Jude Ezenwafor o sepula aka n'ịzọ ọkwa? Lee ihe anyị ma

Ebe foto si, Jude Ezenwafor/Facebook
Kepukepu na-efegharị na-ekwu na Jude Ezenwafor bụ onye otu ngalaba Labour Party họpụtara ịzọ ọkwa Onyeisiala akagbuola atụmatụ ya n’ịzọ ọkwa ahụ.
O nwere akwụkwọ mgbasaozi bu akara aha Ezenwafor nke sị na ọ naghịzi azọ ọkwa onyeisiala ma rịọkwa Peter Obi mgbaghara.
BBC Igbo kpọrọ Ezenwafor n’ekwentị ugboro ugboro, ọ zara mana o kweghi ekwu ihe ọbụla banyere ịrịtu n’ọkwa.
Otu n’ime ndị otu ya gwara BBC Igbo na ọ bụghị ha zipụtere akwụkwọ ozi ahụ na-efegbarị.
Ọ gara n’ihu kwuo na o nweghi mgbe ha ji chọrọ imegide ọchịchị Peter Obi na-azọ.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ, otu di iche iche katọchara ya na ngalaba Labour Party nke họpụtara ya.
Peter Obi ka anyị ma ji ọkọlọtọ Labour Party - NLC

Ebe foto si, Nigerian Labour Congress
Otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigerian Labour Congress na Bekee ekwuola na onye ha ma ji ọkọlọtọ Labour Party azọ ọkwa bụ Peter Obi.
Nke a dị n’ozi onyeisi ha bụ Ayuba Wabba wepụtara dịka akụkọ na-ekwu na otu ngalaba pati ahụ mere ntuliaka ma họpụta onye ọzọ a kpọrọ Jude Ezenwafor.
Otu a gara n’ihu kọwaa na onyeisioche pati ahụ ha ma bụ Ọkaiwu Juliues Abure bụbu onye ndu n’otu jikọtara ndị ọrụ Bekee.
Ha gara n’ihu dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha kpachapụ anya n’ebe “Calitus Okafor bụ onye kpọrọ onwe ya onyeisioche ndị Labour Paty nọ”.
Ha gwakwara ndị otu ha ka aṅala ntị n’ihe ọbụla nwamadị a na-ekwu na ndị ọjọọ chọrọ iji ya emegharị ndị mmadụ anya.
Cheta na Labour Party bụ otu nke ndị ọrụ Bekee gụnyere Nigerian Labour Congress na Trade Union Congress hiwere n’afọ 2003.
Anyị anaghị achọ ịwụnyere Peter Obi aja na garri mana....Calistus Okafor

Ebe foto si, Screen grab
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Calistus Okafor bụ onyeisioche ngalaba Labour Party nke họpụtara Jude Ezenwafor ekwuola na ọ chọghị ịwụnyere Peter Obi aja na garrị kama na ọ bụ ikpe ziri ezi ka ọ na-achọ.
Okafor kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ n’Arise TV na nso nso a banyere esemokwu dị n’etiti pati ha.
Ọ sị na ọ gaghị n’ụlọikpe maka na a họpụtara Peter Obi, kama na ikpe ha nọ n’ụlọikpe kamgbe afọ 2017.
Ọ sị na Julius Abure ji ọkwa dịka osote odeakwụkwọ pati ahụ ebe ya bụ Calistus Okafor bụ osote onyeisioche pati ahụ nke mpaghara Ndịda.
“Iwu na-achị Labour Party kwuru na ọ bụrụ onyeisioche pati anọghị ya, na osote ya ga-anọchi anya ya, ọ bụrụ na na osote anọghị ya na ndị otu n’ime ndị osote onyeisioche na mpaghara isii enwere anọchiteya.
“O nweghi etu Julius Abure bụ osote odeakwụkwọ pati ga-esi si n’azụ bịa bụrụ onyeisioche”.
Okafor sị na Peter Obi akpọbeghi ya kamgbe ahụ na ọ bụrụ na ọ chọrọ ịkpọ ya oku na ohere dịrị ya.
Ọ kwuru na ọ bụrụ na Obi na ndị otu ya chọrọ ka ha nwee mkparịtaụka, na ọ ga-anabata ha kama na ihe ọ chọrọ bụ ikpe ziri ezi.
Ihe ndị otu Ezenwafor kwuru?
BBC Igbo kpọtụụrụ onye otu n'ime ndị ọrụ Jude Ezenwafor na-achọghị ka a kpọọ aha ya.
Ọ sị na o nweghi mgbe Ezenwafọr ji chọrọ ịkpa nkata megide nwanne ya nwoke bụ Peter Obi dịka ụfọdụ ndị ntaakụkọ si kwuo ya.
Kama na ihe niile a na-eme bụ iji mechie ebe niile nsogbu nwereike isi dapụtara Obi n'ọdịnihu.
Ọ gara n'ihu kwuo na akwụkwọ ahụ na-efegharị nke na-ekwu Ezenwafor anaghịzi azọ ọkwa esighi n'aka ha.
End of Akụkọ ndị ọzọ banyere Peter Obi na Labour Party
Onye ga-eji ọkọlọtọ Labour Party azọ ọkwa Onyeisiala?

