Tobi Amusan, Owo Massacre... Lee ụfọdụ ihe mere ka ụwa kpụrụ Naijirịa n'ọnụ n'afọ 2022

Ebe foto si, Getty Images
Dịka afọ 2022 na-abịa n'isi njedebe, e nwere ọtụtụ ihe mere ụwa niile kpụrụ Naijirịa n'ọnụ n'afọ a.
Ụfọdụ n'ime ha bụ ihe ọma nke e kwesịrị iji mee ọnụ, mana ụfọdụ bụ ihe anya mmiri nke mere ndị mmadụ echeta ebewe.
Ka anyị tụlee ụfọdụ n'ime ha:
Oluwatobiloba Ayomide "Tobi" Amusan

Ebe foto si, ihurdle_33.0inches/Instagram
Oluwatobiloba Ayomide Amusan eji Tobi mara tipụtara Naijirịa ka ọnwa n'afọ 2022 dịka o meriri ma mee ihe mmadụị emebeghị mbụ n'ọsọ a na-awụ awụ nke bekee kpọrọ hurdless.
Tobi dị afọ 25 mgbe o ritere ntụrụugo ọlaedo n'asọmpị ọsọ nke Commonwealth Games ma chi kwa eze ọzọ n'asọmpị Diamond League.
Tobi ji 12.1scs gbachaa ọsọ 1mm hurdles nke a na-enwegfhị onye gbarala ya n'ụwa niile.
Tobi onye eji 'Tobi Express' mara natara nturụugo pụrụiche nke ọkwa Order of the Niger n'aka onyeisiala Naijirịa bụ Muhammadu Buhari.
Oke ide mmiri gburu ihe ruru mmadụ 600

Dịka Nigerian Meterological Agency siri dee, afọ 2022 bụ afọ ọdachi idemmiri kacha njọ na Naijirịa kamgbe afọ iri anọ.
Dịka BBC siri dee, otu n'ime ihe butere ọdachị a bụ na mba Kamerun mepere ọdọ mirri Lagdo nke mere ka nnukwu mmiri si ebe ahụ tojuo ụfodụ osimiri gbara Naịjirịa okirikiri.
Akụkọ kwuru na Naịjirịa kwesịrị ịrụ ọdọ mmiiri nke ha a kpọrọ Dasin Hausa Dam, kama arụchabeghị ya bụ ọdọ mmriri n'agbanyeghị nkwa gọọmentị kwewara kamgbe ọtụtụ afọ gara aga.
Ọzọkwa bụ na mmiri zoro n'afọ 2022 nke ukwuu karịa etu o si ezobu n'afọ ndị gara aga, dịka mịnịstrị na-ahụ maka mmiri na Naịjirịa si kwuo.
"Ọ bụ oke mmiri ozuzo a bụ ihe kacha kpata nsogbu idei mmiri n'afọ a, ọ bụchaghị mmepe 'Lagdo Dam' nke mba Kamerun," Suleiman Adamu, bụ Mịnịsta na-ahụ maka mmiri kọwara.
Mmadụ karịrị 600 n'ọnụọgụgụ nwụrụ n'ọdachi idemmiri nke 2022, puku kwuru puku ụlọ ndị mmadụ lakwara n'iyi, ebe ihe karịrị mmadụ nde abụọ ka mmiri chụpụrụ n'ụlọ ha.
Anthony Joshua, Israel Adesanya na Kamaru Usman

Ebe foto si, Getty Images
Afọ 2022 bụ afọ ndị Naijirịa na-akwado iti ọkpọ na Mixed Martial Arts bere akwa arịrị.
Mmadụ atọ ndị Naijirịa ji eme ọnọ naegwuregwu ndị a ka anapụrụ mgbanukwu ntụrụugo ha.
Oleksandr Usyk napụrụ Anthony Joshua ntụrụugo WBA, IBF na WBO n'afọ 2021 ma merie kwa ya ọzọ n'afọ 2022 iji jichie ya bụ mgbanukwu.
Ebe Kamaru Usman dara n'aka Lean Edwards onye meriri ya ma nara ya ntụrụugo Welterweight nke UFC.
N'aka nke ọzọ ka Alex Pereira meriri Israel Adesanya ma napụ ya mgbanukwu nke Middleweight Champion.
Kama ụmụ Naijirịa ndị a ekwuola sị na onye etụlụ ụjọ n'ihi na ha nwere ihe ha ga-eji anaghachi mmbanukwu ndị a nara ha.
Olilenya dị.
Mgbe ndị ntọ tọọrọ onyeisi ụka Methodist na Naijirịa

Ebe foto si, Methodist Church Nigeria/Website
A tọọrọ onyeisi ụka methodist na Naijirịa bụ Samuel Kanu n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mei afọ 2022.
Ọ bụ dịka ha si emume ụka emere n'Okigwe aga Umu nneochi nke dị n'Abia Steeti ka a tọọrọ ha.
Kanu na mmadụ abụọ so ya nke gụnyere onyeisi ụka Methodist n'Owerre kwuru na a kwụrụ otu narị nde naịra n'isi ha tupu he enwere onwe ha.
Mwakpo ụgbọoloko si Abuja aga Kaduna

Ebe foto si, Chibuike Amaechi/Twitter
Ndị omekome wakporo ụgbọoloko nke sị Abuja aga Kaduna n'ụbọchị 28 nke ọnwa maachị afọ 2022.
Ndị ji ogbunigwe gbarie okporo igwe ụgbọoloko a na-agba na ya.
Ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ ebe ihe ruru mmadụ itolu nwụrụ na ya bụ mwakpo.
Ọ bụ ihe ruru mmadụ 63 ka ndị omekome a tọọrọ.
Ọnwa isii gachara tupu ndị niile a tọọrọ na mwakpo a ji nwere onwe ha.
Oge awakporo ụlọụka dị n'Owo ma gbuo ihe ruru mmadụ 50 nke gụnyere ụmụaka

Ebe foto si, BBC/OLUMIDE OWADUGE
N'ụbọchị ise nke ọnwa June afọ 2022, ka ndị ekperima wakporo ụlọụka Katọlik (St Francis Catholic Church) dị n'Owo, Ondo Steeti, ma malite ịkwa mgbọ dịka ọtụtụ mmadụ juru n'ime ụlọụka ahụ.
Ihe ruru mmadụ 40 nwụrụ na ya bụ mwakpo, ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụntakịrị.

N'ụbọchị 17 nke ọnwa Jun ka e mere emume olili ụfọdụ n'ime ndị e gburu na mwakpo ahụ.
Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa mechara kwuo na ha anwụchiela ụfọdụ ndị ekperima so mee ya bụ mwakpo.









