Ụmụafọ Naịjirịa tọrọ na Sudan adịla njikere ịlọta taa – Gọọmentị etiti

Ebe foto si, Abike Dabiri
Ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi na mba ofesi bụ Nigerians in Diaspora Commission (NIDCOM) ekwuola na ụlọọrụ Naịjirịa dị na Ijipt akpọfeela ụmụafọ Naịjirịa si Sudan n’okeala nke Ijipt.
N’ozi ha wepụtara na Tuzde, ha kwuru na a na-akwado iburu ha gawa n’ọdọụgbọelu Aswan dị n’Ijipt bụ ebe ụgbọelu ndịagha Naịjirịa nakwa nke ụlọọrụ Airpeace ga-eburula gawa Abuja.
Ngalaba a sị na ndị a ga-ebuzo tinye n’ụgbọelu njem a ga-abụ ụmụaka na ụmụnwaanyị n’atụmatụ ịkpọlata ndị a.
Onyeisi ngalaba a bụ Abike Dabiri-Erewa sị na a na-atụ anya ndị a na Naịjirịa n’ime awa ole na ole na-abịa abịa.
Ọ gara n’ihu kwuo na mmadụ ole na ole ndị fọrọ na Sudan ka a ga-ebuga n’okeala mmiri a kpọrọ Port Sudan n’ụtụtụ Wenesde a.
Ebubo ikpaoke agbụrụ n’ịkpọlata ndị Naịjirịa
Ministry na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ agọọla ebubo si n’ihe onyonyo nke kwuru na a na-akpachapụ ndị Igbo nọ na Khartoun mgbe ụgbọala chọrọ ibulata ndị Naịjirịa site na Sudan.
Ọnụ na-ekwuru ngalaba a bụ Francisca Omayuli si na ha emeela nyocha ma chọpụta na nke ahụ bụ asị.
“Ụlọọrụ anyị na Khartoun kwuru na ndị Igbo so n’ime ndị Naịjirịa mbụ dị 637 e bugara n’okeala Aswan mba Ijipt, bụ ebe ha na-echa ka e bulata ha na Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Naijiria a na-eme ịkpaoke agbụrụ na mkpọla ụmụafọ ha toro na Sudan?

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Dịka Naịjirịa na-agba mbọ ịkpọlata ụmụafọ ha tọrọ na Sudan, nkwekọrịta ịkwụsịtu ọgụ ebe ahụ akụsaala na Sọnde. Akụkọ ọgbaghara na-adasiike ebe ahụ mana otu ihe onyonyo nke a mabeghi mgbe e sere ya amalitela ịfesa na soshal midia nke na-ebo ebubo na gọọmentị Naịjirịa kpọpụrụ ndị agbụrụ Naijirịa ndị ọzọ ma ghara ndị Igbo na Sudan.
Mana gọọmentị Naijirịa agbaala ama na ọtụtụ ihe na-echere ha aka mgba n’atụmatụ mkpọlata ndị mmadụ dịka okwu ịnata ikike n’aka ọrụ nchekwa abụọ na-alụ ọgụ, ịnata ikike n’aka mba ndị agbataobi Sudan ebe a chọrọ isi kpọpụ ndị mmadụ nakwa ihe ndị ọzọ.
Dịka ihe onyonyo a na-ewu na-efesa, gọọmentị Naijirịa zipụtara ozi na Mọnde gbaa ama na emechaala gbapee okeala Eygpt ebe ụgbọelu ndịagha elu Naijirịa nọ na-eche ibupụ ụmụafọ Naijirịa.
N’ihe onyonyo ahụ na-ewu, otu nwoke kwụụ na-ekwu:
“Anyị nọ na mahadum Khartuom ebe a na-akpọpụ ndị mmadụ, nke bụ ndị Naijirịa nọ ebe a”
“A bịala buru ndị nke ha buuru, wụsazie anyị bụ ndị Igbo.”
“Mgbe anyị banyere ụgbọala nke pụrụ nwanne ụnyịa, a sị anyị rituo... Ihe niile aghọọla ihe ndọrọndọrọ ọchịchị.”
Nwoke ahụ gara n’ihu kwuo dịka ọ nọ na-atụ aka n’ihu akpa ndị e busacha ebe ahụ na-ekwu:
“Leekwa ebe aghasara anyị, akụkọ na-ekwu na anyị apụọla bụ ụgha...”
