Naịjirịa akpọlatala ụfọdụ ụmụafọ ha ndị tọrọ na Sudan

Abike Dabiri bụ onyeisi ụlọọrụ Nidcom, ndị Nema nakwa ndịagha Naịjirịa wụchiri ọdọ ụgbọelu Abuja iji nabata ndị a

Ebe foto si, Nidcom

Nkọwa foto, Abike Dabiri bụ onyeisi ụlọọrụ Nidcom, ndị Nema nakwa ndịagha Naịjirịa wụchiri ọdọ ụgbọelu Abuja iji nabata ndị a akpọlatara

Dịka ihe ruru otu izuụka gacharala, Naịjirịa emeechala kpọlata ụfọdụ ụmụafọ tọrọ na Sudan bụ ebe ọgbaghara na-adasiike.

Ozi si n’aka ụlọọrụ na-ahụ maka ụmụafọ Naijirịa nọ na mba ndị ọzọ bụ ‘Nigerians in Diaspora Commission’ (Nidcom) gbara ama nke a. Ozi ha kwuru ndịagha Naijirịa bụ jet c13 tụrụ ụkwụ n’ọdọ ụgbọelu nke Abuja n’ebe elekere 11 nke abalị Wenezde.

Ọ bụ ụgbọelu abụọ bu ụmụafọ Naijirịa bụ ihe tụrụ ụkwụ n’ọdọ ụgbọelu ahụ. Ụgbọelu ndịagha elu Naịjirịa bulatara mmadụ 94 ebe ụgbọelụ ụlọọrụ AirPeace bulatara mmadụ 283.

Dịka ọgbaghara malitere ịda na Sudan kemgbe ụbọchị 15 nke ọnwa Eprel, Naịjirịa dịka mba ndị ọzọ malitere ịchọ ụzọ kpọlata ndị nke ha tọrọ ebe ahụ. Atụmatụ a malitere kemgbe ihe karịrịla izu abụọ nke ọtụtụ chere aka mgbe nke gụnyere mgbape okeala, ịnweta ikike n’aka ndị otu nchekwa abụo na-alụ ọgụ, malite ọgụ ọzọ dịka nkwekọrịta nkwụsịtu kụsara nakwa ihe ndị ọzọ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Ọdọ nnyocha ndịagha Sudan n'ime Khartoum

Ebe foto si, AFP VIA GETTY IMAGES

Nkọwa foto, Ọdọ nnyocha ndịagha Sudan n'ime Khartoum

Egypt mechara gbapee okeala ha ka ụmụafọ Naijirịa gafere

Nidcom gbara ama na mba Egypt agbapere okeala ha dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari zigachara ha mkpesa.

Abike Dabiri bụ onyeisi ụlọọrụ kwuru nke a n’ehihe Mọnde a,

Cheta na ụgbọala bọọsụ nke ụlọọrụ a zigara Sudan ka ọ buga ụmụafọ Naijirịa mba Egypt bụ ebe a ụgbọelu ndị agha elu Naijirịa na-eche ibupụ ha, tụrụ ụkwụ na Sudan n’ụbọchị 26 nke ọnwa Eprel ma bupụ ụfọdụ n’ime ha n’ụbọchị 27.

Ozi pụtara na okeala ndị mba Egypt gbachiri agbachi nke tinyere ndị a n’ọnọdụ gbagharịa.

Ugbua Abike gbara ama nke a, a na-atụ anya na ụgbọelu ndịagha Naijirịa ga-ebupụ ndị a ebe ahụ ngwa ngwa.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Ogbunigwe ka na-adakwa aghara aghara n'obodo Khartoum bụ isi obodo Sudan dịka nkwekọrịta e nwere ka akwụsịtụ ọgụ iji nye ndị nkịtị ohere ka ha pụọ ebe ahụ kụsara na mgbede Sọnde.

Ndị agha Sudan sị na ọ bụ ha na-awakpo obodo ahụ iji chụpụ ndị otu nchekwa 'Rapid Support Force' bụ ndị na-aluso ha ọgụ.

Ọgụ a kawanyere njọ n'agbanyeghị na otu abụọ a na-alụ ọgụ kwetara ịkwụsị ịlụ ọgụ ruo abalị atọ n'ụbọchị Tọọzde.

Onyeisi ndị agha Sudan bụ ọchịagha Abdel Fattah al-Burhan na onyeisi ndị RSF bụ Ọchịagha Mohamed Hamdan Dagalo, onye e ji Hemedti mara, na-azọ onye ga-anọ n'isi ọchịchị. Ha na-enwe nghọtahie gbasara ịkpọbata ndị ọgụ RSF n'ime otu ndị agha Sudan.

