị ekwu okwu naanị banyere Afrịka, ọ na-agakwa ebe ogbaaghara na-ada n'Afrịka".
Ndị isi ụka Katọlik sokwa na ndị na-akpa maka udo na mba Burkina Faso, Mali na Saụt Sudan, Popu Francis ga kwara na Saụt Sudan n'ọnwa Febuwari afọ 2023.
N'ọnwa Febuwarị afọ a ka Popu mere ka ndị nnọchịtaanya ya gaa hụ onye ndu ndịagha nnupuisi di icheiche nke M23 so na ya aha ya bụ Corneille Nangaa. Njem ahụ nyere aka ka a malita ikpa maka udo.
Ọzọ bụ na ụka Katọlik na-emegide mpụ na nrụrụaka, ọchịchị akaike na ịkpagbu mmadụ.
"Popu Francis so kwa na ndị a maama na-ekwu okwu maka ikike dịara ndị mbịarambịara na mba dị icheiche ma na-ekwu ka a kwụsị imegide ikike dịara ha dịka mmadụ" Fada Ilo kwuru.
Ahuike na Agụmakwụkwọ
Ụlọ ụka Katọlik abụghị naanị n'ihe gbasara agha na ọgbaaghara ka ha n'etinye ọnụ n'Afrịka, ha na ahụkwa maka ahụike na agụmaakwụkwọ.
Ụlọ ụka na-enyere aka aga n'ime obodo na-agwọ ndị ọrịa ọkachasị ebe gọọmenti enweghị ike. O sokwa nyereaka n'oge e nwere nsogbu ahụike dịka ọrịa Ebola.
Katọlik jikwa otu dịka Caritas enyereaka na ngaraba ahụịke na-enyere ndị na-arịa ọrịa nje HIV/AIDS aka.
Katọlik nwere ụlọ akwụkwọ Praịmarị na sekọndarị na-ekuziri ụmụakawụkwọ karịrị puku kwuru puku n'Afrịka.
"Afrịka na-ezipu ụkọchukwu na mpaghara ụwa niile ugbua. E wepụ ụkọchukwu ndị Afrịka, ọtụtụ ụlọ ụka ga-ata ahụhụ ịrụ ọrụ ịgbasa ozi ọma na Yurop nakwa Amerịka".
Mana n'agbanyeghị na ọnụ ọgụgụ ndị Afrịka na-abanye n'ụka katọlik na-arị elu, Afrịka enweghị nnukwu ọkwa na Vatikan.
Kemgbe 2013 ka Popu Francis banyere n'ọkwa, o wepụtara ọkwa Kadịna ruru 19 ọhụrụ. Ọ bụ n'oge ahụ ka mba Cape Verde, CAR na Lesotho nwere kadịna nke mbụ. Mana ugbu a enweghị kadịna si n'Afrịka nọ n'ọkwa dịkastrị (discasteries) bụ nke nyiri nke e nwere na Vatịkan.
Collins kwuru "Ọdịniru ụka Katọlik bụ Afrịka, mana nke a enwebeghị ike ime ka ha soro nwee ọlụ ọkwu na ihe na-eme na Vatịkan. Nke a bụ ihe nwereike ime n'ọdị n'ịhụ"
Fada Ilo na-ekwu na-enweghị ndị nnọchịtaanya n'ọchịchị Vatịkan bụ ihe na-agbagwoju anya n'ọnụ ọgụgụ ndị ụka Katọlik na-agbogo elu.
"N'oge Popu Benedict XVS, Kadịna ndị Afrịka abụọ nọ n'ọkwa 'dicastery'. Mana n'ọchịchị Popu Francis enweghị onye Afrịka nọ n'ọkwa ahụ. Nke a bụ ịla azụ".
Nrụrụaka na Ọchịchị nchigbu
Nrụrụaka na imetọ ụnụahụ so n'ihe iche aka mgba n'agbanyeghị na ụka Katọlik na-eto n'Afrịka .
Ọtụtụ ndị isi ụka ahụ na-ekwu na e kwesiri itinye ihe ga-egbochi ya, mee ka onye ọbụla taa ahụhụ ihe o mere ma na-eme ihe n'ụzọ doro anya bụ nke ga-akwalita ntụkwasị obi ndị mmadụ na-enwe n'ụka Katọlik.
Gọọmenti dị icheiche n'Afrịka na-enwe nsogbu gunyere mpụ na nrụrụaka, oke agụụ, na gọọmentị ọjọọ bụ ihe na-echere ụka Katọlik aka mgba dịka ha na-ekwu okwu akwado ọchịchị onye kwuo uche ya.
Okwu gbasara ikike ndị LGBTQ+ mere ka ụka Katọlik na otu dị icheiche na-enwe nsogbu.
N'ihe niile, a na-eto ụka Katọlik etu ha si akwado ụmụ Afrịka na-eto eto ka ha chekwa mpaghara ụwa ha ma gbaa mbọ ka ndị si mpaghara ụwa ndị ọzọ hara igbanwe etu ha si ebi ndụ.
Fada Ilo kwuru na "Popu ga-esi Afrịka abụhịzị ihe a na-ekwu na ọ ga-eme, ihe a na-ekwu ugbu a bụ kedụ mgbe Afrịka ga-enwepụta Popu? Maka na Afrika abụrụla mpaghara ụka Katọlik nwereike iso na-ekwu ihe ga-eme".