Mana nchọpụta BBC Igbo site n’ajụjụ ọnụ n’aka ụfọdụ ndị nọ na Khartoum bụ isiobdoo Sudan ruo ụtụtụ Mọnde a gosiri na ọ bụghị naanị ndị Igbo ka nọ ebe ahụ.
Otu nwata akwụkwọ Naijirịa bi na Sudan ma na-agụ akwụkwọ na mahadum Nahda College onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo n’ụtụtụ Sọnde na ha banyere ụgbọala ga-ebupụ ha mana e mechara sị ha rituo.
O kwuru na akụkọ pụtara na nchekwa adịghị n’okporoụzọ ebe ndị ọzọ kwuru na akwụbeghi ọkwọ ụgbọala ga-ebu ha ụgwọ. O debeghi anya ihe mere e jiri sị ha pụọ.
Nwata akwụkwọ a nke bụ onye si mpaghara ugwu Naịjirịa kwuru na ụgbọala bọọsụ mechara bupụ ha ebe ahụ n’ụzụ ụtụtụ Mọnde a ma bugawa ha akụkụ Egypt.
Akụkọ a gbara ama na ọ bụghị naanị ndị Igbo na-abịga ihe nwaamadị nọ n’ihe onyonyo ahụ boro ebubo ya.
Nwaafọ Naijirịa ọzọ tọkwara na Khartoum kọchapụrụ ebubo a ma gwa BBC Igbo na Mọnde:
"Ọ bụghị naanị ndị Igbo nọ ebe a, anyị ka tọrọ ebe a dịka anyị na-anụ na ụgbọala bọọsụ ndị gọọmentị kwụrụ ụgwọ ya abịabeghị."
Onye na-anọchịte anya Naijirịa na mba Sudan bụ Safiu Olaniyan zipụtara ozi n’ụbọchị Sọnde dịka olu ya dara n’ọbaozi Nidcom ma kwuo na atụmatụ ịkpọlata ndị mmadụ adịbeghiri ha mfe ma rịọ ndị nne na nna ụmụ ha tọrọ na Sudan ka ha nwee ndịdị.
Ozi ya kọwara na ọ bụ ụlọọrụ gbata gbata Naijirịa nke National Emergency Management Agency (Nema) bụ ndị nọ n’isi ọrụ nhazị mkpọtala a ugbua.
O kwuru:
“Anyị na-agba mbọ ihazị ihe ndị na-echere anyị aka mgba bụ nke a hazịrị na Naijirịa. Ụmụakwụkwọ anyị agaghị aga n’ihu na-ebi n’okporoụzọ.”
Nke a bụ dịka akụkọ pụtaburu na ewebeghi ha banye Egypt bụ ebe a chọrọ isi bupụ ha kemgbe ụbọchị Tọọzde izu gara aga.
Olaniyan kwuru:
“Ihe unu na-agabịga bụkwa ihe anyị na-agabịga, anyị enweghị mmiri, anyị enweghi ọkụ... anyị agaghị apụ ebe ruo mgbe unu niile ruru Naijirịa n’udo”
Ihe onyonyo ahụ na-ewu na soshal midia kwukwara na ọ bụ ọtụtụ ndị Igbo ka ahapụrụ mana ọ bụ naanị nwoke ahụ na-ekwu okwu nakwa olu otu onye ọzọ sụrụ asụsụ Igbo bụ ihe dapụtara na ya bụ ihe onyonyo gosiri ihe bụ ndị Igbo.
Ụfọdụ ndị ọzọ a hụrụ na ya bụ ihe onyonyo enyighi uwe maọbụ ihe ọbụla gosiri na ha bụ ndị agbụrụ Igbo.
Ozi onyeisi ụlọọrụ Nidcom zipụtaburu na Twitter nke ewepụrụla ugbua kwubụrụ:
“A ga-ahazị usoro mbupụ ndị mmadụ site na steeti ha si.”
Mgbe BBC Igbo zigara ndị ọrụ ya ozi banyere nke a, ha zaghachịrị:
“Nke a abụghị eziokwu, ọ bụ ụmụaka nakwa ụmụnwaanyị ka a na-ebu ụzọ ebupụ ugbua. Ọ bụghị site na steeti ebe mmadụ si.”
Nke a bụ ozi ha ji kụchapụ ebubo ihe ọbụla gbasara mkpagbu agbụrụ maọbụ steeti ọbụla n’usoro mkpọlata ndị mmadụ.