Ide ego mba Sudan bụ Mo Ibrahim kwuru na ọgbaaghara ahụ abụghịzi ọgụ nkịtị kama ọ bụ agha ka a na-alụ.

"Ọ dị mkpa na anyị ekweghị ka ọgụ a gafee oke ala Sudan ma banye na mba ndị ọzọ dị na mpaghara a. Anyị achọghị ka ihe mere na Syria mee ebe a," Mo Ibrahim kwuru.

Ndị agha adọọla ndị nọ na Khartoum aka na ntị ka nọrọ n'ime ụlọ ha dịka ha na-ebuso otu RSF agha ebe ahụ.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị agha adọọla ndị nọ na Khartoum aka na ntị ka nọrọ n'ime ụlọ ha dịka ha na-ebuso otu RSF agha ebe ahụ

Agbenyeghi na gọọmentị gbara mbọ gbapụta ụmụafọ ha, akụkọna-apụta na ụfọdụ ụmụafọ Naijirịa ka nọ na Sudan dịka gọọmentị na-agba mbọ ịgbapụta ha ma kpọlata ha ụlọ.

Onye nnochite anya Naijirịa na Sudan bụ Safiu Olaniyan wepụtara ozi n'abalị Satọdee na-arịọ ndị nne na nna ndị ụmụ ha nọ ebe ahụ ka nwetụ obere ndidi na Naijirịa na-agba mbọ ịkpọlata mmadụ niile.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Gọọmentị Naịjirịa zigara ụgbọala n'isiobodo Sudan iji buga ụmụafọ ha Egypt ebe ụgbọelu ga-aburu ha lọta Naijirịa
Nkọwa foto, Gọọmentị Naịjirịa zigara ụgbọala n'isiobodo Sudan iji buga ụmụafọ ha Egypt ebe ụgbọelu ga-aburu ha lọta Naijirịa

Ihe mere anyị ji mefuo $1.2m n'ịkpọpụta ụmụ Naịjirịa na Sudan - Gọọmentị

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Gọọmentị Naịjirịa akọwaala ihe kpatara ha ji mefuo otu nde dọla na ụma iji kpọpụta ụmụ Naịjirịa tọrọ atọ na mba Sudan ebe ọgụ na-aga n'ihu ugbua.

Ha nyere nkọwa a n'akwụkwọ ozi si n'aka Mịnịstrị na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ nakwa Mịnịstrị na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ na njikwa ọnọdụ gbatagbata.

Ha kọwara na ọnụọgụgụ ụgbọala bus ha ji ebupu ụmụakwụkwọ ndị ahụ ruru 42, "ndị nke mbụ ọnụọgụgụ ha dị 637 nọ n'ụgbọala bus 13 erutela na mpaghara Aswan bụ okeala Egypt na Sudan. Ha na-eme nnyocha ugbua iji banye na mba Egypt bụ ebe a ga-esi bulata ha Naịjirịa."

"Anyị na-ele anya na ha ga-amalite njem ha n'oge adịghị anya dịka ụgbọelu nke 'Nigeria Airforce' na nke 'Air Peace' anọrọla ugbua na-eche ha."

"Otu nke abụọ bụ ụgbọala bus 29 ga-amalite njem ha na Satọde, Eprel 29 2023."

"Maka ndị na-ekwu okwu gbasara ego nde $1.2 anyị ji wee chọta ụgbọala ndị anyị ji ebupu ụmụ akwụkwo a, nkatọ ndị a enweghị isi."

"Ọ dị mkpa ka e cheta na ihe a bụ oge agha, ma bụrụkwa na ọtụtụ mba ndị ọzọ na-achọkwa iji ụgbọala ndị ahụ iji kpọpụ ndị mba ha bụkwa ndị tọrọ na Sudan."

Abdalla Hamdok

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Abdalla Hamdok nọ n'ọkwa Praịm minista ugboro abụọ n'agbata afọ 2019 ruo 2022.

Ọgbaaghara dị na Sudan nwereike ịka nke Syria na Libya njọ

Onye bụburu Praịm Mịnịsta na mba Sudan bụ Abdalla Hamdok ekwuola na ọgbaaghara na ọgụ na-aga n'ihu na mba ahụ ugbua nwereike ịka ihe mere na Syria na Libya njọ.

Hamdok kwuru nke a n'otu ọgbakọ e nwere na Nairobi, bụ isi obodo Kenya, ebe ọ nọrọ kpọkuo ndị ọchịchị mba ụwa ka ha rịọ onyeisi ndị agha Sudan na onyeisi ndị RSF ka ha kwụsị ọgụ ma nwee mkparịtaụka maka udo.

Ọgụ na-adasi ike n'etiti ndị ọgụ 'Rapid Support Force' (RSF) na ndị agha Sudan na Khartoum bụ isi obodo Sudan.

