Popu Francis: Ihe ụmụafọ Naịjirịa kwuru maka ọnwụ onyeisi ụka Katọlik

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Kemgbe Onyeisi ụka Katọlik n'ụwa niile Popu Francis nwụrụ n'ụbọchị Mọnde 21 Eprel 2025, ụmụ Naịjirịa ọkachasị ndị a ma ama na ndị okpukperechi ụka Katọlik na-aga n'ihu na-ewepụta ozi nkwanye ugwu banyere ndụ ya.

Vatịkan kwuru na Popu nwụrụ n'ihi ọrịa mkpọnwụahụ na mmụọ ịda mba nke na-esote ya mgbe ọ dị afọ iri asatọ na asatọ (88).

Ọ nwụrụ otu ụbọchị dịka ọ pụtachara n'ogigi St Peter Square ịgwa ọtụtụ puku ndị na-efe ofufe, Ista ọma.

Ihe Ngozi Okonjo-Iweala kwuru

Okonjo-Iweala bụ onyeisi oche nke World Trade Organisation kwuru na ọnwụ Popu Francis wutere ya nke ukwuu.

Ọ kọwaara ọnwụ ya dịka nnukwu ihe na ndụ ndị na-eso Ụzọ Kraịst, ọha niile na akụ na ụba ụwa nile.

Ọ gara n'ihu kwuo n'ọnwụ Popu bụ nnukwu ihe n'etiti ndị otu the Zayed Award for Human Fraternity nke Popu na Grand Imam Ahmed Al Tayeb, na-akwado.

Ihe Akinwumi Adeshina kwuru

Adeshina bụ onyeisi African Development Bank kwuru na ọnwụ Popu wutere ya nke ukwuu.

"Ọ bụ onye ndu nwere obiọma, nwee ọmịiko na ịhụnanya, o nwere obi mmadụ. O lebara anya nke ukwuu maka ịda ogbenye zuru ụwa ọnụ na ihe banyere ahaghị nha anya nke ụwa. Nnukwu mmadụ efunarịrị ụwa; isi iyi nke mkpalite mụọ."

O kpere ekpere ka nkpuru-obi ya zuru ike n'udo.

Lee ihe Peter Obi kwuru maka Popu Francis

Peter Obi bụ onye zọrọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na Labour Party n'afọ 2023 kwuru na o nwere oke mwute mgbe o nwetara ozi gbasara ọnwu nke Nna Nsọ, Popu Francis.

O kwuru na ọnwụ ya bụ njedebe nke otu oge na nduzi ime mmụọ na nke omume nke Ụka Katọlik na ụwa dum.

O bi kwuru: "N'oge ndụ ya niile na oge pontificate - oge nke m nwere ohere izute ya ugboro atọ - Popu Francis nwere àgwà ọma nke okwukwe, olileanya na ọmịiko.

"O ji obi umeala duo, jiri amamihe kwuo okwu, jirikwa obi ike mee omume. Ọ na-agbasi mbọ ike mgbe niile ịdọta ụmụ mmadụ nso n'echiche nke udo, ikpe ziri ezi na ịhụnanya."

O kwukwara na Popu nwere obi ebere ebe ndị ogbenye nọọ, nkwado siri ike ọ na-akwado maka idu ndú omume, na ịgbachitere ugwu mmadụ mere ka ndị mmadụ nọ na mba niile nwee mmasị na ya.

O kwuru na dịka onye otu Scholas Occurrences Foundation nke Popu Francis chọpụtara, na ya nwere nkwenye n'agụmakwụkwọ, mkparịtaụka, na ike ndị ntorobịa dịka ngwa dị mkpa maka iwulite ụwa ziri ezi na ọmịiko.

Ọkankụzi Joy Ezeilo

Ọkankụzi Joy Ezeilo kwuru na Popu Francis bụ onye nwere amara Chineke, onye nkwado ndị na-enweghị olu, ndị na-adịghị ike, ndị e merụrụ emerụ, na ndị ogbenye.

Ezeilo kọwaara na ọrụ ndụ Popu bụ ihe akaebe nke okwukwe na nraranye nke Chineke na mmadụ, ga-akpalite mụọ nke Ndị Ụka Kraịst ruo mgbe ebighị ebi.

O kwuru na ya nwere nkwanye ugwu miri emi mgbe ya zutere Popu Francis n'afọ 2013 na Vatịkan n'oge ogbako Interdenominational nke ọ haziri banyere ịzụ ahịa mmadụ.

N'oge ahụ, ejere m ozi dịka Onye Nnọchiteanya ụlọọrụ UN Pụrụ Iche banyere ịzụ ahịa mmadụ, karịsịa ụmụ nwaanyị na ụmụaka.

Ọ gara n'ihu kwuo n'otu ihe ya ga-eji echeta Popu Francis bụ etu otu nwaanyị si Argentina bụ onye Popu zọpụtara oge ọ bụ Bishọp, siri kọwaa etụ Popu siri gbaa mbọ zọpụta ya n'aka ndị na-azụ ahịa mmadụ.