Cheta na Abike wepụtara ozi n’ụbọchị Fraịde kọwa na ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ nọ na Sudan bụ 5500 ebe ụmụafọ Naijriịa nọ ebe ahụ ruru ihe dịka nde atọ. Nke a gosiri na atụmatụ ikpọlata ndị mmadụ ka ga na-aga n’ihu dịka ọ bụ ụmụaka na ụmụnwanayị ka a na-ebuụzọ akpọlata ugbua.
O dobeghi anya ugbua ma nwoke ahụ na-ekwu okwu n’ihe onyonyo ahụ ọ bụ nwata akwụkwọ ka ọ bụ onye na-azụ ahịa na mba Sudan.
Ọtụtụ n'ime anyị ka tọrọ na Sudan - Ụmụakwụkwọ Naịjirịa

N'ụbọchị Fraide izu gara aga, otu jikọtara ụmụakwụkwọ kwuburu na ihe ruru ụmụakwụkwọ Naịjirịa 1600 ka tọrọ na Khartoun bụ isi obodo mba Sudan, bụ ebe ha gara zere ndụ n’ụlọ mahadum.
“O nwebeghi ozi ọbụla si n’aka ụlọorụ gọọmentị Naịjirịa kamgbe ụnyaahụ,” ọnụ na-ekwuru otu ụmụakwụkwọ a bụ National Association of Nigerian Students ma Sudan (NANSS) gwara BBC na Fraịde.
Ọ gbakwụnyere na ụfọdụ ụmụakwụkwọ ejirila ụgbọala ruo n’okeala Ijipt, ma sị na ndị ahụ akwụsiburu n’ime ọzara eruola.
Cheta na Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisi otu jikọtara ndị Naịjirịa bi n’ofesi kwuru n’ụbọchị Tọzde na e gboola nsogbu akwụghị ụgwọ ahụ ma sị na ụfọdụ ụmụakwụkwọ Naịjirịa eruola okeala ma banye n’Ijipt.
Otu nwata akwụkwọ ọzọ gwara BBC na obi eruola ya ala dịka o ruterela Naịjirịa site n’okeala Ethiopia.
A tụburu anya ịnabata ụmụafọ Naịjirịa na Fraịdee

Ebe foto si, Nema Nigeria
Ngalaba gọọmentị Naịjirịa na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata bụ 'National Emergency Management Agency' (Nema) ekwuola na otu nke mbụ nke ụmụ Naịjirịa nọ na mba Sudan bụ ndị gọọmentị etiti gbatara ọsọ enyemaka iji zọpụta ha, ga-alọbata n'Abuja echi bụ Fraịde, ụbọchị 28 nke ọnwa Eprel 2023.
Ozi si n'akara Twitter nke Nema kwuru na ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ ndị a na-ele anya ha na Fraịde bụ mmadụ 1,600.
"Ụgbọala bus iri na atọ si obodo Khartoum nke Sudan wee buru ụmụakwụkwọ ahụ na-aga na mpaghara Aswan nke mba Egypt ugbua bụ ebe a ga-eji ụgbọelu bulata ha Naịjirịa," ozi ahụ kwuru.
"Nema na ụlọọrụ ụgbọelu Air Peace, bụ ndị wepụtara ụgbọelu ha iji bulata ụmụ Naịjirịa ndị a, na-enwe mkparịtaụka ugbua."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Nema kwuru na ọ bụ eziokwu na ọnọdụ nchekwa na mba Sudan ugbua dị oke njọ mana ha na-agba mbọ niile ha nwereike iji nyere ụmụ Naịjirịa nọ na mba ahụ aka site na njikọta aka ọnụ nke ụlọ nnọchite anya Naịjirịa na Sudan
"Anyị na ụfọdụ ụlọọrụ ụgbọala na mba Egypt enweela nkwekọrịta iburu ụmụ Naịjirịa si Khartoum ruo Aswan. Anyị na-arịọ ụmụ Naịjirịa niile ka ha nọrọ jụụ maka na ndị ọrụ na-agba mbọ ịhụ na ụmụnne anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị ga-alọta n'udo," ka akwụkwọ ozi ahụ kwuru.
Nema nyere nkọwa a dịka akụkọ putara n'ụbọchị Tọzde na ụfọdụ ụgbọala bu umu Naịjirịa si Sudan aga Egypt pụtara n'ụzọ kwụsị ma jụ na ha agaghị agakwa n'ihi na gọọmentị Naịjirịa akwụbeghị ha ụgwọ.
