Otu nzuzo ndị e nwere n'ala Igbo na ọrụ pụrụiche ha na-arụ

- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Na mgbe ochie, otu nzuzo bụ otu ihe kachasị dị mkpa n'obodo ọbụla n'ala Igbo.
E nwere ọtụtụ ihe dị icheiche e ji hiwe ha nakwa ọrụ pụrụiche ha na-arụ iji hu na ihe na-aga ọfụma.
Iji kpughee okwu gbasara otu nzuzo, BBC Igbo kpọtụụrụ otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe metụtara omenala Igbo bụ Ọkammụta Chiagoze Nnabuihe.
Ọ kọwara na mpaghara ọbụla n'ala Igbo nwere otu nzuzo nke ha ma kwuo na ọ bụ mgbe ụka Kristi batara ka eji kwụsị ha.
Gịnị bụ ọrụ otu nzuzo ndị a?
E nwere otu nzuzo dị icheiche dị n'ala Igbo, mana abụọ kachasị pụta ihe bụ Ọkọnkọ na Ekpe.
"Ọ bụghị na ha bụ otu nzuzo kama na ha na-eme nzuko na nzuzo n'abalị nke mere ka ha nweta aha ahụ," ka Nnabuihe kọwara.
"Ihe e jiri hiwe ha bụ ịhazi ọdịnala nakwa omenala ala Igbo."
Ọrụ ndị ọzọ otu nzuzo ndị a na-arụ dịka, Mazi Nnabuihe si kọwaa bụ:
- ime iwu e ji ahazi obodo
- ịhụ na onye ọbụla kwanyeere omenala ugwu
- ịhụ na onye ọbụla nwere oke ruuru ya
- ịhụ na nwa mmụọ emegbughi nwa mmadụ nakwa na nwa mmadụ emegbughi nwa mmụọ (ya bụ nhatanha)
- ị hụ na asọpụụrụ Chi na eke, kwanyere ndị ichie ugwu, ma mee ka mmadụ na ibe ya biri n'udo.

Kedụzị ihe mere eji akpọ ha otu nzuzo?
Nnabuihe kọwara etu otu ndị ahụ na-arụ pụrụiche maka ọdịmma obodo si nweta aha "otu nzuzo".
Ọ sị na ọ bụghị maka omume ha, kama ọ bụ maka mgbe ha ji ezute onwe ha.
"Ha anaghị aga ebe ahụ igbu mmadụ kama ha na-aga iji hazi obodo nakwa ihụ na ihe dị ka o kwesiri ịdị."
"Ọ na-abụ n'oge gboo, ụmụaka richaa nri abalị, a kpọkọọ haa kọọrọ ha akụkọ ifo.
"Nke a mechaa ihe dị ka ebe elekere mbụ nke ụzụ ụtụtụ, ndị nọ n'otu ahụ ejepu nzụkọ ha.
"Ha na-anọru ebe ahụ rue mgbe ọke ọkpa ji ama ube nke mbụ, ha ewere gbasaa" (maka na Igbo ji ube ọke ọkpa agụ oge mgbe ahụ).
"O nweghi onye nọ n'ezinaụlọ ha ma na ha pụrụ apụ, ọ bụ ya ka eji akpọ ha 'otu nzuzo'."

Ụfọdụ otu nzuzo e nwere n'ala Igbo na akụkụ ebe a kacha achọta ha
Ọkọnkọ - ọtụtụ obodo dị na mpaghara Bende ochie n'Abia Steeti; Ngwa, Ihitte-Uboma
Ekpe Abriba, Ohafia na Arochukwu
Mmọnwụ - Ebe niile n'ala Igbo
Ọsịrịsa - Ụzụakọli na Bende
Ndụagalaba - Mbaise
Owu mmiri - Ndị mba mmiri
Ịkọrọ - Mbaise
Ọkọmbọ - Umahia
Ekeleke









