Tobi Amusan: Ihe ị kwesịrị ịma maka nwaada Naijiria ritere N65m n'asompi 'World Athletic Championship'

Tobi Imusan

Nwaafọ Naijiria bụ Tobi Amusan abụrụla ọkaibe n'ụwa n'ọsọ hurdle n'asọmpi 'World Athletics Championship' nke ụmụnwaanyị nke e mere n'Oregon dị n'Amerịka n'ụbọchị ụka.

Nke a bụ mbụ Naijiria na-erite ntụrụugo ọlaedo n'asọmpi mbaụwa 'World Athletics Championship'.

Amusan, onye nwetara mmeri a, ritere otu nari puku dọla nke pụtara nde Naira 65 n'oge Naijiria.

Ọnụ Amusan jupụtara n'akwa ọnụ dịka e mere emume inye ya ọla mmeri ahụ dịka o were anya na ọ bụghị naanị na o meriri n'asọmpi ahụ mana ụdị mmeri ya enwebeghị onye nwetara ya n'oge o were Amusan inweta ya.

Nwaada Tobi mere ihe mmadụ emebeghị n'ọsọ mwufe mgbochi ọ gbara n'agba bịara tupu nke ikpeazụ bụ ebe o meriri na tịkọm 12.05.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka nturugo Tobi wetaara Naijiria

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammdu Buhari kwuru na mmeri Tobi Amusan wetara ọṅụ na olileanya nye ụmụ Naijiria.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3

Onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu Labour Party bụ Peter Obi kwuru n'anyammiri na-agba Tobi dịka a na-agụ egwu ala Naijiria gosiri na ndị ntorobia chọrọ ka ụdị ndu Naijiria ga-enye ha nkwado ịbụli ihe ọbụla ha chọrọ ịbụ na ndụ.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 4

Onye bụdị Tobi Amusan na-ewu?

  • Tobi Amusan bụ nwa afọ Naijiria bụ ele n'ịgba agba ọsọ
  • Onye Ijebu-Ode n'Ogun steeti. a mụrụ ya n'afọ 1997, bụ onye ritere ji ọkwa ọkaibe n'Afrika n'ọsọ hurdle 100 mita nke o ritere afọ anọ gara aga bụ mgbe o ritere ọlaedo abụọ.
  • Ọ gụrụ sekọndrị n'ụlọakwụkwọ 'Our Lady of Apostles Secondary School' dị na Ijebu-Ode.
  • Ọ gara mahadum 'University of Texas, El Paso'.