Ụfọdụ ndị Naịjirịa nọ n'ime ụgbọala ndị ahụ tinyere onyonyo na soshal midia ma na-akpọ oku enyemaka.
Mana onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ụmụ Naịjirịa bi na mba ofesi bị Abike Dabiri mechara kwuo na ụgbọala ndị ahụ amalitekwala njem ha dịka gọọmentị na ndị ọkwọ ụgbọala ahụ nwechara mkparịtaụka.
Gọọmentị Naịjirịa zipụtara ozi na usoro mgbapụta ụmụakwụkwọ ụmụafọ Naijirịa tọrọ na Sudan emeechala malite n'uju n'ụtụtụ Wenezde a.
Abike Dabiri bụ onyeisi ụlọọrụ ‘Nigerians in Diaspora Commission (Nidcom)’ bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ụmụafọ Naịjirịa bi na mba ndị ọzọ zipụtara ozi n'akara Twitter ya kwuo:
"Ụmụakwụkwọ anyị kwụ n'ahirị na-aba ụgbọala bọọsụ ga-abuga ha Eygpt, biko chetanụ ha n'ekpere."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

Ebe foto si, AFP
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ Naịjirịa chọburu ịmalite ngagharịiwe
Otu nwata akwụkwọ Naijirịa bi na Sudan ma na-agụ akwụkwọ na mahadum Nahda College onye na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo n’ụtụtụ Wenezde a tupu ozi Abike apụta ihe ọ sị ha na-agabịga dịka ha na-eche ka gọọmentị Naijirịa bịa gbapụta ha na Sudan ebe ọgbaghara na-ada.
O kwuru:
‘Ike agwụla anyị, anyị nọ na-eche kemgbe ụtụtụ Tuzde, ụfọdụ ụmụakwụkwụ achọọla imalite ngagharịiwe ebe a n’ihi na ha na-eche na gọọọmentị agbahapụla ha.”
Nwaamadị gara n’ihu kwuo na ụfụdọ ndị nọ ebe ahụ eribeghi nri ebe ndị ọzọ hiri ebe ahụ kemgbe abalị ruo ụtụtụ.
Cheta na nwaamadị kwuru na n’ụbọchị Tuzde a na ha natara ozi n’aka gọọmentị Naijirịa ka ha gbakọta n’otu ebe bụ ebe a sị ụgbọala bọọsụ ga-abịa buru ha pụọ mana o nwebeghị onye ha hụrụ.
Cheta na n'abalị Tuzde na Abike kwuru na e nwere ihe gbuturu nhazị ụgbọala ndị a oge:
“Lee foto na-egosi ụgbọala bọọsụ ga-ebupụ ụmụakwụkwọ Naijirịa ma bụga ha okeala Eygpt.”
“Ụgbọala bọọsụ ndị ọzọ na-abịa, anyị nweturu obere ihe cheere anyị aka mgba mana anyị na ụlọọrụ na-ahụ maka ihe ọdachị bụ Nema ahazịela ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Anyị ahụbeghi 'brake light' gọọmentị maka mkpọlata anyị
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo kwuru na Tuzde, o kwuru:
“A sị anyị pụta kemgbe elekere isii nke isi ụtụtụ n’akụkụ ọtụ ebe bụcha mahadum dị iche iche na Sudan. Ihe na-akụ ugbua bụ elekere mbụ nke ehihe mana enwebeghi onye anyị hụrụ anya ịbịa bupu anyị.”
O kwukwara na ọnọdụ ihe amalitela isiri ndị mmadụ gụnyere ụmụafọ Naijirịa nọ ebe ahụ ike nke gụnyere enweghị nri, enweghi mmiri nakwa enweghi ịnatenetị ha ga-eji agwa ndị ezịnaụlọ ha okwu.
Nwaakwụkwọ a kwuru na akụkụ ebe nke ọ nọ na-eche ka a bịa buru ha bụ n’ime mahadum African University nọ n’isiobodo Sudan bụ Khartoum.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ gara n’ihu kọwa na ebe ndị ọzọ a sị ụmụafọ Naijirịa gbakọta bụkwa n’ime mahadum Elrazi University nakwa Omdurman University nke nọ n’obodo Omdurman.
O kwukwara na gọọmentị Naijirịa agbaala mbọ na-ezitere ha ozi ugboro ugboro kemgbe ọghaghara malite ịda ebe ahụ.
