Kedụ etu e si ahọpụta Popu ọhụrụ?

Ndị Kadịnal kwụ n'ahịrị n'ahịrị na-abanye n'ime Sistine Chapụụ dị n'ime papal Conclave bụ ebe ha ga-arọpụta onye ga-anọchịanya Popu John Paul II n'afọ 2005.

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Jeremy Howell
    • Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Onye nwereike ịbụ Popu, kedụ ndị ga-ahọpụta ya?

Ndị kadịnal nọ n'ụka a kara na Saint Peter's Basilica tupuu ha amalite papal Konklave n'afọ 2005

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị kadịnal na-ekpe ekpere na St Peter's Basilica tupuu ha ebido Konklav

A na-ahọpụta Popu ọhụrụ mgbe ọbụla onye nọ n'ọkwa ahụ nwụrụ maọbụ mgbe ọ rịturu n'ọkwa sị na ya arụkwaghị ọzọ (Dịka Popu Benedict XVI siri kwuo na ya arụkwaghị n'afọ 2013).

Onye nọchiri anya ya a bụrụzie onyeisi ụka Katọlik ma nwekwa ọkwa kachasị n'ụka ahụ nke a kpọrọ "Supreme Pontiff" n'olu bekee.

Nwoke ọbụla e mere baptizim nwereike ịbụ Popu ma a tụnyere ya.

Mana ndị Kadịnal na-ahọpụtakarị ndị na-anọ n'ọkwa ahụ.

Ọ bụkwa ha na-eji ntulịaka ahọpụta Popu ọhụrụ.

Kemgbe Febuwarị 19, 2025 ka e nwere ndị Kadịnal ruru mmadụ 252 n'ụwa niile mana ha niile bụkwa ndị bishọpụ. Ka o sinadị, ọ bụ naanị ndị na-erubeghị afọ 80 bụ ndị nwereike ịtụ vootu ma họpụta Popu ọhụrụ.

A na-emekarị ka ndị kadịnal ga-atụ vootu a ga-eji họpụta Popu dịrị naanị 120, mana ugbua e nwere ndị kadịnal ọnụọgụgụ ha dị 135 bụ ndị tozuru ịbụ Popu. (Popu Francis wepụtara Kadịnal 21 ọhụrụ gbakwụnye ya na nke e nwere n'oge ahụ na Desemba 2024).

Kedụ ka ndị Kadịnal si ahọpụta Popu Ohụrụ

Ndị kadịna ụka katọlik nọ na kọnklav ntụliaka n'ime Sistine Chapụụ n'afọ 2005 ka ha rọpụta onye ga-anọchianya Popu John Paul II

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ịtụ vootu maka ị rọpụta Popu ọhụrụ na-aga n'ihu n'ime Sistine Chapụụ

N'oge a chọrọ ịhọpụta Popu ọhụrụ, a na-akpọ ndị Kadịnal niile oku ka ha bịa na Vatican dị na Rome ime ihe a na-akpọ "papal conclave". Nke a bụ usoro ntuliaka dị adị kemgbe afọ 800 garaaga.

N'ụbọchị nke mbụ na conclave ka a ga-aka ụka n'ime Peter's Basilica. E mechaa, ha agbakọọ na ụlọekpere Vatikan Sistine. Ọ bụ mgbe ahụ ka mmadụ niile ga-esi ebe ahụ pụọ hapụ naanị ndị Kadịnal n'ime ya.

Bido n'oge ahụ, ndị Kadịna ga-anọ na vatịkan ruo oge ha họpụtara Popu ọhụrụ. (Mara na "Conclave" pụtara "key" n'asụsụ Bekee maọbụ "igodo" n'asụsụ Igbo

Foto Satalit na-egosi papal seat dị na Vatican, n'ime Rome. ọ gunyere St Peter's Basilica, St Peter's Square nakwa Sistine Chapụụ, nakwa ụlọ obibi na ụlọ ndị ọrụ.

N'ụbọchị nke mbụ ndị kadịnal ga-anọ na 'conclave' ka ha ga-atụ vootu mbụ n'ụlọekpere Sistine.

Bido n'ụbọchị nke abụọ gawa, ha ga-eme ntuliaka ugboro abụọ n'ụtụtụ, ugboro abụọ n'ehihe ruo oge ndị na-azọ ya pụchara, ọ fọdụ naanị otu onye bụ onye a ga-ahọpụta dịka Popu.

N'akwụkwọ ịtụ vootu, ndị kadịnal ga-ede aha onye ha chọrọ ka ọ bụrụ Popu. Ha ga-ede ya n'uzo zoro ezo ma mee ka onye ọzọ hara ị mara onye ha tụnyeere. A na-enye ha ndụmọdụ ka ha ghara ide aha onye ha chọrọ ịhọpụta etu a ga-esi chọpụta onye dere ya.

