'Etu mwakpo mere n'ụka Katọlik dị n'Owo si mee ka e bepụ m ụkwụ'

Ọnwa 10 agaala mana akụkọ etu e siri gbutọọ ndị mmadụ n’ụka Katọlik dị n'Owo ka na-akpọtụ.
Dịka ụlọụka Katọlịk nke St Francis Xervier Owo dị n’Ondo steeti mere ofufe nro nke mbụ ha n’izu abụọ gara aga bụ ụbọchị ncheta ọnwụ na mbilite Kraịst kemgbe awakpochara ha, ụfọdụ ndị ụlọụka ahụ akọrọla BBC ihe ha gabigara n’oge ahụ.
Ụfọdụ n’ime ha ji anya mmiri akwa nakwa obi ịda mba kaa ụka nke mbụ ahụ n’ihi anya ka juru ha maka mwakpo ahụ nakwa etu o siri taa isi ụfọdụ ndị ezinaụlọ ha nakwa ndị enyi ha.
Otu nwaanyị ọzọ aha ya bụ Atta Magret onye ụkwụ ya banye ụka ahụ ụbọchị mwakpo ahụ mere abụrụla onye ebepụrụ ụkwụ. Mmerụ ahụ mere ya ụbọchị mere ndị dọkịnta jiri bepụ ya ụkwụ dịka e jizi oche pụrụiche eji anya ndị nwere nsogbu ụkwụ ebugharị ya ugbua.
Orịakụ Magret kwuru ‘'Mwakpo a mere egbupụ m ụkwụ, adịla mma ugbua, ihe metụtara mmụọ nke ukwuu mana ana m ekele Chukwu na m dị ndụ.”
Ọ bụ ụmụ ya na anyagharịzi ya ugbua dịka o kwuru na ọ na-atụ anya ịzụta ụkwụ arụrụarụ ọ ga-eji na-agagharị n’oge na-adịghị anya.
'Ndị ojiegbe gbapuru isi nna m'

Ebe foto si, BBC/Reuters
Otu nwaamadị aha ya bụ Chinedu Onuoha nke mwakpo ahụ mere n’ụbọchị ise nke ọnwa Juun 2022 metụtara gwara onye ntaakụkọ BBC etu o siri jiri anya ya hụ ka ndị omekome ahụ wụbata ụka ahụ ma malite ịgba egbe aghara aghara dịka e mechara gbagbuo nne na nna ya ebe ahụ.
Maazị Onuora kwuru ihe zọrọ ya ndụ bụ na o zokpuru onwe ya n’otu akụkụ ụka ahụ.
“Mgbọ tụrụ nne n’akụkụ ahụ ya dịka e ji egbe gbapuo isi nna dịka ọ nọ na-achọ ịgbapụ ụka ahụ.”
O kwuru na ka mwakpo ahụ mechara na o ji ọsọ gaa chọta nne ya onye nọ n’ala na-agba oke ọbara dịka mgbọ tụrụ ya.
E buuru ya gaa ụlọọgwọ tuupu ahụzie nna ya ebe ozu ya tọgbo dịka ọbara juru ya ahụ.
Onuora onye nọ na-ebe akwa n’ụfọdụ oge dịka a nọ na-aka ụka ụbọchị ahụ kwuru:
“Ihe a tara isi nne m dịka ụlọọgwụ mbụ enweghi nabata ya nke mere anyị ji buga ya ụlọọgwụ ọzọ nọ n’Akure bụ ebe ọ nọ nwụọ.”.
O kwuru na ọnwụ nne ya mere ejima nne amalite ịrịa ahụ nke ọ ka na-arịa ruo ugbua kemgbe ọnwa 10 gara aga.
“Nne na nna m hapụrụ ụmụ 11, isii n’ike ha ka na-agụ akwụkwọ. Ugbua anyị gụcharala bụzị ndị na-azụ ha.”
Ọ gara n’ihu kwuo na gọọmentị enyeghi ha enyemaka etu ha siri chee.

Otu nwaada nke aha ya bụ Veronica kwuru na mwakpo ahụ tara isi nne ya dịka o nwuru na ya na ụmụnne ya etitabeghi n’ihe a dịka ihe mere ha na nrọ.
“Enweghi mgbọ ebe a hụrụ n’ahụ nne m. Anyị na-eche na ọ bụ obi nkoropụ gburu ya ebe ahụ.”
Gọọmentị kwuburu na anwụchiri ụfọdụ ndị a na-enyo maka mwakpo ahụ mana ọnwa 10 agafeela dịka anụbeghị akụkọ ọbụla banyere mpụtara nnyocha e kwuru a na-eme maọbụ okwu ma akpụpụla ha ụlọikpe ugbua.
Ndị mwakpo a metụtara kwuru na ihe kụdara mmụọ ha.
Cheta na mwakpo a tara isi ihe ruru mmadụ 40 ebe ihe ruru mmadụ 58 merụrụ ahụ n’ime ya. Ụfọdụ ozi si n’aka gọomentị oge ahụ kwuru na a na-eche na ọ bụ ndị agha nnụpụisi nke otu Alakụba bụ Islamic State – West Africa Province bụ ndị mere ya bụ mwakpo.

Ihe ndị anyị hụrụ n’ụlọụka ahụ ugbua
Arụarịala ụlọụka a, hichapụcha ọbara ndị mmadụ rapadoro n’ala nakwa akụkụ ya dị iche iche dịka etinyere ihe onyonyo na-esete ndị mmadụ dịka otu n’ime usoro nchekwa dị iche iche e hibere n’ụlọụka ahụ. NdỊ ọrụ nchekwa wujurukwara ebe ahụ.
Gọọmentị kwuru na a ga-arụ ebe ncheta n'akụkụ ụka ahụ maka ndị nwụrụ na mwakpo a mana arụchabeghi ya ugbua dịka BBC siri hụ ebe ahụ.









