Mmadụ atọ anwụọla n'ala ọma jijiji ọzọ mere na Turkey n'ụbọchị Mọnde

Ebe foto si, EPA
Mmadụ atọ ka a ma nwụrụla ugbua dịka ala ọma jijiji abụọ ọzọ mere na mba Turkey n'abalị ụbọchị Mọnde.
Ala ọma jijiji abụọ ndị a dị 6.4 nakwa 5.8 magnitude dịka etu e si agbakọ ala ọma jijiji, ụfọdụ ụlọ dara ada ma dagide ụfọdụ mmadụ, mana ndị ọrụ gbatagbata ebidola ọrụ ugbua ịzọpụta ha.
Ala ọma jijiji a metụtakwara ụfọdụ mpaghara mba Syria, Egypt na Lebanon.
Ala ọmajiji ọzọ emeela na Turkey

Ebe foto si, Reuters
Ala ọmajiji ọzọ emeela na Ndịda Anyanwụ Turkey, izụụka abụọ ala ọma jiji kpara mkpamkpa na mba ahụ.
Ụlọọrụ gbata gbata mba Tụkey kwuru na ya bụ ihe mere n'Elekere asatọ nke abalị ha nke bụ elekere isii nke mgbe na Naijiria.
Ndị nọ ebe ihe mere gwara ụlọntakụkọ Reuters na ala ọmajijia ahụ mebiri ụlọ dị na Antakya.
Ala ọmajiji mebiri na mpaghara ahụ n'abalị 6 nke ọnwa Febụwarị, afọ, gbuo ihe karịrị mmadụ 44,000 na Turkey na Syria.
Osote Onyeisiala mba Turkey kwuru na o pekata mpe mmadụ asatọ merụụ ahụ n'ala ọmajiji a.
Ụfọdụ kwuru na ya bụ ala ọmajiji metụtara Syria, Egypt na Lebanon.
O dobeghị anya ka ihe mebiri maọbụ ndị ọ metụtụtara ha.