Ọtụtụ ụmụafọ Naijirịa bi na Sudan ma na-agụ akwụkwọ ebe ahụ ọkachasị ndị si mpaghara ugwu Naijịrịa. A na-eche na ụmụakwụkwọ ndị Naịjriịa nọ na Sudan ugbua ruru 5,500.
Na Tuzde a, ụlọọrụ na-ahụ maka ọdịnma ndị Naijirịa nọ na mba ndị ọzọ nakwa enyemaka ndị nọ n’ihe ọdachị bipụtara akwụkwọ nke e tinyere akara ekwentị ụmụafọ Naijirịa na Sudan nwereike ịkpọ ma ha nwee nsogbu ọbụla

Ebe foto si, Reuters
Maapụ na-egosi ụzọ mgbapụta site na mba Sudan




Ihe gọọmentị Naịjirịa na-eme maka ịgbapụta ụmụafọ ha tọrọ na Sudan

Ebe foto si, Reuters
Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ịgbapụta ụmụafọ Naijirịa nọ na Sudan abụghị ihe egwuregwu dị mfe.
Ụlọọrụ ‘Nigerians in Diaspora Commission (Nidcom)’ bụ ụlọọrụ na-ahụ maka ụmụafọ Naịjirịa bi na mba ndị ọzọ kwuru nke a dịka ha nọ na-aza ajụjụ banyere mgbapụta ụmụafọ Naijirịa nke ọtụtụ na-akpọ oku maka ya ugbua.
Abike Dabiri bụ onyeisi ụlọọrụ Nidcom kwuru na mkparịtaụka ya na BBC nwere na usoro iji gbapụta ndị a adịghị mfe ma ncha.
Ka o si kwuo, gọọmentị Naijirịa ga-anata ozi nyere ikike ịme mgbapụta a n’aka ndị isi ọchị agha abụọ na-alụ ọgụ na mba ahụ ugbua tupu e mee ya bụ mgbapụta.
N'ụbọchị Tuzde, o zipụtara ozi ma kwukwa ka nne na nna ndị ụmụ ha nọ mba ahụ rịọ ụmụ ha ka ha nọrọ jụụ na Naijirịa na-agbasi mbọ ike ịgbapụta ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
Na mkparịtaụka a ya na BBC nwere na Mọnde o kwuru, ‘Anyị nwere olileanya na eche (Tuzde) na ụgbọala bọọsụ nke mbụ ga-ebu ndị mmadụ pụọ Khartoum ma gawa Cairo iji hụ na ebugara ndị a ebe nwere nchekwa ma buruzie ha n’ụgbọelu ga-akpọlata ha Naịjirịa.”
“Ụlọọrụ Naịjirịa na Sudan ewepụtala ozi etu ụmụakwụkwọ Naịjirịa nọ Sudan ga-esi nweta ohere sonye ụgbọala bọọsụ ndị a ga-ebupụ ha ebe ahụ.”
“Ihe na-egbu anyị oge ugbua bụ inweta ikike n’aka ndị ọchị agha abụọ a.”
Ọ gara n’ihu kwuo na e nwere ọtụtụ ụmụakwụkwọ Naijirịa nọ na mba ahụ ma kwuo na ha ruru puku kwuru puku.
Dabiri-Erewa kwukwara na ụlọọrụ Naijịrịa na-ahụ maka mekọ mba na mba ezigarala ndị ọchị agha abụọ ozi ka ha nye Naijirịa ohere ịkpọlata ndị mba ha nọ ebe ahụ.
Otu nwata akwụkwọ Naijirịa na-agụ akwụkwọ na mba Sudan kwuru na ọnọdụ ihe ebe ahụ dị oke egwu.
Nwaada a nke na-akpọghị aha ya kwuru nke a n’ihe onyonyo na-efeghari na soshal midia ma kwukwa na ya na ezinaụlọ ya gbapụrụ Khartoum bụ isi obodo mba ahụ ma gbaga akụkụ ọzọ n’ihe na nwanne ya nwaanyị bịara daa ahụ.
O kwuru na ụlọọgwụ ndị nọ ebe ahụ enweghị nye ya ọgwụgwụ n’ihe ọgbaghara na-ada ebe ahụ.

Nkwụsịtu agha ruo abalị abụọ
Site na nkwekọrịta ọhụrụ otu abụọ na-ebuso onwe ha agha na Sudan nwere, a ga-akwụsịtu ọgụ na-ada ebe ahụ ruo abalị abụọ malite n’ime abalị Mọnde.