Ihe ụfọdụ ndị Bishọp ụka Katọlik kwuru banyere Popu

Ọtụtụ ndị Bishọp Ụka Katọlik na Naịjirịa esonyela ụmụ niile n'iru uju banyere ọnwụ Popu Francis na ekwupụtakwa nwute maka ya.

Archbishọp nke Legọs steeti bụ nlfred Adewale Martins gwara BBC na ọnwụ Popu butere nwute mana ndị ụka na-enwe aṅụrị n'ihi na ọ nwụrụ mgbe a na-eme ncheta nbilete n'ọnwụ Jeso.

Bishọp Martins kwuru na chọọchị ga-echeta ya n'ihi na ọ hapụrụ ihe nketa iji wulite ya. O duuru ụka ma gosi mkpa ọ dị inyere ndị ogbenye aka.

Ọ kọwaara Popu dịka onye nwere mmasị nke ukwuu na mkparịtaụka n'etiti okpukperechi na udo dị n'etiti okpukperechi dị iche iche, n'ịhi na anyị niile na-ahụ onwe anyị na mbụ dịka ụmụ Chineke e mere n'onyinyo na oyiyi nke Chineke.

Bishọp Martins kwuru na Popu bụkwa onye na-akwado ihe banyere gburugburu ebe obibi na-akwado ụwa.

Archbishọp Ignatius Kaigama nke Abụja Dayọsis kwuru na Popu Francis bụ onye ndu na mba ụwa nke bụ enyi ndị Alakụba, ndị Buddha na ndị okpukperechi ọzọ, ewezuga Ndị Kraịst.

Archbishọp Kaigama kwuru na ọ bụ ezie na Popu abịaghị nleta Naịjirịa nke nwere ihe karịrị ndị Katọlik nde 30, mana ha hụrụ ya n'anya nke ọma.

N'aka nke ọzọ, Bishọp Katọlik Dayọsis nke Sokoto Matthew Hassan Kukah kwuru na Popu Francis bụ onye nwere obi umeala dịka ya nwere ohere izute ya ọtụtụ oge n'obere oge ọ nnọrọ dịka Popu.

O gara n'ihu kwuo na Popu bụ onye ga-achịrị gị ọchị mgbe ọbụla ịchịrị ya ọchị, kwe gị n'aka ma iwepụta aka gị, ma naara gị ihe ọbụla inyere ya.

Ọ bụ onye na-iji aka ya ewere nri ma ya na ndị mmadụ na-erikọ nrị mgbe ọ bụla. O kwuru na mgbe ọbụla ịchọrọ ka o sonyere gị na foto, na ọ ga-esonye.

Ihe ọtụtụ ndị ụka Katọlik n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa kwuru

Ọtụtụ ndi okpukperechi Katọlik nọ na Naịjirịa ekwuola ka ọnwu Popu Francis siri ewute ha na otu o si bie ndụ pụrụ iche.

Ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwụrụ na ihe ha ga-eme ugbua bu ikpere Chineke ka ọ nabata mkpụrụ obi ya na-eluigwe.

Ha gara n'ihu kwuo na onye ọbụla kwube aka ya ọtọ maka na onye di ndụ ga-emechaa nwụọ, mana ihe dị iche bụ ibi ndụ ziri ezi nke ha kwenyere na Popu Francis biri tupu ọnwu akpọ ya oku.

Chidimma Ezeala kwuru: "Onye ọbụla nwereike inwu mgbe ọbula, mana nke na-ewute anyị nke ukwuu na Nna nke okwukwe nọchiri ndị Katọlik na mba ụwa niile bụ Popu Francis anwụọla"

"Dịka-akwụkwọ katkism siri kwuo, Popu bụ onye na-anaghi eme njọ nke mba ụwa niile na elekwasi anya, mana ọnwụ ya na-ewute anyị nke ukwu, anyị na-arọ ka Chineke nabata mkpụrụ obi ya."

Onye ọzọ bụ Chimezie Udi kwuru: "O wutere m nke ukwuu mana onweghị ihe anyị ga-eme, ọnwụ bụ okwu bụrụ kwa ụgwọ mmadụ niile ga-akwụ, kemgbe e mere ya Popu, o kwuru na o nweghị ogologo ndụ, ọ ma na-ọria ọ na-aria agaghị ekwe ya ka o bie ndụ ogologo, anyị amaghị na ọ ga-ebi ndụ rụọ ugbua."

Onye ọzọ kwuru okwu bụ Smart Onuoha kwuru na "Onyeisi anyị alago, mana anyị na-enwe obi ọma na ọ nọ n'aka nri chukwu."

Ngozi Onuwa kwuru na "Obi ọma kpara m mgbe m hụrụ ya n'onyonyo n'ahụ esiwela ya ike mana obi ọjọọ na-eme m ugbua maka ọnwụ ya."