Ụzọ ise egwu si enye aka na mwulite ụbụrụ ụmụntakịrị

Ebe foto si, Screenshot
Nnyocha sayensị egosila na egwu na-enyere ụmụntakịrị aka na mwulite ụbụrụ ha, ọbụladị oge ha ka nọ n'ime afọ nne ha.
Dịka ndị ọkachamara sayensị si kwuo, nwa rurula ọnwa asaa maọbụ asatọ n'ime afọ, amalitela ịnụ ihe nke ọma, ma nwekwaa ike ịmata olu nne ya.
N'otu nnyocha, a chọpụtara na egwu dị ụtọ ma dịkwa nwayọọ nwereike ime ka nwa nọ n'ime afọ nọdụ jụụ.
Dr Ibrahim Balatagi, ọnye bụ ọkammụta na nkuzi egwu na Mahadum 'Lebanese American University, gwara ngalaba Unicef na nwata na-amalite ịnụ ihe n'izuụka 16 ruo 18 nke afọ ime.
"N'ebe izuụka 24, ntị ya emepeela nke ọma nke na o nwere ike ịtụgharị isi ya ma ọ nụ olu maọbụ mkpọtụ mmadụ," Dr Baltagi kwuru.
"Ige egwu, ọkachasị egwu na-ada nwayọ nwayọ, na-enyere nwaanyị dị ime aka ka ahụ jụọ ya oyi, mana ọ kacha enyere nwata e bu n'afọ aka maka mwulite ụbụrụ ya."
Lee ụzọ ise egwu si enyere ụmụntakịrị aka:
1) Na mmụta asụsụ
Egwu na-enyere ụmụntakịrị aka ịmụta asụsụ ngwangwa.
Nke a bụ maka na dịka egwu ahụ na-akpọ ugboro ugboro, nwatakịrị ga-eso ya na-agụkwa ugboro ugboro.
"Mgbe nwatakịrị na-ekwu otu ihe ugboro ugboro, ọ na-amụtawanye ihe ahụ ngwa ngwa," Alys Mathers kwuru.
Alys Mathers bụ ọkachamara n'ịnyere ụmụaka aka n'ikwu okwu na ịmụta asụsụ, nke a na-akpọ 'speech and language therapist'.
2) Na mmụta nkwukọrịta okwu

Inwe mmasị ige egwu na-eso ụmụntakịrị apụta ụwa, nke a mere na ụmụaka na-achọ ilele, ige nakwa ime ihe ha hụrụ mmadụ na-eme ma ị na-agụrụ ha egwu.
Dịka ha na-eme nke a, ha ga na-echeta okwu niile dị n'egwu ahụ, ma na-amụtakwa etu e si etịnye uchu na mmụta.
"Alys Mathers kwuru sị: "dịka mmadụ na-agụ egwu, ọbụladị ụmụnatkịrị ga na-amụta usoro nakwa ụda etu egwu ahụ si ada."
"Nke a mere iji ahụ ebe ha na-achọ imepụta ụda dị icheiche nke ha na-anụ. N'ụzọ dị otu a, ha na-amụta etu mmadụ na ibe ya si ekwukọrịta okwu."
3) Na mmụta mgbakọ na mwepụ

Dr Ibrahim Balatagi kwuru na ịkụziri nwatakịrị etu e si akpọ ngwaegwu nwereike iwulite mmụta mgbakọ na mwepụ n'ime nwata ahụ, ma mekwaa ka akara ha na-enweta n'ụlọ akwụkwọ gbalie.
Ụfọdụ nnyocha gosikwara na ige egwu na ịmụ etu e si akpọ egwu na-enyere ụmụntakịrị aka ịmụta 'mathematics'
4) N'ịrahụ ụra

Ebe foto si, Unicef/Screengrab
"Egwu dị nwayọ dịkwa nro na-enye aka wetulata otiti obi ụmụaka ma mee ka ha na-eku ume nke ma rahụọ ụra nke ọma," Dr Ibrahim Balatagi kwuru.
"Nne maọbụ nna maọbụ onye na-eleta nwa ịgụrụ nwatakịrị ego dị ezigbo mkpa, maka na nwata ahụ amatala olu ha, nke na-eme ka obi jụọ ya oyi ngwangwa ọ nụrụ olu ha."
Ịrahụ ụra nke ọma na-enye nnukwu aka na mwulite ụbụrụ nwatakịrị.
Nnyocha egosila na nwata na-arahụ ụra nke ọma na-aka eme nke ọma n'ihe dị icheiche n'ụlọakwụkwọ.
5) N'ịkpa obi aṅụrị

Egwu na-eme ọtụtụ mmadụ obi aṅụrị, mana ọ kacha eme ụmụaka obi aṅụrị.
Ndị ọkachamara sayensị na-ekwu na egwu dị ụtọ na-eme ka ụbụrụ mepụta 'dopamine'.
'Dopamine' bụ ihe na-ebulite mmụọ mmadụ ma mee ka ọ na-enwe aṅụrị.
Ndị ọzọ...
Egwu na-enye aka iwulite n'ime ụmụaka mmụọ mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
Nke a bụ maka na ọtụtụ oge, ịgụ egwu na ịgba egwu na-abụkarị ihe mmadụ abụọ maọbụ karịa na-eme, nke a na-enye aka ịkụziri ha na mmekọ mmadụ na ibe ya bụ ihe dị mkpa.
Ịgụ egwu na ịgba egwu na-enyekwara ụmụntakịrị aka imegharị akụkụ ahụ ha dị icheiche.
Dịka ha na-agụ egwu, ha ga na-agba egwu, maọbụ na-akụ aka, maọbụ na-awụli elu. Ihe ndị a na-enyere ahụike ya aka.












