Ihe ndị dị mkpa Emmanuel Macron ga-akpa na njem Afrịka ya

Onyeisiala mba Fransị bụ Emmanuel Macron abịala njem mba Afrịka ga-eru abalị atọ.

Njem a bụ mbụ ọ na-abịa Afrịka kemgbe ọ banyere n'ọkwa nke ugboro abụọ n'ọnwa Eprelu afọ 2021.

Onyeisiala Macron ga-aga mba atọ gụnyere Cameroon, Benin nakwa Guniea Bissau.

Ihe a kwadooro ya bụ na ọ ga-ebu ụzọ ga mba Cameroon ebe ọ ga-ezute onyeisiala mba ahụ bụ Paul Biya.

Agha Yukrane na etu o si metụta ọnụ nri na mba ahụ so n'ihe ha ga-akpa maka ya.

Ọ ga-ezutekwa ndị ntorọbịa mba ahụ gara nzụkọ Fransị na Afrịka n'obodo Montpellier dịka ha ga-enwe ohere ịgba ya ajụjụ ọnụ.

Nchekwa so n'ihe ndị ọzọ ọ ga-etinye ọnụ na ya

Nsogbu nchekwa metụtara mpaghara Kamerun so n'ihe ndị onyeisiala abụọ ndị a ga-akpa.

Ọnọdụ nchekwa mba ahụ bụ ihe na-echekasị onyeisiala ahụ dịka ha na-alụso Boko Haram agha kemgbe afọ 2016.

Ya bụ nsogbu eriela ndụ mmadụ 6000 ma mee ka ihe karịrị otu nde mmadụ gbaa ọsọ ndụ.

E nwekwara nsogbu ndị na-azọ mmeronwe ha na mpaghara ndị na-asụ asụsụ Bekee.

Mwakpo ndị otu na-eyi ndụ egwu na-akawanye njọ na mba Benin kemgbe ọnwa Nọvemba 2021 dịka mba ahụ na-achọ enyemaka mba Fransị site na ngwa ọgụ.

President Umaro Sissoco Embalo bụ onyeisiala mba Guinea Bisau bụzi onyeisioche ọgbakọ ECOWAS ọhụrụ.

Ọ bu ya na-elekọta ịweghara ọchịchị n'ike mere na mba Gini, Bokina Faso nakwa mba Mali.

Cheta na mba Mali si onye nnọchiteanya mba Fransị nọ na mba ha ya kwara lawa.

Mana o dobeghi anya ma onyeisiala abụọ a a ga-akpa maka ihe ndị a mgbe ha zutere.