Ebe foto si, Obi and Ezenwafor/Facebook
Ọ dị ka a ga-asị na nsogbu dị n’etiti ndị Labour Party ọ na-akawanye njọ kwa ụbọchị.
Otu ngalaba pati ahụ họpụtara Jude Ezenwafor dịka onye ga-eji ọkọlọta ha azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa.
Nke a na-abịa dịka ngalaba Labour Party nke Calistus Okafor bụ onyeisi ha mere ntuliaka ime ụlọ n’Abuja na Wenezde.
N’ọnwa Mee afọ 2022, ka pati Labour họpụtara Peter Obi dịka onye ga-eji ọkọlọtọ ha azọ otu ọkwa Onyeisiala site na ntuliaka ime ụlọ ha mere n’Asaba Delta Steetị.
Akụkọ kwuru na Ezenwafor rụụrụ Peter Obi ọrụ dịka onyeisi nchịkọta usoro a kpọrọ ‘chief protocol’ mgbe ọ chịrị Anambra Steetị.
Ezenwafor bụbu onye ndụmọdụ Willie Obiano chiburu Anambra n’okwu banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Obi bụ onye ji ọkọlọtọ ngalaba Labour Party nke Julius Abure nọ n'isi bụkwa nke ụlọọrụ Inec ma.
Onye bụ Jude Ezenwafor?
- Ọ bụ nwafọr Anambra Steetị
- Ọ gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị na St. Dominic Savio Seminary dị n’Akpu
- Gụọ mahadum na Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n’Awka, Anambra Steetị
- Ezenwafor rụụrụ Peter Obi ọrụ dịka onyeisi nchịkọta usoro a kpọrọ ‘chief protocol’ mgbe ọ chịrị Anambra Steetị.
- Ọ rụkwara ọrụ dịka onye ndụmọdụ Willie Obiano chiburu Anambra n’okwu banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị
Kedụ ihe ngalaba Peter Obi kwuru?

Ebe foto si, Pat Utomi
Pat Utomi bụ onye ndu na Labour Party nke nyere Peter Obi ohere gwara BBC Igbo na agwa a Calistus Okafor na ndị otu ya na-akpa enweghi isi.
Ọ sị na mgbe e mere ntuliaka ime ụlọ họpụtara Obi, na ndị ọrụ Inec nọ ebe ahụ ịhụ ka ihe si gaa nke pụtara na ha kwadoro nhọpụta Obi.
Ọ gara n’ihu kwuo na ihe a bụ otu n’ime agwa ọjọọ ndị jupụtara n’otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.
"Ọ dịkwa ka o nwere onye na-akwa ndị a ka ha tinyere anyị na Obi aja na garrị".
BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ngalaba Labour Party nke Jude so na ya.
Kedụ etu nsogbu si malite na Labour Party?

Ebe foto si, Peter Obi and Ezenwafor/Facebook
Pat Utomi gara n'ihu kọwaa etu esemokwu si bata na Labour Party nke butere nkewa a.
Ọ sị na ọ mgbe onye bụbu onyeisioche pati ahụ nwụrụ, na a malitere ịchọ onye ga-anọchi ya.
Ọ kwuru na a sị ka Julius Abure jiri ọkwa ahụ ruo mgbe a ga-eme ntuliaka ịhọpụta onye ọzọ mana Calistus na ndị otu ya jụrụ ajụ.
Nke ahụ butere nsogbu n'otu ha mana ụlọikpe nyere iwu kwadoro ọchịchọ Julius Abure.
Utomi sị kamgbe ahụ na Nwafor na ndị otu ya anaghị abịa ọgbakọ ndị Labour Party na-eme.
"Ọ bụ n'izuụka abụọ gara aga ka Nwafor sepụtara isi sị na ha na-eme ntuliaka ime ụlọ nke ha.









