Africa Eye: Ihe ndị Africa bi na Ukraine gabigara n'ịgba ọsọ ndụ oge Russia wakporo mba ahụ
Agha dị n'etiti mba Rọshịa na mba Yukren na-akawanye njọ, nke mere ọtụtụ ndị nkịtị ji achọ ụzọ ịzọ isi onwe ha.
Ụmụ Afrịka bi na Yukren gwara BBC na ha gabigara oke ịkpa oke agbụrụ dịka ha na-agba ọsọ ndụ.
Jessica Orakpo, nwaagbọghọ Naịjirịa na-agụ akwụkwọ na Yukren, kwuru na oge ụgbọala bịara ibupu ndị mmadụ, ha ekweghị ka ọ banye.
"Anọ m na-arịọ ha, na-arịọ ha, mana ha ekweghị. Ha sị na ọ bụ naanị ndị Ukraine ka ha ga-ebupu," Jessica kwuru.
"Ọ bụrụ na ị bụ onye isi ojii, si ebe a pụọ."

Onye Naịjirịa ọzọ aha ya bụ Awofaa Gogo-Abite, kwukwara na ụdị ihe dị otu a mekwara ya og ọ gbaruru ọsọ n'oke ala mba Yukren na mba Poland.
Awofaa Gogo-Abite bụ dọkịta ma bụrụkwa onye nkuzi; ọ nọọla na Ukraine ihe dịka afọ iri na anọ.
"Ha chụghachiri anyị bụ ndị isi ojii gaa n'azụ azụ," ka o kwuru.
"Mgbe anyị jụrụ ha, ha sị na ọ bụ naanị ụmụnwaanyị na ụmụaka ka ha na-anabata."
"Mana e nwere ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị isi ojii nọ ebe ahụ bụ ndị ha jụrụ ịnabata."
"Nnukwu oyi na-atụ, ike agwụla anyị, agụụ na-agụ anyị, mana ha achọghị ịnụ."
"Ya bụ ihe jọrọ nnukwu njọ."

Onye ntaakụkọ BBC bụ Peter Okwoche, na onye na-esere ya onyonyo bụ Ameer Ahmed kwukwara na ha chọpụtakwara ịkpa oke agbụrụ.
Ha kwuru na ekweghị ka ha banye n'ụlọnri ha chọrọ ịga rie nri.
Ụfọdụ ụmụokorobị chọkwara ịwakpo ha mana ha gosiri akwụkwọ njirimara BBC ha.
Mana otu ezinụlọ aha ha bụ Ojimadu kwuru na ọ bụ naanị agwa ọma ka ndị mmadụ kpasoro ha dịka ha gbara ọsọ ndụ banye mba Họngarị.



