Uma Ukpai: Ndị mmadụ ka na-eru uju ọnwụ ya n'Asaga, Ohafia

Uma Ukpai
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ndị obodo Asaga dị n'Ọhafịa n'Abịa steeti, bụ ebe a mụrụ onye oziọma a ma ama bụ Uma Ukpai ka na-eru uju ọnwụ ya.

Mgbe BBC Igbo gara njem ebe ahụ, ha chọpụtara na o nweghị onye bi n'ụlọ Uma Ukpai n'ime obodo Asaga, kama obere nwantakịrị nabtara anyị.

Ndị agbataobi ya anyị hụrụ ekweghị ekwu okwu n'ihu oyoonyo, kama ha kọwara na ọnwụ nwanne ha nwoke bụ ihe ezigbo nwute nyere ha.

Ụlọakwụkwọ mahadum Umu Ukpai nọ n'ime obodo ya na Asaga, Ohafia
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwọ mahadum Umu Ukpai nọ n'ime obodo ya na Asaga, Ohafia

Ha gara n'ihu kwuo na onye ụkọchụkwụ Uma Ukpai biri ndụ ziri ezi na nke jupụtara na i nyere ndị mmadụ aka.

Ha gosiri BBC Igbo ụfọdụ ọrụ ọma onye oziọma Ukpai rụrụ tupu ọ nwụọ, nke gụnyere ụlọakwụkwọ nkanụzụ.

Ọ rụkwara ụlọọgwụ na ọbaozu, iji kewapụtara ndị obodo ya ohere ọrụ.

ọnụụzọ ụlọ Umu Ukpai nọ na Asaga
Nkọwa foto, ọnụụzọ ụlọ Umu Ukpai nọ na Asaga

Uma Ukpai: Tinubu, Obi, Otti, Ikpeazu na ndị ọzọ eruola uju maka ọnwụ onye oziọma

Ndị na-eruju banyere ọnwụ ya ugbua gụnyere Onyeisiala Bola Tinubu, onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 n'otu Labour pati bụ Peter Obi, aka na-achị Abịa Steeti bụ Alex Oti na aka chịburu steeti ahụ bụ Okezie Ikpeazu na ndị ọzọ.

Ebe foto si, Bayo Onanuga/ Peter Obi/Okezie Ikpeazu/ Alex Otti/ X

Ọtụtụ ndị a ma ama na mba Naịjirịa akwaala akwa arịrị maka ọnwụ onye oziọma a ma ama bụ Uma Ukpai ndị ezinụlọ ya wepụtara ozi banyere ọnwụ ya n'ụbọchị Mọnde 13 Ọktoba 2025.

Ndị na-eruju banyere ọnwụ ya ugbua gụnyere Onyeisiala Bola Tinubu, onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 n'otu Labour pati bụ Peter Obi, aka na-achị Abịa Steeti bụ Alex Otti na aka chịburu steeti ahụ bụ Okezie Ikpeazu na ọtụtụ ndị ọzọ.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'ozi iti aka n'obi nke onye enyemaka ya pụrụiche bụ Bayo Onanuga wepụtara n'akara soshal midịa ya, Onyeisiala Tinubu kọwaara ya dịka "otu n'ime ndị ọchịagha Chineke" onye ọrụ ndụ ya gosipụtara okwukwe, ịhụnanya, na ọzụzụ nrube isi.

O kwuru na Uma Ukpai rụrụ ọtụtụ ọrụ a ma ama banyere uto nke okwukwe Ndị Kraịst na mmegharị mgbanwe na mpaghara Afrịka n'afọ ndị 1980.

"N'ime oge ije ozi ya dị afọ iri isii, Ukpai bịara bụrụ onye a ma ama maka mgbasa ozi ya dị ọkụ, nkụzi mgbanwe, na nraranye n'ịkwanye ma ndị ụkọchukwu na ndị isi nkịtị", ka o kwuru.

Mana onye zọrọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 n'otu Labour pati bụ Peter Obi kwuru na Uma Ukpai tinyere ndụ ya n'ikwusa oziọma, ịgwọ ọrịa, na ịkwalite mkpụrụ obi n'ofe Naịjirịa na n'ofe ndị ọzọ.

Dịka o si kwuo, Ukpai sitere n'otu ya bụ Uma Ukpai Evangelistic Association, hazie nnukwu ọgbakọ oziọma, ọrụ ọgwụgwọ, na ọgbakọ ndị isi nke wetara olileanya na mgbanwe n'ime ndụ na-enweghị atụ.

Aka na-achi Abịa steeti bụ Gọvanọ Alex Otti kwupụtara nwute maka ọnwụ onye ya ma kwuo na mmekọrịta ya na Uma Ukpai dịka nke nwa na nna.

O kwuru na ọnwụ ya bụ nke ga-emetụta ndị okpukperechi Chineke, ndị Abịa steeti nakwa gburugburu Naịjirịa.