"Sudan bụ nnukwu mba, nwere ọtụtụ omenala dị icheiche... Ọ ga-abụ nnukwu ihe ọjọọ nye ụwa," ka o kwuru.

"Ihe a abụghị ọgụ dị n'etiti ndị agha na obere otu nnupu isi. Mba. Ihe a bụ agha dị n'etiti otu ndị agha abụọ. Otu abụọ a nwere ọzụzụ ma nwekwaa ngwaaọgụ nke ọma."

Hamdok rụrụ ọrụ ugboro abụọ dịka Praịm mịnịsta malite na 2019 ruo 2022.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọgụ a dị na Sudan ugbua ga-aka njọ karịa agha a lụrụ na Syria nakwa Libya.

Agha Syria na Libya butere ọnwụ ọtụtụ narị puku mmadụ, ma mekwaa ka nde kwuru nde ndị mmadụ gbaa ọsọ ndụ pụọ na obodo ha, nke a butekwara ọtụtụ nsogbu na mpaghara ahụ niile.

Gọọmentị Briten ekwuola na ha akpọlatala ụmụafọ ha mmadụ 1,888

Ebe foto si, UK MINISTRY OF DEFENCE

Nkọwa foto, Gọọmentị Briten ekwuola na ha akpọlatala ụmụafọ ha mmadụ 1,888

Agaghị ekwu okwu udo ma ọ bụrụ na ndị agha akwụsịghị ịtụ ogbunigwe - Onyeisi RSF

Onyeisi otu n'ime otu ndị agha abụọ na-ebuso onwe ha agha na mba Sudan ekwuola na agaghị enwe mkparịtaụka ọbụla maka udo ma ọ bụrụ na ndị agha akwụsịghị ịkwa ha mgbọ nakwa ịtụ ha ogbunigwe.

Ọchịagha Mohamed Hamdan Dagalo, onye e ji Hemedti mara, bụ onyeisi otu ndị agha a kpọrọ Rapid Support Forces (RSF), kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'ekwentị.

O kwuru na n'ime abalị atọ ahụ e nwere nkwekọrịta ịkwụsị ịlụ ọgụ ka ndị mbịarambịara nwee ohere pụọ, ndị agha Sudan gara n'ihu na-atụ ndị agha ya bụ ndị RSF ogbunigwe aghara aghara.

Hemedti kwuru na ya na ndị agha ya achọghị ịla Sudan n'iyi. O kwukwara na ọ dị njikere inwe mkparịtaụka mana ndị agha ga-akwụsị ịkwa ndị otu ya mgbọ nakwa ịtụ ha ogbunigwe tupu nke a agaa n'ihu.

Ọchịagha Abdel Fatah al-Burhan bụ onyeisi otu ndị agha mba Sudan bụ ndị na-ebuso ndị RSF agha, mana Hemedti kwuru na ya na-ahụta Burhan dịka onye ihu abụọ n'ihi na ọ kpọghachitere ọtụtụ ndị otu onyeisiala Omar al-Bashir bụ onye ndị agha chụturu n'ọchịchị n'afọ 2019 dịka ndị Sudan mere nnukwu ngagharịiwe.

Ọchịchị Bashir nọzuru afọ 30 ma tinyekwa iwu sharia siri ike na mba Sudan bụ nke butere ngagharịiwe e ji chụtuo ya.

"Mana ugbua, Burhan na-anụrụ ndụmọdụ ma na-esokwa ndị isi otu 'Islamic Front'," Hemedti kwuru.

Cheta na ọ bụ ndị agha Sudan nakwa ndị otu RSF jikọrọ aka wee chụtuo al-Bashir n'ọchịchị n'afọ 2019 ma tinye onye nkịtị aha ya bụ Abdalla Hamdok.

Na 2021, ha chutukwara Hamdok ma kwuo na ha na-amalite mkparịtaụka etu ọchịchị ga-esi laghachi n'aka ndị nkịtị.

Mana n'afọ a, esemokwu dapụtara ọzọ gbasara usoro a ga-esi nyefee ndị nkịtị ọchịchị, ọ kachasị gbasara etu a ga-esi nabata ndị ọgụ RSF ruru 100,000 n'otu ndị agha Sudan.

Hemedti gwara BBC sị: "Adị m njikere taa maọbụ echi inyefe ndị nkịtị ọchịchị n'uju. Nke a bụ ihe m kwenyere."

O kwukwara na ndị otu ya bụ RSf achọghị ibuso ndị agha Sudan agha n'ihi na ha na ha abụghị ndị iro.

"Anyị agaghị aluso unu ọgụ. Biko laghachinu n'ogige unu anyị agaghị aluso unu ọgụ."