Ọ bụrụ ma ha nọọ abalị abụọ na conlave na-enweghị onye a họpụtara, ha ga-ejiri abalị nke atọ mee ekpere. Ntuliaka ga-ebido n'abalị nke anọ.

Ọnụọgụ vootu e ji ahọpụta Popu ọhụrụ ga-abụ ọkara abụọ n'ime atọ ndị kadịnal tụrụ vootu ahụ.

Usoro ịhọpụta Popu ọhụrụ nwereike iwere ọtụtụ ụbọchị, maọbụ ọtụtụ izuụka.

Gịnị na-eme n'ime 'papal Conclave'?

Igwe mmadụ gbakọrọ na St Peter's Square na-echere ka a kpọpụta Popu ọhụrụ n'afọ 2013

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'oge 'papal Conclave' igwe mmadụ na-agbakọ chere na St Peter's Square to await the outcome

A na-eme Conclave (igodo) n'ụzọ a na-akpachara anya. Ndị kadịnal agaghị apụ na Vatịkan maọbụ gee redịọ, kirie onyonyoo, gụọ akụkọ akwụkwọ, zaa oku ekwentị maọbụ ha na mmadụ ọzọ enwee mkparịtaụka.

Enweghị onye a na-ekwe banye n'ime conclave na-abụghị ndị dọkịta, ndị na-ehicha ụlọ na ndị ọzọ ṅụrụ iyi nzuzo.

Mgbe a na-eme ntuliaka, ndị kadịnal na-atụ vootu na ndị kadịnal na-enweghị ikike ịtụ vootu na-akpa nkata banyere mkpa ọ dị na a họputara otu onye maọbụ onye nke ọzọ mana ha enweghị ikike ịchụ nta vootu maọbụ gwa ọhanaeze onye ha chọrọ.

Vatịkan na-ekwu na ọ bụ mmụọ nsọ na-edu ndị kadịnal n'agbenyeghị na ụzọ e si achọta nkwado nye onye na-azọ ọkwa Popu bụ nnukwu usoro ndọrọndọrọ ọchịchị.

Anwụrụ ọcha si na chimney dị na Chapụu Sistine apụta na-egosi na a họpụtara Popu ọhụrụ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Anwụrụ ọcha si na chimney dị na Chapụu Sistine apụta na-egosi na a họpụtara Popu ọhụrụ

Ugboro abụọ ahụ a na-atụ vootu n'igodo (Conclave) ka a na-agba akwụkwọ ntuliaka ọkụ nke ndị nọ na Vatịkan na-ahụ anwụrụ ya si na mpio anwụrụ (chimney) dị n'ụlọekpere Sistine apụta.

A na-etinye agba ojii maọbụ nke ọcha nke na-eme ka anwụrụ ahụ chaa etu o si acha. Anwụrụ ojii bụ na e wepụtabeghị Popu ọhụrụ ebe anwụrụ ọcha na-egosi na a họpụtala Popu ọhụrụ.

Gịnị ga-eme mgbe a họpụtara Popu ọhụrụ?

Popu Francis gwara igwe mmadụ okwu na Basilica n'afọ 2013

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A họpụta Pope ọhụrụ, ọ ga-agwa ọhanaeze okwu n'ọgbakọ St Peter

Ọ bụrụ na a họpụta Popu ọhụrụ, a na-aju ya "ị nabatara nhọpụta gị dịka onyeisi kachasị n'ụka?"

Oge ahụ ka ọ ga-ekwu aha a ga-akpọ ya dịka Popu ma bụrụkwa mgbe a ga-enye ya mkpara ọrụ ya.

Ndị kadịnal niile ga-ekwe ya nkwa nrubeisi.

Ha ga-anọ n'ihu ụlọ St Pịta Basilika gwa igwe mmadụ na "anyị enweela Popu".

Ọ bụ oge ahụ ka Popu ọhụrụ ahụ ga-apụta gwa ha okwu ma nye ngozi dịka ọdịnaala ụka Katọlik si dị.

E mechaa, egosi Popu ọhụrụ etu e si tụọ vootu bido n'ụbọchị nke mbụ ruo mgbe a họpụtara ya. Mgbe ahụ ka a ga-amachi ya ma tinye ndekọ ahụ n'ọba akwụkwọ dị na Vatịkan. Enweghị onye ga-ahụ akwụkwọ ahụ ọzọ ewezuga mgbe Poopu nyere ikike ka e wepụta ya.