N'aka nke ọzọ, Okezie Ikpeazu kwuru na Ukpai bụ otu n'ime onyinye kachasị ukwuu nke Abịa nyere otu Ndị Kraịst na mmadụ, ma bụrụkwa nwoke ndụ ya gosipụtara nzube Chineke na nraranye zuru oke n'ọrụ Chineke.

"O kwenyesiri ike n'ọdị mma, udo na nke na ọgan'ihu nke Abịa ma na-echetara m mgbe niile ka m jiri ọmịiko, ịdị umeala n'obi na egwu Chineke chịa ọchịchị," ka o kwuru.

Onye bụ Uma Ukpai lara mmụọ ka ọ gbachara afo 80?

Ụkọchukwu Uma Ukpai

Ebe foto si, Umai Ukpai/Facebook

Akụkọ na-eru anyi ntị na-ekwu na onye ụkọchukwu ma bụrụkwa onye oziọma a ma ama na Naịjirịa bụ Uma Ukpai alaala mmụọ ka ọ gbachara afọ 80.

Ozi nke ezinaụlo ya wepụtara n'ụbọchị Mọnde kwuru na nnukwu ụkọchukwu ahụ nwụrụ na Legọs na nso nso a.

Ozi ahụ sị,"Onye ozioma Naijiria nakwa ndu ụka Kraisti aalala mụọ n'afọ 80."

Ezinaụlọ ya kowara ya dịka 'Ife nakwa ihe mkpalite mmụọ ọtụtụ ndị mmadụ.

Ihe ndị ị maghị maka Uma Ukpai

Uma Ụkpai

Ebe foto si, Uma Ukpai/Facebook

Onye Asaga dị n'Ohafia, Abia Steeti, a murụ Uma Ukpai n'abalị asaa nke ọnwa Jenụwarị afọ 1945.

Ọ bụ ya hiwere otu mgbasa oziọma a kpọrọ, 'Uma Ukpai Evangelistic Association (UUEA), bụ nke isiụlọọrụ ha dị n' Uyo, Akwa Ibom Steeti.

Ọ nọ n'isi na nhibere otu jikọro ndị ụka Kraisti agba ọhụrụ a kpọrọ "Pentecostal Fellowship of Nigeria', PFN bụ nke bụ mkpụrụ ọgbakọ oziọma o hiwere na Legọs n'afọ 1985 mịtara.

Ebe ndị ọzọ o hiwerela ọgbakọ ozioọma nke kpọtụrụ akpọtụ ma dọta igwe ndị mmadụ gụnyere; Ibadan n'afọ1982(Greater Ibadan for Christ) , Nsuka n'afọ 2012 wgz.

E wezuga ịdọtara Kraistị mkpuruobi, nke ọ na-eme site na ọgbakọ oziọma dị iche iche o merela, Ukpai bụ onye nleta ahụike ndị mmadụ na-aụ ọkụ n'obi.

Ọ bụ onyeicioche Uma Ukpai Eye Centre, nakwa ụlọgwụ 'King of Kings Hospital, dị N'Abia steeti

Ọ bụ ya hiwere ụlọakwụkwọ Uma Ukpai Polytechnic Asaga.

Ukpai bụkwa onye nwe Uma Ukpai School of Theology and Biblical Studies, dị n'Uyo,Akwaa-Ibom Steeti.

Onye ọrụ ebere, Ụkpai nwere ụlọọrụ o ji enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka 'Uma Ukpai Scholarship Foundation bụ nke o ji enye ohere agụmakwụkwọ n'efu.

Govanọ Alex Otti edurula ndị Abia steeti ị sọpụrụ Uma Ukpai

Gọvanọ Alex Otti

Ebe foto si, Alex Otti/X

Nkọwa foto, Gọvanọ Alex Otti

Aka na-achi Abia steeti bụ Gọvanọ Alex Otti ekwuola nwute ya na ọnwụ onye ụkọchukwu a ma ama na Naịjirịa bụ Uma Ukpai.

Otti kọwara na mmekọrịta ya na Uma Ukpai dịka nke nwa na nna ma kwụọ na ọnwụ ya bụ nke ga-emetụta ndị okpukperechi Chineke, Abia steeti nakwa gburu gburu Naịjirịa.

O kwuru na Uma Ukpai bụ onye ji obi ya niile rụọla Chineke ọrụ nakwa gwọ ọtụtụ ndị mmadụ ọrịa nke mere ndị mmadụ ji nabata okwu Chineke na ndụ ha.

Otti si na ọ bụ ihe nwute na Uma Ukpai nwụrụ oge ndị mmadụ na-enwe obi ụtọ na ọrụ ya.

O zigara ezinụlọ Uma Ukpai ozi itinye aka na obi ma gwa ndị mmadụ ka ha sooro nzọmụkwụ ya dịka ndụ ya ga-abụ ihe mmụta nyere ndị dị ndụ.