Nke a ga-eme ya nke ugboro atọ a na-akwụsịtu ịlụ ọgụ ebe ahụ kemgbe ọgbaghara malitere ịda ebe ahụ n’ọnwe a.
Ọdeakwụkwọ ukwu nke mba Amerịka bụ Antony Blinken kwuru na otu ndịgha Sudan nakwa nakwa otu ‘Rapid Support Forces (RSF)’ nwere nkwekọrịta a ka e mere mkparịtaụka ruo abalị abụọ.
Ihe ruru mmadụ 400 anwụọla kemgbe ọgbaghara malite ịda n’ụbọchị 15 nke ọnwa Eprel, 2023.
Otu ndịagha abụọ a wepụtachara ozi gbara ama na ha ga-akwụsịtu ọgụ ha nwa mgbe nta.
Ọtụtụ ndị mmadụ agbagala n’akụkụ okeala mba a dịka ha na-achọ ịgbapụ ebe ahụ nke gụnyere ụmụafọ Sudan bi n’isiobodo mba ahụ ebe ya bụ ọgbaghara metụtara.

Gịnị na-akpata ọgụ na-ada na Sudan?
Ọgụ a nke malitere ịda n’ọnwa Eprel a bidoro dịka otu ndị ọrụ nchekwa abụọ malitere ibuso onwe ha agha. Nke a bụ n’ihi ndọrọndọrọ dapụtara n’etiti otu nchekwa abụọ bụ otu ndị agha Sudan na otu nchekwa Rapid Support Forces (RSF).
Ebupụla ndị mba Europe ruru 1000 ebe ahụ nke kacha bụrụ ndị France na Germany na-arụ ọrụ enyemaka na Sudan.
Ọgụ a ataala isi ihe ruru mmadụ 420 kemgbe ụbọchị 15 nke ọnwa Eprel.
N’ụbọchị Mọnde, Briten bupụrụ ndị ọrụ nnọchiteanya ha na Sudan nakwa ezinaụlọ ha mana ndị mba Briten ruru mmadụ 4000 ka tọrọ ebe ahụ dịka a na-agba mbọ ịgbapụta ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ị kwesịrị ima maka ọgbaghara na-ada na Sudan
- Dịka e mechara mweghara ọchịchị nke ndị agha mere na mba Sudan na 2021, ndị isi otu nchekwa abụọ a bịara nọrọ n’isi ọchịchị mba ahụ.
- Mmadụ abụọ a bụ ọchịagha Abdel Fattah al-Burhan nke bụ onyeisi ndịagha Sudan nakwa ọchịagha Mohamed Hamdan Dagalo nke bụ onyeisi otu nchekwa Rapid Support Forces (RSF).
- Ọ bụ esemokwu nọ n’etiti ha abụọ bụ ihe na-akpata ọgụ na-ada na Sudan.
- Ihe na-akpata esemokwu a bụ nghọtaghie dị n’etu ha abụọ siri chọọ ka usoro ọchịchị nakwa nyefe ndị nkiti ọchịchị ọzọ na mba ahụ ga-esi aga.
- Isi sekpụ ntị n’okwu a bụ atụmatụ itinye ndị otu nchekwa RSF mmadụ 100,000 ka na sonye na otu ndị agha nakwa onye ga-anọ n’isi ọchịchị ndị nchekwa na mba ahụ.
- Ọchị agha Dagolo kwuburu n’afọ 2021 na mweghara ọchịchị ahụ mere mgbe ahụ bụ ihe ndahie dịka o wepụtara onwe ya nakwa otu RSF dịka onye nọ n’azụ ndị nktiti mba ahụ.
- Agbanyeghi okwu ya, ọtụtụ nọ ebe ahụ na-enyo ya bụ okwu onye ọkachasị maka etu otu RSF siri jiri aka ike na-eso ndị mmadụ ebe ahụ n’oge gara aga.
- Ọchịagha Burhan n’aka nke ya kwuru na aga enyeghachi ndị nkiti ọchịchị naanị ma e mee ntuliaka ma họpụta onye ga-achị.
- Mana ọtụtụ na-eche na ndị ọchịagha a nakwa ndị nso nso ha na-atụ egwu ihe ga-eme ha nakwa akụnụba ha ma ndị nkiti nweta ọchịchị ọzọ ma wepụ ha n’ọkwa.










