You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Emmanuel Macron ekelela nwantakịrị nwoke sere ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Onyeisiala mba Fransi bụ Emmanuel Macron agala n'akara Instagram ya ikele nwantakịrị nwoke na-ese ihe sere ya.
Nwantakịrị ahụ bụ Waris Olamilekan egbughi oge cha cha were see Emmanuel Macron.
Waris bụ onye sere ya na gọvanọ na-achị Legos steeti bụ Akinwumi Ambode nakwa otiegwu Banky Wellington bụ ndị nnyere Macron eserese ahụ.
Macron mechara gaa n'akara ya na Instagram kwuo na foto ahụ metụtara ya nke ukwu.
Emmanuel Macron bụ onyeisiala mbụ na-aga Afrika Shrine bụ be otiegwu Naịjirịa a ma lara mmụọ bụ Fela Anikulapo Kuti.