Onye na-ede akwukwọ a ma ama bụ Dillibe Onyeama alaala mmụọ

Ebe foto si, Dillibe Onyeama
Ịdọ aka na ntị:Akụkọ a nwere mkpụrụokwu ịkpa oke agbụrụ.
Otu nwoke onye na-ede akwụkwọ a ma ama bụ Dillibe Onyeama alaala mmụọ dịka ozi nwa ya nwoke bụ Dillibe Onyeama Jr siri kwuo n’akara Facebook ya n’ụbọchị Tọọzde.
Otu akwụkwọ Onyeama onye gbara afọ 71 e ji mara ya nke ukwuu bụ akwụkwọ a kpọrọ ‘Nigger at Eton’ bụ akwụkwọ banyere ịkpa oke agbara ọ gabigara dịka onye isi ojii mgbe ọ gụrụ akwụkwọ n’Eton College nke mba Briten.
Onyeama bụ onye isi ojii mbụ gụrụ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ahụ n'oge ahụ.
Nwa ya nwoke depụtara n’akara Facebook ya sị

Ebe foto si, Dillibe Onyeama Jr
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
“N'agbanyeghị na anyị anọkọghị ọnụ utgbua, akwụsịbeghị m ịhụ gị n'anya, akwụsịghịkwanụ m icheche banyere gị.”
Ọ gara n’ihu dee:
“Amụtala m ọtụtụ ihe site n’aka gị, etu isi gosi ịhụnanya gị nakwa okwu ọma ndị ikwuru”
“Ọ ga-adị ruo mgbe anyị zutere n’ụtụtụ ụbọchị mbilite n'ọnwụ ezigbo nna m.”
Ozi ya ekwupụtaghị kpọm kwem etu nna ya siri laa mmụọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Facebook post

Ebe foto si, Dillibe Onyeama
Cheta na akwụkwọ Onyeama ahụ o dere mechara kpatara ọtụtụ okwu n’ebe afọ 2020 ọkachasị banyere ịkpa oke agbụrụ nye ndị isi ojii na mba Ofesi.
Onyeisi ụlọakwụkwọ Eton gwara BBC na ihere mere ya maka oke a kpasịrị onyeisi ojii mbụ gụchara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ mba Briten a.
Nwafọ Naịjirịa na-ede akwụkwọ bụ Dilibe Onyeama nwetere asambodo 'First School Leaving' n'ụlọakwụkwọ Eton n'afọ 1969.

Ebe foto si, Dillibe Onyeama
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka ya
- A mụrụ ya n’Enugu steeti n’afọ 1951
- Mgbe ọ gbara afọ 30, o si mba Briten pụọ lọghachite Naịjirịa ebe o biri ndụ
- O mepere ụlọọrụ ebe a na-ebi akwụkwọ bụ Delta Publications (Nigeria) Limited
- Nwa ya nwoke bụ Charles Onyeama bụ onye ọkaikpe Jọstịs nke ụlọikpe ukwu Naịjirịa ma sorokwa na otu ndị ụlọikpe nke mba ụwa mana ọ lara mmụọ n’afọ 1999
- Akwụkwọ ahụ bụ ‘Nigger at Eton’ o dere n’afdọ 1972 mere onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ n’oge ahụ bụ Michael McCrum amachie ya ibanye ụlọakwọkwọ ahụ ọzọ
- O dere akwụkwọ ruru 28 n’oge ndụ ya
- Akwụkwọ ndị ọzọ o derela gụnyere: John Bull's nigger, Sex is a Nigger's Game, Juju, Secret Society, The Return: Homecoming of a Negro from Eton, Chief Onyeama: The Story of an African God, African Legend: The Incredible Story of Francis Arthur Nzeribe, The New Man: A Perspective in Evil na ndị ọzọ.









